Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mkpughe 5:1-14

5  M wee hụ otu akwụkwọ mpịakọta nke e dere ihe n’ime ya nakwa n’azụ ya+ n’aka nri nke Onye ahụ nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ e jikwa ihe asaa a kara akara mechisie+ ya ike.  M wee hụ otu mmụọ ozi dị ike nke ji oké olu na-ekwusa, sị: “Ònye kwesịrị imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ na ịtọpụ ihe ndị a kara akara e ji mechie ya?”  Ma ọ dịghị otu onye n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ụwa ma ọ bụ n’okpuru ala nke nwere ike imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ ma ọ bụ ile anya n’ime ya.  M wee malite ịkwa ákwá nke ukwuu n’ihi na a hụghị onye kwesịrị imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ ma ọ bụ ile anya n’ime ya.+  Ma otu n’ime ndị okenye ahụ sịrị m: “Kwụsị ịkwa ákwá. Lee! Ọdụm nke si n’ebo Juda,+ bụ́ mgbọrọgwụ+ Devid,+ emeriwo.+ Ya mere, o ruru eru imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ na ihe asaa a kara akara e ji mechie ya.”  M wee hụ nwa atụrụ+ nke guzo n’etiti ocheeze ahụ+ na n’etiti ihe anọ ahụ dị ndụ na n’etiti ndị okenye ahụ+ dị ka à ga-asị na e gburu ya egbu,+ o nwere mpi asaa na anya asaa, bụ́ anya ndị pụtara mmụọ asaa+ nke Chineke, bụ́ ndị e zigara n’ụwa dum.  O wee gaa nara ya ozugbo n’aka nri nke Onye ahụ nọ ọdụ n’ocheeze ahụ.+  Mgbe ọ naara akwụkwọ mpịakọta ahụ, ihe anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ+ dara n’ala n’ihu Nwa Atụrụ ahụ, nke ọ bụla jikwa otu ụbọ akwara+ na efere ọlaedo ndị jupụtara n’ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ihe nsure ọkụ ahụ nke na-esi ísì ụtọ+ pụtara ekpere+ ndị nsọ.  Ha na-abụkwa abụ ọhụrụ,+ sị: “I kwesịrị ịnara akwụkwọ mpịakọta ahụ ma meghee ihe ndị a kara akara e ji mechie ya, n’ihi na e gburu gị egbu, i jikwa ọbara gị+ zụtara+ Chineke ndị mmadụ+ si n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile, 10  i mekwara ka ha bụụrụ Chineke anyị+ otu alaeze+ na ndị nchụàjà,+ ha ga-achịkwa ụwa dị ka ndị eze.”+ 11  M wee hụ, nụkwa olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi gbara ocheeze ahụ na ihe ndị ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gburugburu, ha dịkwa iri puku kwuru iri puku,+ na puku kwuru puku,+ 12  ka ha ji oké olu na-asị: “Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu+ kwesịrị ịnata ike na akụnụba na amamihe na ume na nsọpụrụ na otuto na ngọzi.”+ 13  Ihe niile e kere eke ndị dị n’eluigwe na n’elu ụwa na n’okpuru ala+ na n’elu oké osimiri, na ihe niile dị n’ime ha, ka m nụkwara ka ha na-asị: “Ka ngọzi na nsọpụrụ+ na otuto+ na ike dịrị Onye ahụ nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ dịkwara Nwa Atụrụ ahụ,+ ruo mgbe niile ebighị ebi.” 14  Ihe anọ ahụ dị ndụ wee na-asị: “Amen!” ndị okenye ahụ+ dakwara n’ala wee kpọọ isiala.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji