Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 112:1-10

112  Toonụ Jaa!+ א [Alef]Obi ụtọ na-adịrị onye na-atụ egwu Jehova,+ ב [Bet]Bụ́ onye ihe o nyere n’iwu+ na-atọ ụtọ nke ukwuu.+ ג [Gimel]   Ụmụ ya ga-aghọ ndị ukwu n’ụwa.+ ד [Dalet]A ga-agọzikwa ọgbọ nke ndị ziri ezi.+ ה [Hee]   Ihe ndị dị oké ọnụ ahịa nakwa akụnụba dị n’ụlọ ya;+ ו [Wọọ]Ezi omume ya na-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+ ז [Zayin]   O nwuworo ndị ziri ezi dị ka ìhè n’ime ọchịchịrị.+ ח [Het]Ọ na-eme amara, na-emekwa ebere, bụrụkwa onye ezi omume.+ ט [Tet]   Onye na-eme amara,+ nke na-agbazinyekwa mmadụ ihe,+ bụ ezigbo mmadụ. י [Yod]Ọ na-eji ikpe ziri ezi eme ihe ndị ọ na-eme.+ כ [Kaf]   Ọ dịghị mgbe a ga-eme ka ọ maa jijiji.+ ל [Lamed]A ga na-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.+ מ [Mem]   Ọ gaghị atụ akụkọ ọjọọ egwu.+ נ [Nun]Obi ya kwụ chịm,+ daberekwa na Jehova.+ ס [Samek]   Obi ya adịghị ama jijiji;+ ọ gaghị atụ egwu,+ ע [Ayin]Ruo mgbe ọ ga na-ele ndị iro ya anya, na-achị ha ọchị.+ פ [Pee]   O kesawo ihe n’ụba; o nyewo ndị ogbenye ihe.+ צ [Sadee]Ezi omume ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.+ ק [Kof]A ga-eme ka mpi ya dị elu ma nwee nsọpụrụ.+ ר [Resh] 10  Onye ajọ omume ga-ahụ ya wee iwe.+ ש [Shin]Ọ ga-ata ikikere ezé wee pụọ n’anya.+ ת [Tọọ]Ihe na-agụ ndị ajọ omume ga-ala n’iyi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji