Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 108:1-13

Abụ. Abụ olu ụtọ Devid. 108  Obi m kwụ chịm, Chineke.+ M ga-abụ abụ, meekwa ka ọ bụrụ abụ olu ụtọ,+ Ọbụna ùgwù m ga-abụ abụ.+   Ụbọ akwara, teta; tetakwa, gị une.+ M ga-akpọte chi ọbụbọ.+   Jehova, m ga-eto gị n’etiti ndị dị iche iche;+ M ga-abụkukwa gị abụ olu ụtọ n’etiti mba dị iche iche.+   N’ihi na obiọma* gị dị ukwuu ruo n’eluigwe,+ Eziokwu gị dịkwa ukwuu ruo na mbara igwe.+   Chineke, ka e bulie gị ka ị dị elu karịa eluigwe;+ Ka ebube gị dị elu karịa ụwa dum.+   Ka e wee napụta ndị ị hụrụ n’anya,+ Biko, jiri aka nri gị zọpụta m ma za m.+   Chineke ekwuwo okwu n’ịdị nsọ ya, sị:+ “M ga-aṅụrị ọṅụ, m ga-enyefe Shikem+ ka ọ bụrụ ihe nketa;+ M ga-atụkwa ndagwurugwu Sọkọt+ atụ̀ wee nye ya ndị ọzọ.   Ọ bụ m nwe Gilied;+ ọ bụkwa m nwe Manase;+ Ifrem bụkwa ebe e wusiri ike nke onye m mere onyeisi;+ Juda bụ mkpara nke onye m mere onye na-achị achị.+   Moab+ bụ ite m ji asa ihe.+ M ga-atụba akpụkpọ ụkwụ m+ n’Idọm.+ M ga-eti mkpu mmeri+ n’isi Filistia.”+ 10  Ònye ga-akpọga m n’obodo ahụ e wusiri ike?+ Ònye ga-eduru m ruo Idọm?+ 11  Ọ́ bụghị gị, Chineke, bụ́ onye jụrụ anyị,+ Onye na-adịghịkwa eso ndị agha anyị eje agha dị ka Chineke?+ 12  Nyere anyị aka ka anyị pụta n’ahụhụ,+ N’ihi na nzọpụta nke si n’aka mmadụ abaghị uru.+ 13  Anyị ga-enweta ike site n’enyemaka Chineke,+ Ya onwe ya ga-azọdakwa ndị na-emegide anyị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 108:4*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”