Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Nehemaya 9:1-38

9  N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa a,+ ụmụ Izrel yiiri ákwà iru uju,+ wụkwasịkwa onwe ha ájá+ n’isi wee gbakọta na-ebu ọnụ.+  Mkpụrụ Izrel wee kewapụ+ onwe ha n’ebe ndị mba ọzọ+ niile nọ ma guzo ikwupụta+ mmehie ha+ na njehie ndị nna ha.+  Ha wee bilie n’ebe ha nọ+ ma jiri awa atọ n’ụbọchị*+ ahụ gụpụta akwụkwọ iwu+ Jehova bụ́ Chineke ha n’olu dara ụda; jirikwa awa atọ n’ụbọchị ahụ kwupụta mmehie ha+ ma kpọọrọ Jehova bụ́ Chineke ha isiala.+  Jeshụa na Benaị, Kadmiel, Shebanaya, Bọnaị, Sherebaya,+ Benaị na Kenenaị biliri n’elu ikpo okwu+ nke ndị Livaị wee jiri oké olu+ tikuo Jehova bụ́ Chineke ha.  Ndị Livaị bụ́ Jeshụa na Kadmiel, Benaị, Hashabnaya, Sherebaya, Hodaya, Shebanaya na Petahaya wee gaa n’ihu ịsị: “Bilienụ gọzie+ Jehova bụ́ Chineke unu site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.+ Ka ha gọziekwa aha gị dị ebube,+ bụ́ nke e buliri elu karịa ngọzi na otuto niile.  “Naanị gị bụ Jehova;+ ọ bụ gị kere eluigwe,+ ọbụna eluigwe nke eluigwe, na ìgwè ndị mmụọ ozi* niile nọ n’ime ya,+ ụwa+ na ihe niile dị n’elu ya,+ oké osimiri+ na ihe niile dị n’ime ya;+ ị na-echebekwa ha niile ndụ; ìgwè ndị mmụọ ozi+ nke eluigwe na-akpọkwara gị isiala.  Ị bụ Jehova bụ́ ezi Chineke, onye họọrọ Ebram+ wee kpọpụta ya n’obodo Ọọ nke ndị Kaldia+ ma mee ka aha ya bụrụ Ebreham.+  Ị chọpụtakwara na o kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe ị nọ;+ gị na ya wee gbaa ndụ+ na ị ga-enye ya ala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọraịt na ndị Perizaịt na ndị Jibọs na ndị Gegash, na ị ga-enye mkpụrụ ya ala ahụ;+ i wee mezuo okwu gị, n’ihi na ị bụ onye ezi omume.+  “I wee hụ+ mmekpa ahụ́ nke nna nna anyị hà n’Ijipt, ị nụkwara mkpu ákwá ha n’Oké Osimiri Uhie.+ 10  I wee mee ihe ịrịba ama ma rụọ ọrụ ebube megide Fero na ndị niile na-ejere ya ozi nakwa ndị ala ya niile,+ n’ihi na ị maara na ha mesoro ha omume mpako;+ i wee meere onwe gị aha+ dị ka ọ dị taa. 11  I kewakwara+ oké osimiri n’ihu ha, ha wee jee ije n’ala akọrọ mgbe ha si n’etiti oké osimiri ahụ gafee;+ ị tụbakwara ndị na-achụ ha n’oké osimiri+ dị ka nkume+ a tụbara na mmiri dị ike.+ 12  Ọ bụkwa ogidi ígwé ojii ka i ji duo ha n’ehihie,+ jirikwa ogidi ọkụ duo ha n’abalị,+ inye ha ìhè+ n’ụzọ ha kwesịrị iso. 13  Ọ bụkwa n’Ugwu Saịnaị ka ị gbadatara+ wee gwa ha okwu site n’eluigwe+ ma gaa n’ihu inye ha mkpebi ikpe ziri ezi+ na iwu eziokwu,+ ụkpụrụ dị mma+ na ntụziaka.+ 14  I mekwara ka ha mara ụbọchị izu ike gị dị nsọ,+ i sitekwara n’aka ohu gị Mozis+ nye ha ntụziaka na ụkpụrụ na iwu. 15  I nyekwara ha achịcha nke si n’eluigwe n’ihi agụụ nke na-agụ ha,+ i mekwara ka mmiri si na nkume dị elu gbapụtara ha n’ihi akpịrị nke na-akpọ ha nkụ,+ i wee gwa ha ka ha banye+ ma nweta ala ahụ i weliri aka gị ṅụọ iyi na ị ga-enye ha.+ 16  “Ha onwe ha kwa, bụ́ nna nna anyị hà, mere omume mpako+ ma kwesie olu ike,+ ha egeghịkwa ntị n’ihe i nyere n’iwu. 17  Ha wee jụ ige ntị,+ ha echetaghịkwa+ ọrụ ebube gị niile ị rụụrụ ha, kama ha kwesiri olu ike+ wee họpụta onye ndú+ iji laghachi n’agbụ n’Ijipt. Ma ị bụ Chineke nke na-agbaghara mmehie,+ onye na-eme amara,+ na-emekwa ebere,+ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ+ na onye obiọma* ya dị ukwuu,+ ị hapụghịkwa ha.+ 18  Ee, mgbe ha meere onwe ha ihe oyiyi nwa ehi a wụrụ awụ+ ma malite ịsị, ‘Ihe a bụ Chi unu, nke dupụtara unu n’Ijipt,’+ ha wee mee omume nlelị dị ukwuu, 19  gị onwe gị, n’ihi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị+ ha n’ala ịkpa. Ogidi ígwé ojii nke na-edu ha n’ụzọ esighịkwa n’ebe ha nọ pụọ n’ehihie,+ ogidi ọkụ ahapụghịkwa ha n’abalị inye ha ìhè n’ụzọ ha kwesịrị iso.+ 20  I nyekwara ha mmụọ gị dị mma+ ime ka ha mara ihe, i gbochighịkwa mana gị ịba ha n’ọnụ,+ i nyekwara ha mmiri n’ihi akpịrị nke na-akpọ ha nkụ.+ 21  I nyekwara ha ihe oriri n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ.+ Ọ dịghị ihe kọrọ ha.+ Uwe ha akaghị nká,+ ụkwụ ha azaghịkwa aza.+ 22  “I wee nye ha alaeze dị iche iche+ na ndị dị iche iche, keekwa ha ná mpaghara ná mpaghara;+ ha wee nweta ala nke Saịhọn,+ bụ́ ala nke eze Heshbọn,+ nakwa ala nke Ọg+ eze Beshan.+ 23  I mekwara ka ụmụ ha dị ọtụtụ dị ka kpakpando nke eluigwe.+ I wee kpọbata ha n’ala+ ahụ i kwere ndị nna nna ha nkwa+ na ha ga-aba nweta. 24  Ụmụ ha+ wee bata weghara ala ahụ,+ i wee merie+ ndị bi n’ala ahụ n’ihu ha, ya bụ, ndị Kenan,+ nyefeekwa ha n’aka ha, ọbụna ndị eze ha+ na ndị ala ahụ,+ ka ha mee ha ihe masịrị ha.+ 25  Ha wee weghara obodo ndị e wusiri ike+ na ala na-eme nri,+ wegharakwa ụlọ ndị jupụtara n’ihe ọma niile,+ olulu mmiri e gwuru egwu,+ ubi vaịn na ubi oliv+ na osisi ndị na-emepụta ihe oriri n’ụba, ha malitekwara iri ihe na iriju afọ+ na ịma abụba+ na inwe ahụ́ ọma n’oké ịdị mma gị.+ 26  “Otú ọ dị, ha ghọrọ ndị nnupụisi+ wee meere gị isi ike+ ma na-eleghara iwu gị anya,+ ha gbukwara ndị amụma gị,+ bụ́ ndị gbara àmà megide ha iji mee ka ha laghachikwute gị;+ ha wee na-eme omume nlelị dị ukwuu.+ 27  N’ihi ya, i nyefere ha n’aka ndị iro ha,+ bụ́ ndị nọ na-enye ha nsogbu;+ ma n’oge ha na-ata ahụhụ, ha na-etiku gị,+ gị onwe gị na-anọ n’eluigwe nụrụ;+ n’ihi ebere gị nke dị ukwuu,+ ị na-enye ha ndị nzọpụta,+ ndị na-azọpụta ha n’aka ndị iro ha.+ 28  “Ma ngwa ngwa ha nwere ezumike, ha na-emekwa ihe dị njọ n’ihu gị,+ ị na-ahapụkwa ha n’aka ndị iro ha, ndị na-azọda ha.+ E mesịa, ha na-alọghachi kpọkuo gị ka i nyere ha aka,+ gị onwe gị na-anọkwa n’eluigwe nụrụ+ ma napụta ha mgbe mgbe n’ihi ebere gị nke dị ukwuu.+ 29  Ọ bụ ezie na ị na-agba àmà+ megide ha iji mee ka ha laghachite n’iwu gị,+ ha onwe ha mere ọbụna omume mpako,+ ha aṅaghịkwa ntị n’ihe i nyere n’iwu; ha mebikwara+ mkpebi ikpe gị,+ bụ́ ndị ga-eme ka mmadụ dị ndụ+ ma ọ bụrụ na o debe ha. Ha nọkwa na-eme isi ike,+ kwesiekwa olu ike,+ ha aṅaghịkwa ntị.+ 30  Ma ị nọ na-emere ha ebere ruo ọtụtụ afọ,+ jirikwa mmụọ gị na-agba àmà+ megide ha site n’ọnụ ndị amụma gị, ma ha egeghị ntị.+ N’ikpeazụ, i nyefere ha n’aka ndị ala ahụ.+ 31  N’ihi ebere gị nke dị ukwuu, i kpochapụghị ha,+ ị hapụghịkwa+ ha; n’ihi na ị bụ Chineke nke na-eme amara,+ na-emekwa ebere.+ 32  “Ugbu a, Chineke anyị, bụ́ Chineke dị ukwuu,+ onye dị ike+ ma dị egwu,+ onye na-edebe ọgbụgba ndụ+ ma na-egosi obiọma,+ ekwela ka ihe isi ike niile dakwasịrị anyị+ na ndị eze anyị+ na ndị isi anyị+ na ndị nchụàjà anyị+ na ndị amụma anyị+ na nna nna anyị hà+ na ndị gị niile malite n’ụbọchị ndị eze Asiria ruo taa,+ yie ihe dị nta n’ihu gị.+ 33  Ị bụ onye ezi omume+ n’ihe niile dakwasịrị anyị, n’ihi na i mere ihe i mere n’ikwesị ntụkwasị obi,+ ma ọ bụ anyị bụ ndị mere ajọ omume.+ 34  Ndị eze anyị, ndị isi anyị, ndị nchụàjà anyị na nna nna anyị hà+ edebeghị iwu gị,+ ha aṅaghịkwa ntị ná ntụziaka gị+ ma ọ bụ n’ihe àmà gị ndị i ji gbaa àmà+ megide ha. 35  Ha onwe ha kwa—n’oge alaeze ha,+ n’agbanyeghị ọtụtụ ihe ọma+ i nyere ha na ala sara mbara, nke na-eme nri,+ i nyere ha, ha efeghị gị,+ ha ahapụghịkwa omume ọjọọ ha.+ 36  Lee! Anyị bụ ndị ohu taa;+ n’ihe banyere ala ahụ i nyere nna nna anyị hà ka ha rie mkpụrụ ya na ihe ọma ya, lee! anyị bụ ndị ohu na ya,+ 37  mkpụrụ ya na-amịrị+ ndị eze+ n’ụba, bụ́ ndị i mere ka ha na-achị anyị n’ihi mmehie anyị,+ ha na-achịkwa anyị na anụ ụlọ anyị dị ka ha si chọọ, anyị nọkwa n’oké ahụhụ.+ 38  “N’ihi ihe a dum, anyị na-eme ndokwa+ nke a pụrụ ịtụkwasị obi, site n’ide ya ede, ndị isi anyị, ndị Livaị anyị na ndị nchụàjà anyị+ bịanyekwara aka na ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Neh 9:3*   Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “otu nkebi n’ime nkebi anọ nke ụbọchị.”
Neh 9:6*  Nke a pụkwara ịgụnye ihe ndị dị ka anyanwụ, ọnwa na kpakpando.
Neh 9:17*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”