Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mkpughe 4:1-11

4  Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m, ma, lee! ọnụ ụzọ e meghere emeghe n’eluigwe, olu mbụ m nụrụ na-ada ka opi.+ O wee gwa m okwu, sị: “Gbagote n’ebe a,+ m ga-egosi gị ihe ndị na-aghaghị ime.”+  Mgbe ihe ndị a gasịrị, mmụọ nsọ malitere ozugbo iduzi m: ma, lee! otu ocheeze+ dị n’eluigwe,+ e nwekwara onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ.+  Onye ahụ nke nọ ọdụ na-egbuke dị ka+ nkume jaspa+ na nkume dị oké ọnụ ahịa nke na-acha ọbara ọbara, eke na egwurugwu+ nke na-egbuke dị ka emerad+ gbakwara ocheeze ahụ gburugburu.  Ocheeze iri abụọ na anọ gbakwara ocheeze ahụ gburugburu, ahụkwara m ka ndị okenye+ iri abụọ na anọ+ ndị yi uwe elu na-acha ọcha+ nọ ọdụ n’ocheeze ndị a,+ ha kpukwa okpueze ọlaedo n’isi ha.+  Àmụ̀mà+ na olu na égbè eluigwe+ si n’ocheeze ahụ na-apụta; oriọna asaa+ ndị na-enwu ọkụ dịkwa n’ihu ocheeze ahụ, oriọna ndị a pụtara mmụọ asaa+ nke Chineke.  E nwekwara ihe a pụrụ ịkpọ oké osimiri nke yiri enyo,+ nke dị ka kristal, n’ihu ocheeze ahụ. N’etiti ocheeze ahụ nakwa gburugburu ocheeze ahụ, e nwere ihe anọ dị ndụ+ ndị jupụtara n’anya ma n’ihu ma n’azụ.  Ihe nke mbụ dị ndụ dị ka ọdụm,+ ihe nke abụọ dị ndụ dị ka nwa oké ehi,+ ihe nke atọ dị ndụ+ nwere ihu yiri ihu mmadụ, ihe nke anọ dị ndụ+ dị ka ugo nke na-efe efe.+  Nke ọ bụla n’ime ihe anọ ahụ dị ndụ+ nwere nku isii;+ ha jupụtara n’anya+ gburugburu ha nakwa n’okpuru ha. Ha adịghị ezu ike ehihie na abalị ka ha na-asị: “Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova+ Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile dị,+ bụ́ onye dịbu adị na onye dị adị+ na onye na-abịa.”  Mgbe ọ bụla ihe ndị ahụ dị ndụ nyere Onye ahụ nọ ọdụ n’ocheeze+ otuto na nsọpụrụ na ekele,+ bụ́ Onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi,+ 10  ndị okenye iri abụọ na anọ+ ahụ na-ada n’ala n’ihu Onye ahụ nọ ọdụ n’ocheeze ma kpọọrọ Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi isiala,+ ha na-atọgbọkwa okpueze ha n’ihu ocheeze ahụ, sị: 11  “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto+ na nsọpụrụ+ na ike,+ n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile,+ ọ bụkwa n’ihi uche gị+ ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji