Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mkpughe 3:1-22

3  “Degakwara mmụọ ozi+ nke ọgbakọ dị na Sadis akwụkwọ, sị: Ihe ndị a ka onye ahụ nke nwere mmụọ asaa+ nke Chineke na kpakpando asaa+ ahụ na-ekwu, ‘Amaara m ihe ndị ị na-eme, na i nwere aha na ị dị ndụ, ma ị nwụrụ anwụ.+  Na-eche nche,+ meekwa ka ihe ndị fọdụrụ, bụ́ ndị na-achọ ịnwụ anwụ, dị ike,+ n’ihi na ahụwo m na i mezubeghị ihe ndị ị na-eme n’ihu Chineke m.+  Ya mere, na-echeta ihe ị natara+ na ihe ị nụrụ, na-edebekwa ya,+ ma chegharịa.+ N’ezie, ọ bụrụ na i tetaghị,+ m ga-abịa dị ka onye ohi,+ ị gaghịkwa ama oge awa m ga-abịakwasị gị.+  “‘Otú ọ dị, i nwere mmadụ ole na ole+ na Sadis, bụ́ ndị na-emerụghị+ uwe elu ha, ha ga-eyikwa uwe elu na-acha ọcha+ wee soro m na-eje ije, n’ihi na ha kwesịrị ekwesị.+  A ga-esikwa otú ahụ yiwe onye meriri emeri+ uwe elu nke na-acha ọcha;+ m gaghịkwa ehichapụ aha ya ma ọlị n’akwụkwọ nke ndụ,+ kama m ga-ekwupụta aha ya n’ihu Nna m+ na n’ihu ndị mmụọ ozi ya.+  Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe mmụọ nsọ+ na-agwa ọgbakọ ndị a.’  “Degakwara mmụọ ozi+ nke ọgbakọ dị na Filadelfịa akwụkwọ, sị: Ihe ndị a ka onye ahụ dị nsọ+ na-ekwu, onye eziokwu,+ onye ji mkpịsị ugodi nke Devid,+ onye na-emeghe ka onye ọ bụla wee ghara imechi, onye na-emechikwa ka onye ọ bụla wee ghara imeghe,  ‘Amaara m ihe ndị ị na-eme+—lee! edebewo m ọnụ ụzọ ghere oghe n’ihu gị,+ nke onye ọ bụla na-apụghị imechi—na i nwere ike dị nta, i debekwara okwu m, ị gọnahụghịkwa aha m.+  Lee! M ga-akpọta ndị si n’ụlọ nzukọ Setan bụ́ ndị na-ekwu na ha bụ ndị Juu,+ ma ha abụghị kama ha na-agha ụgha+—lee! m ga-eme ka ha bịa kpọọ isiala+ n’ụkwụ gị, meekwa ka ha mara na ahụrụ m gị n’anya. 10  N’ihi na i debere okwu banyere ntachi obi m,+ m ga-echebekwa gị+ n’oge awa nke ule, bụ́ nke ga-abịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi, iji lee ndị bi n’elu ụwa ule.+ 11  Ana m abịa ọsọ ọsọ.+ Jidesie ihe i nwere ike,+ ka onye ọ bụla wee ghara iwere okpueze gị.+ 12  “‘M ga-eme ka onye meriri emeri bụrụ ogidi+ n’ụlọ nsọ+ nke Chineke m,+ ọ gaghịkwa esi n’ebe ahụ pụọ ọzọ ma ọlị, m ga-edekwasịkwa n’ahụ́ onye ahụ aha Chineke m na aha obodo ukwu nke Chineke m, bụ́ Jeruselem ọhụrụ+ nke si n’eluigwe na-arịdata site n’ebe Chineke m nọ, nakwa aha ọhụrụ m ahụ.+ 13  Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe mmụọ nsọ+ na-agwa ọgbakọ ndị a.’ 14  “Degakwara mmụọ ozi nke ọgbakọ dị na Leodisia+ akwụkwọ, sị: Ihe ndị a ka Amen+ ahụ na-ekwu, bụ́ ezi+ onye àmà+ nke kwesịrị ntụkwasị obi,+ mmalite nke ihe Chineke kere,+ 15  ‘Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ị jụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ. Ọ dị m ka ya bụrụ na ị jụrụ oyi ma ọ bụkwanụ na ị na-ekpo ọkụ. 16  Ya mere, ebe ọ bụ na ị dị ṅaraṅara, i kpoghị ọkụ,+ ị jụghịkwa oyi,+ m ga-agbụpụ gị n’ọnụ m. 17  N’ihi na ị na-asị: “Abara m ọgaranya,+ enwetawokwa m akụnụba, ọ dịghịkwa ihe na-akpa m ma ọlị,” ma ị maghị na ị nọ ná nhụsianya, bụrụkwa onye e kwesịrị imere ebere nakwa onye dara ogbenye na onye kpuru ìsì+ na onye gba ọtọ, 18  ana m enye gị ndụmọdụ ka ị zụrụ n’aka m ọlaedo+ e ji ọkụ nụchaa, ka i wee baa ọgaranya, zụrụkwa uwe elu na-acha ọcha, ka i wee yiri uwe, ka e wee ghara ịhụ ọtọ gị,+ ihere ewee mee gị, zụrụkwa ọgwụ anya ị ga-ete n’anya gị+ ka i wee na-ahụ ụzọ. 19  “‘Ndị niile m hụrụ n’anya nke ukwuu ka m na-abara mba, na-adọkwa aka ná ntị.+ Ya mere, na-anụ ọkụ n’obi, chegharịakwa.+ 20  Lee! Eguzo m n’ọnụ ụzọ+ ma na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ olu m ma meghee ụzọ,+ m ga-abata n’ụlọ ya ma soro ya rie nri anyasị, ọ ga-esokwa m rie nri. 21  M ga-eme ka onye meriri emeri+ soro m nọdụ ala n’ocheeze m,+ ọbụna dị ka m meriri wee soro Nna m nọdụ ala+ n’ocheeze ya.+ 22  Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe mmụọ nsọ+ na-agwa ọgbakọ ndị a.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji