Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Nehemaya 8:1-18

8  Mmadụ niile wee zukọọ dị ka otu onye+ n’ámá+ dị n’ihu Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri.+ Ha wee gwa Ezra+ bụ́ ọkà n’idepụta ihe ka o weta akwụkwọ+ iwu Mozis,+ bụ́ iwu Jehova nyere Izrel.+  Ezra onye nchụàjà+ wee weta iwu ahụ n’ihu ọgbakọ+ nke ndị ikom na ndị inyom na ndị niile pụrụ ige ntị wee ghọta ihe,+ n’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa.+  O wee na-agụpụta+ ya n’olu dara ụda n’ámá dị n’ihu Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri, malite n’ụtụtụ+ ruo n’etiti ehihie, n’ihu ndị ikom na ndị inyom na ndị ọzọ niile pụrụ ịghọta ihe; ntị+ mmadụ niile na-anụkwa+ ihe a na-agụpụta n’akwụkwọ iwu ahụ.  Ezra bụ́ ọkà n’idepụta ihe wee guzoro n’elu ikpo okwu+ e ji osisi rụọ, nke ha rụrụ maka nnọkọ ahụ; Matitaya na Shima na Anaya na Yuraya na Hilkaya na Measaya guzokwa n’akụkụ ya, n’aka nri ya, ebe Pedaya na Mishel na Malkaịja+ na Heshọm+ na Hash-badana, Zekaraya na Meshọlam guzo n’aka ekpe ya.  Ezra wee meghee+ akwụkwọ ahụ n’ihu mmadụ niile, n’ihi na o guzo n’ebe dị elu karịa ebe mmadụ niile nọ; ka o meghere ya, mmadụ niile guzoro ọtọ.+  Ezra wee gọzie Jehova+ bụ́ ezi Chineke, Onye dị ukwuu, mmadụ niile wee chịlie aka elu+ zaa, sị, “Amen! Amen!”+ Ha wee hulata+ kpọọrọ Jehova isiala.+  Jeshụa na Benaị na Sherebaya,+ Jemin, Akọb, Shabetaị, Hodaya, Measaya, Kelaịta, Azaraya, Jozabad,+ Henan, Peleya,+ bụ́ ndị Livaị, nọ na-akọwara ndị mmadụ iwu ahụ,+ ka ndị mmadụ guzo ọtọ.+  Ha wee jiri olu dara ụda na-agụpụta+ ihe dị n’akwụkwọ ahụ, ihe dị n’iwu ezi Chineke, na-akọwa ya, na-emekwa ka o doo anya; ha nọkwa na-eme ka a ghọta ihe a na-agụpụta.+  Nehemaya,+ ya bụ, Tesheta,+ na Ezra+ onye nchụàjà, ọkà n’idepụta ihe, na ndị Livaị bụ́ ndị na-akụziri ndị mmadụ ihe wee gwa mmadụ niile, sị: “Taa dị nsọ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu nọ.+ Unu erula uju, unu akwala ákwá.”+ N’ihi na mmadụ niile nọ na-akwa ákwá mgbe ha na-anụ ihe e kwuru n’iwu ahụ.+ 10  O wee gaa n’ihu ịsị ha: “Laanụ, rienụ ihe mara abụba, ṅụọkwanụ ihe na-atọ ụtọ, zigakwaranụ+ onye ọ na-enweghị ihe a kwadebeere ya ihe; n’ihi na taa dị nsọ n’ebe Onyenwe anyị nọ, unu enwekwala mwute, n’ihi na ọṅụ Jehova bụ ebe unu e wusiri ike.” 11  Ndị Livaị nọ na-agwa mmadụ niile ka ha nọrọ jụụ, na-asị: “Kwụsịnụ ịkwa ákwá! n’ihi na taa dị nsọ; unu enwekwala mwute.” 12  Mmadụ niile wee lawa ịga rie ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ, zigakwara ndị ọzọ ihe+ ma na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu,+ n’ihi na ha ghọtara okwu ahụ e mere ka ha mara.+ 13  N’ụbọchị nke abụọ, ndị isi nke ndị bụ́ nna ụmụ Izrel niile, ndị nchụàjà na ndị Livaị, zukọtara n’ebe Ezra bụ́ ọkà n’idepụta ihe nọ, ka ha wee ghọta ihe e kwuru n’iwu ahụ.+ 14  Ha wee chọpụta na e dere n’iwu ahụ Jehova nyere site n’aka Mozis+ na ụmụ Izrel ga-ebi n’ụlọ ndò+ n’oge ememme a nke a na-eme n’ọnwa nke asaa,+ 15  na ha ga-akpọsakwa+ ma kwupụta n’obodo ha niile nakwa na Jeruselem dum,+ sị: “Gaanụ n’ógbè bụ́ ugwu ugwu+ gbute akwụkwọ oliv+ na akwụkwọ osisi mmanụ na akwụkwọ osisi metụl na igu nkwụ na akwụkwọ osisi ndị nwere alaka a ga-eji wuo ụlọ ndò, dị ka ihe e dere ede si dị.” 16  Mmadụ niile wee gaa gbute ihe ndị ahụ, wuokwara onwe ha ụlọ ndò, onye nke ọ bụla n’elu ụlọ+ ya nakwa n’ogige ha nakwa n’ogige+ ụlọ nke ezi Chineke nakwa n’ámá+ Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri+ nakwa n’ámá Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem.+ 17  Ọgbakọ ahụ dum nke ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta wee wuo ụlọ ndò, wee biri n’ụlọ ndò; n’ihi na ụmụ Izrel emetụbeghị otú ahụ malite n’oge Jọshụa nwa Nọn+ ruo n’ụbọchị ahụ, ha wee na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu.+ 18  A nọkwa na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ iwu nke ezi Chineke kwa ụbọchị n’olu dara ụda,+ malite n’ụbọchị mbụ ruo n’ụbọchị ikpeazụ; ha wee na-eme ememme ahụ ruo ụbọchị asaa, n’ụbọchị nke asatọ, e nwere nzukọ ukwu dị ka e kwuru n’iwu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji