Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 105:1-45

105  Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha ya,+ Meenụ ka a mara ọrụ ya n’etiti ndị dị iche iche.+   Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ olu ụtọ,+ Chebaranụ ọrụ ya niile dị ebube echiche.+   Jirinụ aha nsọ ya na-anya isi.+ Ka obi ndị na-achọ Jehova ṅụrịa ọṅụ.+   Chọọnụ Jehova na ike ya.+ Na-achọnụ ihu ya mgbe niile.+   Chetanụ ọrụ dị ebube ndị ọ rụrụ,+ Bụ́ ọrụ ebube ya nakwa mkpebi ikpe ndị o ji ọnụ ya kwupụta,+   Unu mkpụrụ Ebreham bụ́ ohu ya,+ Unu ụmụ Jekọb, bụ́ ndị ọ họọrọ.+   Ọ bụ ya bụ Jehova Chineke anyị.+ Mkpebi ikpe ya dị n’ụwa dum.+   O chetawo ọgbụgba ndụ ya ọbụna ruo mgbe a na-akaghị aka,+ O chetawokwa ihe o nyere n’iwu, ruo otu puku ọgbọ,+   Bụ́ ọgbụgba ndụ ya na Ebreham,+ Nakwa iyi ọ ṅụụrụ Aịzik,+ 10  Bụ́ nke o mere ka ọ dịgide dị ka ụkpụrụ nye Jekọb, Ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ga-adịru mgbe a na-akaghị aka nye Izrel,+ 11  Sị: “Ọ bụ gị ka m ga-enye ala Kenan+ Ka ọ bụrụ òkè e kenyere unu dị ka ihe nketa.”+ 12  Nke a bụ mgbe ha dị ole na ole,+ Ee, ha dị nnọọ ole na ole, bụrụkwa ndị mbịarambịa na ya.+ 13  Ha wee na-aga site ná mba ruo ná mba,+ Site n’otu alaeze gakwuru ndị obodo ọzọ.+ 14  O kweghị ka mmadụ ọ bụla rigbuo ha,+ Kama ọ baara ndị eze mba n’ihi ha,+ 15  Sị: “Unu akpala ndị m tere mmanụ aka,+ Unu emekwala ndị amụma m ihe ọjọọ ọ bụla.”+ 16  O wee kwuo ka ụnwụ daa n’ala ahụ;+ Ọ gbajiri mkpara niile e ji ekonye achịcha.+ 17  O zipụrụ otu nwoke ka o buru ha ụzọ gawa, Ya bụ, Josef, onye e rere ka ọ bụrụ ohu.+ 18  Ha tụrụ ya ịgà n’ụkwụ,+ Keekwa mkpụrụ obi ya agbụ ígwè;+ 19  Ruo mgbe okwu Chineke mezuru,+ Okwu Jehova nụchara ya.+ 20  Eze ziri ozi ka a tọhapụ ya,+ Onye na-achị ndị dị iche iche ziri ozi ka a tọhapụ ya. 21  O mere ya nna ukwu nke ezinụlọ ya,+ Na onye na-achị ihe niile o nwere,+ 22  Ka o kee ndị o mere ndị isi agbụ, bụ́ ndị ọ masịrị mkpụrụ obi ya ike agbụ,+ Ka ọ kụziekwara ọbụna ndị agadi ya amamihe.+ 23  Izrel wee bata n’Ijipt,+ Jekọb wee biri dị ka ọbịa n’ala Ham.+ 24  O wee mee ka ndị ya mụọ ọmụmụ nke ukwuu,+ O wee mee ka ha dị ike karịa ndị iro ha.+ 25  O kwere ka obi ha gbanwee, ha wee kpọ ndị ya asị,+ Ka ha jiri aghụghọ meso ndị ohu ya ihe.+ 26  O zigara Mozis bụ́ ohu ya,+ Zigakwa Erọn bụ́ onye ọ họọrọ.+ 27  Ha mere ka ha hụ ihe ịrịba ama ya,+ Rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche n’ala Ham.+ 28  O zipụrụ ọchịchịrị wee mee ka ebe niile gbaa ọchịchịrị;+ Ha enupụghịkwa isi n’okwu ya.+ 29  O mere ka mmiri ha ghọọ ọbara,+ O wee gbuo azụ̀ ha.+ 30  Ala ha jupụtara na mbàrá,+ N’ime ime ụlọ nke ndị eze ha. 31  O kwuru ka odudu bata,+ Kwuokwa ka anwụnta bata n’ókèala ha niile.+ 32  Kama mmiri ozuzo, o mere ka akụ́ mmiri ígwé+ Na ọkụ na-ere ere zoo n’ala ha.+ 33  O wee tie osisi vaịn ha na osisi fig ha ihe otiti, Gbajisịakwa osisi ndị dị n’ókèala ha.+ 34  O kwuru ka igurube bata,+ Nakwa ụmụ igurube a na-apụghị ịgụta ọnụ.+ 35  Ha wee richapụ ahịhịa ndụ niile dị n’ala ha;+ Ha richapụkwara mkpụrụ niile nke ala ha. 36  O wee gbuo ihe ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala ha,+ Mmalite nke ike ịmụ ọmụmụ ha.+ 37  O wee mee ka ha jiri ọlaọcha na ọlaedo pụta;+ Ọ dịghịkwa onye ụkwụ mara jijiji n’ebo ya niile. 38  Ijipt ṅụrịrị ọṅụ mgbe ha pụrụ, N’ihi na ụjọ ha ejidewo ha.+ 39  Ọ gbasapụrụ ígwé ojii ka o kpuchie ha,+ Nyekwa ha ọkụ ka ọ na-enye ha ìhè n’abalị.+ 40  Ha rịọrọ ya, o wee wetara ha nnụnụ kwel,+ O jikwa achịcha nke si n’eluigwe nyejuo ha afọ.+ 41  O meghere oké nkume, mmiri wee malite ịgbapụta;+ Mmiri a ghọrọ osimiri wee sọfere ógbè mmiri na-adịghị.+ 42  N’ihi na o chetara okwu ya dị nsọ nke ọ gwara Ebreham bụ́ ohu ya.+ 43  O wee mee ka ndị ya jiri ọṅụ pụta,+ Meekwa ka ndị ọ họọrọ tiri mkpu ọṅụ pụta.+ 44  O wee nye ha ala ndị mba ọzọ,+ Ha wee na-ewere ihe mba dị iche iche rụsiri ọrụ ike nweta,+ 45  Ka ha wee debe ụkpụrụ ya,+ Debekwa iwu ya.+ Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji