Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 101:1-8

Abụ ọma Devid. Abụ olu ụtọ. 101  M ga-abụ abụ banyere obiọma nakwa ikpe ziri ezi.+ Jehova, m ga-abụku gị abụ olu ụtọ.+   M ga-eji ezi uche mee ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ.+ Olee mgbe ị ga-abịakwute m?+ M ga-ejegharị n’iguzosi ike n’ezi ihe nke obi m n’ime ụlọ m.+   Agaghị m edebe ihe ọ bụla na-abaghị uru n’ihu m.+ Akpọrọ m ihe ndị dapụrụ adapụ na-eme asị;+ Ọ dịghị ihe jikọrọ mụ na ya.+   Anaghị m anọ onye obi ya gbagọrọ agbagọ nso;+ Anaghị m etinye aka n’ihe ọjọọ ọ bụla.+   Onye ọ bụla nke na-ekwutọ ibe ya na nzuzo,+ M ga-emechi ya ọnụ.+ Onye ọ bụla anya ya dị mpako, onye obi ya dịkwa nganga,+ Agaghị m edili ihe ọ na-eme.+   Anya m dị n’ebe ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ụwa nọ,+ Ka ha wee binyere m.+ Onye na-eje ije n’ụzọ na-enweghị ntụpọ,+ Ọ bụ ya ga na-ejere m ozi.+   Ọ dịghị onye aghụghọ nke ga-ebi n’ụlọ m.+ Ọ dịghịkwa onye ọ bụla nke na-ekwu okwu ụgha ga-eguzosi ike+ N’ihu m.+   Kwa ụtụtụ, m ga na-ala ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa n’iyi,+ Iji gbuchapụ ndị niile na-eme ihe ọjọọ+ n’obodo+ Jehova.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji