Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 10:1-18

ל [Lamed] 10  Jehova, gịnị mere i ji guzoro n’ebe dị anya?+ Gịnị mere i ji zoo onwe gị n’oge m nọ n’ahụhụ?+   Onye ajọ omume na-eji mpako achụ onye nọ n’ahụhụ ajọ ọsọ;+ Ndị ajọ omume na-ejikwa ihe ha chepụtara anwụde ndị nọ n’ahụhụ.+   N’ihi na onye ajọ omume etowo onwe ya n’ihi ọchịchọ onwe onye nke mkpụrụ obi ya,+ Onye na-erite uru na-ezighị ezi+ agọziwokwa onwe ya; נ [Nun]O lelịwo Jehova.+   Onye ajọ omume adịghị eme nchọpụta n’ihi mpako ya;+ Echiche ya niile bụ: “Chineke adịghị.”+   Ihe na-agaziri ya mgbe niile.+ Ọ pụghị ịghọta mkpebi ikpe gị;+ Ọ na-eleda ndị niile na-ebuso ya iro anya.+   O kwuwo n’obi ya, sị: “A gaghị eme ka m maa jijiji;+ Ọdachi agaghị adakwasị m site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.”+ פ [Pee]   Ọnụ ya jupụtara n’ịṅụ iyi na aghụghọ na mmegbu.+ Nsogbu na ihe ọjọọ dị n’okpuru ire ya.+   Ọ na-anọ n’akụkụ obodo nta dị iche iche chechie ndị mmadụ; Ọ ga-esi n’ebe zoro ezo gbuo onye aka ya dị ọcha.+ ע [Ayin]Ọ na-ele anya inweta onye ga-enwe ihe ndabara ọjọọ.+   Ọ na-ezo n’ebe zoro ezo dị ka ọdụm nke nọ n’ọgba ya.+ Ọ na-ezo+ iji dọkpụrụ onye nọ n’ahụhụ. Mgbe ọ dọọrọ ụgbụ ya, ọ na-adọkpụrụ onye nọ n’ahụhụ.+ 10  A na-echi ya ọnụ n’ala, o wee daa, Ìgwè ndị nọ ná mwute ga-adaba n’aka ya siri ike.+ 11  Ọ sịwo n’obi ya:+ “Chineke echefuola.+ O wepụwo ihu ya.+ Ọ dịghị mgbe ọ ga-ahụ ya.”+ ק [Kof] 12  Jehova, biko, bilie.+ Chineke, welie aka gị.+ Echefula ndị nọ n’ahụhụ.+ 13  Gịnị mere onye ajọ omume ji lelịa Chineke?+ Ọ sịwo n’obi ya: “Ị gaghị eme ka a zaa ajụjụ.”+ ר [Resh] 14  N’ihi na gị onwe gị ahụwo nsogbu na iru uju. Ị nọ na-ele anya, ka i wee lebara ihe ndị a anya.+ Ọ bụ gị ka onye ihe ọjọọ dabaara,+ bụ́ nwa na-enweghị nna, na-enyefe onwe ya. Gị onwe gị bụ onye na-enyere ya aka.+ ש [Shin] 15  Gbajie ogwe aka nke onye ajọ omume na onye ọjọọ.+ Chọọ ajọ omume ya ruo mgbe ọ na-adịkwaghị nke ị ga-ahụ.+ 16  Jehova bụ Eze ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Mba dị iche iche alawo n’iyi n’elu ala ya.+ ת [Tọọ] 17  Jehova, biko, nụrụ arịrịọ ndị dị umeala n’obi na-arịọ gị.+ Dozie obi ha.+ Jiri ntị gị nụrụ,+ 18  Ka i wee kpee nwa na-enweghị nna na onye e gburu mmụọ ya ikpe,+ Ka mmadụ efu nke nọ n’ụwa wee ghara ime ka a maa jijiji ọzọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji