Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Psalms 1:1-6

1  Obi ụtọ na-adịrị+ onye na-adịghị eje ije na ndụmọdụ ndị ajọ omume,+ Onye na-adịghịkwa eso ụzọ ndị mmehie,+ Onye na-adịghịkwa anọ n’etiti ndị na-akwa emo.+   Kama iwu Jehova na-atọ ya ụtọ,+ Ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị.+   Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,+ Nke na-amị mkpụrụ ya n’oge ya,+ Akwụkwọ ya adịghịkwa akpọnwụ akpọnwụ,+ Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.+   Ndị ajọ omume adịghị otú ahụ, Kama ha dị ka igbogbo ọka nke ifufe na-efesasị.+   Ọ bụ ya mere na ndị ajọ omume agaghị eguzo n’ikpe,+ Ndị mmehie agaghịkwa eguzo ná nzukọ ndị ezi omume.+   N’ihi na Jehova maara ụzọ ndị ezi omume,+ Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-ala n’iyi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji