Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Nehemaya 7:1-73

7  O wee ruo na, ozugbo e wughachisịrị+ mgbidi ahụ, m tinyere ibo ya+ niile n’egbughị oge. A họpụtakwara ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ na ndị na-abụ+ abụ na ndị Livaị.+  M wee mee ka Hanenaị+ nwanne m na Hananaya bụ́ onyeisi Ebe E Wusiri Ike+ bụrụ ndị na-elekọta Jeruselem, n’ihi na Hananaya bụ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi,+ ọ na-atụkwa egwu+ ezi Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ.  M wee sị ha: “A gaghị emeghe ọnụ ụzọ ámá+ Jeruselem ruo mgbe anyanwụ chasiwara ike; mgbe ha guzokwa nso, ha ga-emechi ibo ya niile ma kpọchie ha.+ Meekwa ka ndị nche bi na Jeruselem guzoro, onye nke ọ bụla n’ebe ọ ga-eche nche, onye nke ọ bụla n’ihu ụlọ ya.”+  Obodo ahụ sara mbara, dịkwa ukwuu, mmadụ ole na ole nọkwa n’ime ya,+ e wughịkwa ụlọ na ya.  Ma Chineke m tinyere ya n’obi+ m ka m kpọkọta ndị a ma ama na ndị osote onye na-achị achị na mmadụ niile ka ha deba aha n’akwụkwọ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị.+ M wee chọta akwụkwọ e debara aha ndị mmadụ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị,+ bụ́ ndị bu ụzọ lọta, m hụkwara na e dere n’ime ya, sị:  Ndị a bụ ndị si n’ógbè a na-achị achị,+ bụ́ ndị si n’etiti ndị a dọọrọ n’agha lọta,+ ndị Nebukadneza+ eze Babịlọn dọọrọ n’agha,+ ndị mesịkwara lọta Jeruselem na Juda, onye nke ọ bụla n’obodo nke ya;+  ndị so Zerọbabel+ lọta bụ Jeshụa,+ Nehemaya, Azaraya, Ramaya, Nehamanaị, Mọdekaị,+ Bilshan, Misperet, Bigvaị, Nihọm, Beana. Nke a bụ ole ndị ikom Izrel dị:  Ụmụ Perọsh+ dị puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ;  ụmụ Shefataya,+ narị atọ na iri asaa na abụọ; 10  ụmụ Era,+ narị isii na iri ise na abụọ; 11  ụmụ Pehat-moab,+ ndị bụ́ ụmụ Jeshụa na Joab,+ puku abụọ, narị asatọ na iri na asatọ; 12  ụmụ Ilam,+ otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ; 13  ụmụ Zatu,+ narị asatọ na iri anọ na ise; 14  ụmụ Zakaị,+ narị asaa na iri isii; 15  ụmụ Binuaị,+ narị isii na iri anọ na asatọ; 16  ụmụ Bibaị,+ narị isii na iri abụọ na asatọ; 17  ụmụ Azgad,+ puku abụọ, narị atọ na iri abụọ na abụọ; 18  ụmụ Adọnaịkam,+ narị isii na iri isii na asaa; 19  ụmụ Bigvaị,+ puku abụọ na iri isii na asaa; 20  ụmụ Edin,+ narị isii na iri ise na ise; 21  ụmụ Eta,+ bụ́ ndị Hezekaya mụrụ, dị iri itoolu na asatọ; 22  ụmụ Heshọm,+ narị atọ na iri abụọ na asatọ; 23  ụmụ Bizaị,+ narị atọ na iri abụọ na anọ; 24  ụmụ Herif,+ otu narị na iri na abụọ; 25  ụmụ Gibiọn,+ iri itoolu na ise; 26  ndị ikom Betlehem+ na Netofa,+ otu narị na iri asatọ na asatọ; 27  ndị ikom Anatọt,+ otu narị na iri abụọ na asatọ; 28  ndị ikom Bet-azmavet,+ iri anọ na abụọ; 29  ndị ikom Kiriat-jierim,+ Kefaịra+ na Bierọt,+ narị asaa na iri anọ na atọ; 30  ndị ikom Rema+ na Giba,+ narị isii na iri abụọ na otu; 31  ndị ikom Mikmas,+ otu narị na iri abụọ na abụọ; 32  ndị ikom Betel+ na E-aị,+ otu narị na iri abụọ na atọ; 33  ndị ikom Nibo+ nke ọzọ, iri ise na abụọ; 34  ụmụ Ilam+ nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ; 35  ụmụ Herim,+ narị atọ na iri abụọ; 36  ụmụ Jeriko,+ narị atọ na iri anọ na ise; 37  ụmụ Lọd,+ Hedid+ na Ono,+ narị asaa na iri abụọ na otu; 38  ụmụ Senea,+ puku atọ, narị itoolu na iri atọ. 39  Ndị nchụàjà: Ụmụ Jedeya+ nke ụlọ Jeshụa, narị itoolu na iri asaa na atọ; 40  ụmụ Ịma,+ otu puku na iri ise na abụọ; 41  ụmụ Pash-họ,+ otu puku, narị abụọ na iri anọ na asaa; 42  ụmụ Herim,+ otu puku na iri na asaa. 43  Ndị Livaị: Ụmụ Jeshụa, bụ́ ụmụ Kadmiel,+ bụ́ ụmụ Hodeva,+ iri asaa na anọ. 44  Ndị na-abụ abụ,+ bụ́ ụmụ Esaf,+ otu narị na iri anọ na asatọ. 45  Ndị nche ọnụ ụzọ ámá,+ ụmụ Shalọm,+ ụmụ Eta, ụmụ Talmọn,+ ụmụ Akọb,+ ụmụ Hataịta, ụmụ Shobaị,+ otu narị na iri atọ na asatọ. 46  Ndị Netinim:+ Ụmụ Zaịha, ụmụ Hasufa, ụmụ Tabeọt,+ 47  ụmụ Kirọs, ụmụ Saya, ụmụ Pedọn,+ 48  ụmụ Lebena, ụmụ Hagaba,+ ụmụ Salmaị, 49  ụmụ Henan,+ ụmụ Gidel, ụmụ Geha, 50  ụmụ Reeya,+ ụmụ Rizin,+ ụmụ Nekoda, 51  ụmụ Gazam, ụmụ Ọza, ụmụ Pasia, 52  ụmụ Bisaị,+ ụmụ Meyunim, ụmụ Nefọshesim,+ 53  ụmụ Bakbọk, ụmụ Hakufa, ụmụ Hahọ,+ 54  ụmụ Bazlit, ụmụ Mehaịda, ụmụ Hasha,+ 55  ụmụ Bakọs, ụmụ Sisera, ụmụ Tima,+ 56  ụmụ Nezaya, ụmụ Hataịfa.+ 57  Ụmụ ndị ohu Sọlọmọn:+ Ụmụ Sotaị, ụmụ Sofiret, ụmụ Peraịda,+ 58  ụmụ Jeala, ụmụ Dakọn, ụmụ Gidel,+ 59  ụmụ Shefataya, ụmụ Hatil, ụmụ Pokeret-hazebem, ụmụ Emọn.+ 60  Ndị Netinim+ niile na ụmụ ndị na-ejere Sọlọmọn ozi mụrụ dị narị atọ na iri itoolu na abụọ. 61  Ndị a bụ ndị si Tel-mila, Tel-hasha, Kirọb, Adọn na Ịma+ lọta, ma ha enweghị ike ikwu ụlọ nna ha na usoro ọmụmụ ha, ma hà bụ ndị Izrel: 62  ụmụ Deleya, ụmụ Tobaya, ụmụ Nekoda,+ narị isii na iri anọ na abụọ. 63  Ndị a bụkwa ndị nchụàjà:+ ụmụ Habaya, ụmụ Hakọz,+ ụmụ Bazilaị,+ bụ́ onye lụrụ otu n’ime ụmụ ndị inyom Bazilaị+ onye Gilied wee zawa aha ha. 64  Ndị a bụ ndị chọrọ akwụkwọ e debara aha ha, iji gosi usoro ọmụmụ ha n’ihu ọha, ma ha ahụghị ya,+ nke mere e ji gụpụ ha n’ọrụ nchụàjà+ dị ka ndị rụrụ arụ. 65  Ya mere, Tesheta+ sịrị ha na ha agaghị eri ihe+ kasị nsọ ruo mgbe onye nchụàjà ji Yurim+ na Tọmịm+ guzoro ọtọ. 66  Ọgbakọ ahụ dum, dị ka otu ìgwè, dị puku mmadụ iri anọ na abụọ, narị atọ na iri isii,+ 67  e wezụga ohu ha ndị ikom+ na ohu ha ndị inyom, ndị dị puku asaa, narị atọ na iri atọ na asaa;+ ha nwekwara ndị ikom+ na-abụ abụ na ndị inyom+ na-abụ abụ, ndị dị narị abụọ na iri anọ na ise. 68  Ịnyịnya ha dị narị asaa na iri atọ na isii, ịnyịnya ibu ha adịrị narị abụọ na iri anọ na ise.+ 69  Kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise. Ịnyịnya ibu+ ha adịrị puku isii, narị asaa na iri abụọ.+ 70  E nwekwara ndị so ná ndị isi+ ọnụmara+ dị iche iche ndị nyere onyinye maka ọrụ ahụ.+ Tesheta+ nyere otu puku mkpụrụ ego drakma ọlaedo, ọkwá iri ise, uwe mwụda ndị nchụàjà+ narị ise na iri atọ, ka e debe ha n’ebe a na-edebe akụ̀. 71  E nwekwara ụfọdụ n’ime ndị isi ọnụmara dị iche iche ndị nyere mkpụrụ ego drakma ọlaedo dị puku iri abụọ nakwa maịna+ ọlaọcha dị puku abụọ na narị abụọ maka ọrụ ahụ, ka e debe ha n’ebe a na-edebe akụ̀. 72  Ihe ndị ọzọ nyere bụ mkpụrụ ego drakma ọlaedo nke dị puku iri abụọ nakwa puku maịna ọlaọcha abụọ nakwa uwe mwụda ndị nchụàjà iri isii na asaa. 73  Ndị nchụàjà+ na ndị Livaị na ndị nche ọnụ ụzọ ámá na ndị na-abụ abụ+ na ụfọdụ n’ime ndị anyị nakwa ndị Netinim+ na Izrel dum wee biri n’obodo ha.+ N’ọnwa nke asaa,+ ụmụ Izrel nọcha n’obodo ha dị iche iche.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji