Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 106:1-48

106  Toonụ Jaa!+ Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma;+ N’ihi na obiọma* ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+   Ònye pụrụ ịkọ oké ọrụ dị iche iche Jehova na-arụ,+ Ma ọ bụ mee ka a nụ otuto ya dum?+   Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme ihe ziri ezi,+ Ndị na-eme ezi omume mgbe niile.+   Jehova, biko, cheta m meere m amara ị na-emere ndị gị.+ Lekọta m, zọpụtakwa m,+   Ka m wee hụ ịdị mma gị n’ebe ndị ị họọrọ nọ,+ Ka m wee soro mba gị ṅụrịa ọṅụ,+ Ka m wee jiri ihe nketa gị nyaa isi.+   Anyị emehiewo dị nnọọ ka nna nna anyị hà mehiere;+ Anyị emewo ihe ọjọọ; anyị emewo ajọ omume.+   Mgbe nna nna anyị hà nọ n’Ijipt, Ha aghọtaghị ọrụ gị ndị dị ebube ma ọlị.+ Ha echetaghị oké obiọma gị dị ukwuu,+ Kama ha nupụrụ isi n’oké osimiri, n’akụkụ Oké Osimiri Uhie.+   O wee zọpụta ha n’ihi aha ya,+ Ka o wee mee ka a mara ịdị ike ya.+   O wee baara Oké Osimiri Uhie mba, o wee takọọ;+ O wee mee ka ha jiri ụkwụ si n’etiti ogbu mmiri ahụ gafere dị ka à ga-asị na ọ bụ ala ịkpa;+ 10  O wee zọpụta ha n’aka onye kpọrọ ha asị,+ Gbapụtakwa ha n’aka onye iro.+ 11  Mmiri wee kpuchie ndị na-emegide ha;+ Ọ dịghị otu n’ime ha fọdụrụ.+ 12  Ha wee nwee okwukwe n’okwu ya;+ Ha malitere iji abụ na-eto ya.+ 13  Ha chefuru ọrụ ya ngwa ngwa;+ Ha echereghị ndụmọdụ ya.+ 14  Kama ha nwere akpịrị ogologo n’ala ịkpa,+ Wee lee Chineke ule n’ọzara.+ 15  O wee nye ha ihe ha rịọrọ+ Wee mee ka mkpụrụ obi ha malite ịrịa ọrịa nke na-ata mmadụ ahụ́.+ 16  Ha wee malite inwere Mozis anyaụfụ n’ebe ha mara ụlọikwuu,+ Ha nwekwaara Erọn bụ́ onye nsọ Jehova anyaụfụ.+ 17  Ala wee meghee loda Detan,+ Wee kpuchie ndị òtù Abaịram.+ 18  Ọkụ wee na-ere n’etiti nzukọ ha;+ Ọkụ wee repịa ndị ajọ omume.+ 19  Ha kpụkwara nwa ehi na Horeb,+ Kpọkwaara ihe oyiyi a wụrụ awụ isiala,+ 20  Ha wee jiri ihe yiri oké ehi,+ Bụ́ anụ na-ata ahịhịa, gbanwere ebube m.+ 21  Ha chefuru Chineke bụ́ Onye Nzọpụta ha,+ Onye mere oké ihe dị iche iche n’Ijipt,+ 22  Bụ́ ọrụ dị ebube ndị a rụrụ n’ala Ham,+ Meekwa ihe ndị dị egwu n’Oké Osimiri Uhie.+ 23  Ọ gaara enye iwu ka a laa ha n’iyi,+ Ma a sị na ọ bụghị Mozis bụ́ onye ọ họọrọ, Onye guzoro n’ihu ya n’agbata ha na ya,+ Iji mee ka ọnụma ya dajụọ ka o wee ghara ibibi ha.+ 24  Ha wee leda ala ahụ mara mma anya;+ Ha enweghị okwukwe n’okwu ya.+ 25  Ha wee na-atamu ntamu n’ụlọikwuu ha;+ Ha egeghị ntị n’olu Jehova.+ 26  O wee welie aka ya ṅụọ iyi banyere ha,+ Na ya ga-eme ka ha nwụọ n’ala ịkpa,+ 27  Nakwa na ya ga-eme ka ụmụ ha nwụọ n’etiti mba dị iche iche,+ Nakwa na ya ga-achụsasị ha n’ala dị iche iche.+ 28  Ha wee malite ịrapara n’ahụ́ Bel nke Piọ,+ Na-erikwa àjà a na-achụrụ ihe ndị na-adịghị ndụ.+ 29  Ka ha nọ na-akpasu Chineke iwe site n’omume ha,+ Ihe otiti bịakwasịrị ha.+ 30  Mgbe Finihas biliri mee ihe,+ Ihe otiti ahụ kwụsịrị. 31  E wee gụọrọ ya ihe ahụ o mere dị ka ezi omume, Site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ruo mgbe ebighị ebi.+ 32  Ha kpasukwara ya iwe na mmiri Meriba,+ Nke mere Mozis ji baa ná nsogbu n’ihi ha.+ 33  N’ihi na ha mere ihe wutere ya na mmụọ, O wee jiri egbugbere ọnụ ya kwuo okwu n’echeghị echiche.+ 34  Ha alaghị ndị dị iche iche n’iyi,+ Dị ka Jehova gwara ha.+ 35  Ha na ndị mba ọzọ wee na-emekọ ihe,+ Ha wee mụta ihe ha na-eme.+ 36  Ha nọkwa na-efe arụsị ha,+ Arụsị ndị ahụ ewee ghọọrọ ha ọnyà.+ 37  Ha jikwa ụmụ ha ndị ikom+ Na ụmụ ha ndị inyom na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà.+ 38  Ha wee na-awụfu ọbara na-emeghị ihe ọjọọ,+ Bụ́ ọbara ụmụ ha ndị ikom na ọbara ụmụ ha ndị inyom, Ndị ha chụụrụ arụsị dị iche iche nke Kenan n’àjà;+ E wee jiri ịwụfu ọbara merụọ ala ahụ.+ 39  Ọrụ ha wee mee ka ha ghọọ ndị na-adịghị ọcha,+ Ha nọkwa na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ site n’ihe ha na-eme.+ 40  Jehova wee weso ndị ya iwe dị ọkụ,+ O wee kpọ ihe nketa ya asị.+ 41  O wee nyefee ha ugboro ugboro n’aka ndị mba ọzọ,+ Ka ndị kpọrọ ha asị chịa ha,+ 42  Ka ndị iro ha megbuokwa ha, Ka ha nọrọkwa n’okpuru ndị iro ha.+ 43  Ọ napụtara ha ọtụtụ ugboro,+ Ma ha onwe ha nupụrụ isi n’ihi isi ike ha,+ E wedara ha n’ala n’ihi njehie ha.+ 44  Ọ na-ahụkwa ahụhụ ha na-ata+ Mgbe ọ nụrụ ákwá ha na-ebesara ya.+ 45  N’ihi ha, ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya,+ Ọ na-agbanwe obi ya dị ka oké obiọma ya si dị ukwuu.+ 46  Ọ na-emekwa ka ha bụrụ ndị e kwesịrị imere ebere N’anya ndị niile dọọrọ ha n’agha.+ 47  Jehova Chineke anyị, biko, zọpụta anyị,+ Sikwa ná mba dị iche iche chịkọta anyị,+ Ka anyị wee nye aha nsọ gị ekele,+ Jirikwa ọṅụ too gị.+ 48  Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi+ Malite na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi; Mmadụ niile ga-asịkwa Amen.+ Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọma 106:1*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”