Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 110:1-7

Abụ ọma Devid. Abụ olu ụtọ. 110  Ihe Jehova gwara Onyenwe m bụ:+ “Nọdụ ala n’aka nri m+ Ruo mgbe m debere ndị iro gị ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ gị.”+   Jehova ga-esi na Zayọn+ zipụ mkpanaka+ nke ike gị, sị: “Gaa na-enwe mmeri n’etiti ndị iro gị.”+   Ndị gị+ ga-eji obi ha wepụta onwe ha+ n’ụbọchị i du ndị agha gị na-eje agha.+ N’ịma mma nke ịdị nsọ gị,+ i nwere ìgwè ụmụ okorobịa gị Ndị si n’afọ nke ụtụtụ dị nnọọ ka igirigi.+   Jehova aṅụwo iyi+ (ọ gaghịkwa akwa ụta):+ “Ị bụ onye nchụàjà Dị ka Melkizedek+ ruo mgbe ebighị ebi!”+   Jehova ga-anọ n’aka nri gị+ Kụọ ndị eze righirighi n’ụbọchị iwe ya.+   Ọ ga-eme ihe e kpere n’ikpe n’etiti mba dị iche iche;+ Ọ ga-eme ka ozu jupụta ebe niile.+ Ọ ga-akụri onyeisi nke na-achị ala nwere ụba mmadụ.+   Ọ ga-aṅụ mmiri n’iyi ndagwurugwu nke dị n’ụzọ.+ Ọ bụ ya mere ọ ga-eji welie isi ya elu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji