Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mkpughe 20:1-15

20  M wee hụ otu mmụọ ozi ka o si n’eluigwe na-agbadata. O ji mkpịsị ugodi nke abis+ na agbụ ígwè dị ukwuu n’aka ya.  O wee jide dragọn ahụ,+ bụ́ agwọ mbụ ahụ,+ onye bụ́ Ekwensu+ na Setan,+ wee kee ya agbụ ruo otu puku afọ.  Ọ tụbakwara ya n’ime abis+ ahụ, mechie ya ma kaa ya akara mgbe ọ tụbasịrị ya, ka o wee ghara iduhie mba niile ọzọ ruo mgbe otu puku afọ ahụ gwụsịrị. Mgbe ihe ndị a gasịrị, a ga-atọpụ ya ruo nwa oge.+  M wee hụ ocheeze dị iche iche,+ e nwekwara ndị nọ ọdụ na ha, e nyekwara ha ike ikpe ikpe.+ Ee, ahụrụ m mkpụrụ obi nke ndị e ji anyụike gbuo n’ihi àmà ha gbara banyere Jizọs nakwa n’ihi ikwu okwu banyere Chineke, ndị na-efeghịkwa anụ ọhịa ahụ+ ma ọ bụ onyinyo ya+ ofufe, ndị na-anataghịkwa akara ahụ n’egedege ihu ha na n’elu aka ha.+ Ha wee dịrị ndụ ma soro Kraịst chịa dị ka ndị eze+ ruo otu puku afọ.  (Ndị fọdụrụ ná ndị nwụrụ anwụ+ adịghị ndụ ruo mgbe otu puku afọ ahụ gwụsịrị.)+ Nke a bụ mbilite n’ọnwụ mbụ.+  Onye obi ụtọ+ na onye dị nsọ+ ka onye ọ bụla nke nwere òkè ná mbilite n’ọnwụ mbụ bụ; ọnwụ nke abụọ+ enweghị ikike+ n’ebe ndị a nọ, kama ha ga-abụ ndị nchụàjà+ nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ ahụ.+  Ozugbo otu puku afọ ahụ gwụsịrị, a ga-atọpụ Setan n’ụlọ mkpọrọ ya,  ọ ga-agakwa ka o duhie mba ndị dị na nkuku anọ nke ụwa, bụ́ Gọg na Megọg, ka o wee kpọkọta ha maka ibu agha ahụ. Ọnụ ọgụgụ ha dị ka ájá nke oké osimiri.+  Ha wee gazuo obosara nke ụwa ma gbaa ebe ndị nsọ mara ụlọikwuu+ gburugburu, gbaakwa obodo ahụ a hụrụ n’anya gburugburu.+ Ma ọkụ si n’eluigwe daa wee repịa ha.+ 10  A tụbakwara Ekwensu,+ bụ́ onye na-eduhie ha, n’ime ọdọ ọkụ na sọlfọ ahụ, bụ́ ebe ma anụ ọhịa ahụ+ ma onye amụma ụgha ahụ nọ anọ;+ a ga-emekpakwa ha ahụ́ ehihie na abalị ruo mgbe niile ebighị ebi. 11  M wee hụ otu nnukwu ocheeze dị ọcha na onye nọ ọdụ na ya.+ Ụwa na eluigwe sikwa n’ihu ya gbapụ,+ ọ dịghịkwa ebe a hụrụ ha ga-adị. 12  M wee hụ ndị nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta,+ ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ, e meghekwara akwụkwọ mpịakọta dị iche iche. Ma e meghere akwụkwọ mpịakọta ọzọ; ọ bụ akwụkwọ mpịakọta nke ndụ.+ E kpekwara ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, dị ka omume ha si dị.+ 13  Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ+ nọ n’ime ha, e kpekwara ha ikpe n’otu n’otu dị ka omume ha si dị.+ 14  A tụbakwara ọnwụ+ na Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ. Ọdọ ọkụ+ ahụ pụtara ọnwụ nke abụọ.+ 15  Onye ọ bụla nke a na-edeghị aha ya n’akwụkwọ nke ndụ,+ a tụbara ya n’ime ọdọ ọkụ ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji