Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mkpughe 18:1-24

18  Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ nke ji ikike dị ukwuu si n’eluigwe na-agbadata;+ ebube ya mekwara ka ìhè dị n’ụwa.+  O wee jiri oké olu tie mkpu,+ sị: “Ọ dawo! Babịlọn Ukwu ahụ adawo,+ ọ ghọwokwa ebe obibi nke ndị mmụọ ọjọọ na ebe zoro ezo nke ume ọ bụla e kupụrụ ekupụ+ nke na-adịghị ọcha na ebe zoro ezo nke anụ ufe niile na-adịghị ọcha, nke a kpọkwara asị!+  N’ihi na mmanya nke iwe nke ịkwa iko ya enwetawo mba niile,+ ya na ndị eze nke ụwa kwakwara iko,+ ndị ahịa+ nke ụwa bakwara ọgaranya n’ihi ndụ okomoko gabigara ókè ọ na-ebi n’enweghị ihere ọ bụla.”+  M wee nụ ka olu ọzọ nke si n’eluigwe na-asị: “Ndị nke m,+ sinụ n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya,+ ma ọ bụrụkwa na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.  N’ihi na mmehie ya kpụkọtara ọnụ ruo n’eluigwe,+ Chineke echetawokwa ajọ omume ya.+  Mee ya dị ka ya onwe ya mere ndị ọzọ,+ meekwa ya okpukpu abụọ nke ihe o mere, ee, okpukpu abụọ nke ihe o mere ndị ọzọ;+ n’ime iko ahụ+ nke ọ gbanyere ihe ọṅụṅụ a gwara agwa, gbanyere ya okpukpu abụọ+ nke ihe ọṅụṅụ ahụ a gwara agwa.+  Otú ahụ o nyere onwe ya otuto, biekwa ndụ okomoko n’emeghị ihere, mekpaa ya ahụ́, meekwa ka o ruo uju otú ahụ.+ N’ihi na ọ na-asị n’obi ya, ‘Anọ m ọdụ dị ka eze nwaanyị,+ abụghịkwa m nwaanyị di ya nwụrụ,+ ọ dịghịkwa mgbe m ga-ahụ iru uju.’+  Ọ bụ ya mere ihe otiti ya+ ga-eji bịa n’otu ụbọchị, ya bụ, ọnwụ na iru uju na ụnwụ, a ga-akpọkwa ya ọkụ kpamkpam,+ n’ihi na Jehova Chineke, bụ́ onye kpere ya ikpe, dị ike.+  “Ndị eze+ ụwa, ndị ha na ya kwara iko, biekwa ndụ okomoko n’emeghị ihere, ga-akwara ya ákwá, tiekwa aka n’obi wee ruoro ya uju,+ mgbe ha ga na-ele anwụrụ ọkụ+ nke si n’ọkụ a na-akpọ ya, 10  ka ha guzo n’ebe dị anya n’ihi egwu ha na-atụ maka ahụ́ a na-emekpa ya ma na-asị,+ ‘Ewoo, ewoo, gị obodo ukwu,+ bụ́ Babịlọn, gị obodo dị ike, n’ihi na n’otu awa ka e mezuru ikpe e kpere gị!’+ 11  “Ndị ahịa+ nke ụwa na-akwara ya ákwá, na-erukwara ya uju,+ n’ihi na e nwekwaghị onye ga-azụ ngwá ahịa ha, 12  ngwá ahịa+ ha bụ́ ọlaedo na ọlaọcha na nkume dị oké ọnụ ahịa na nkume pel na ákwà linin ọma na ákwà odo odo na ákwà silk na ákwà uhie; na ihe ọ bụla bụ́ osisi na-esi ísì ụtọ na ụdị ihe ọ bụla e ji ọdụ́ mee, na ụdị ihe ọ bụla e ji osisi dị oké ọnụ ahịa mee, na ihe e ji ọla kọpa mee, na nke e ji ígwè mee, na nke e ji nkume mabụl mee;+ 13  tinyere sinamọn na ihe na-esi ísì ụtọ nke India na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ na mmanụ na-esi ísì ụtọ na frankinsens na mmanya na mmanụ oliv na ntụ ọka e gwere nke ọma na ọka wit na ehi na atụrụ, na ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya na ndị ohu na mkpụrụ obi bụ́ mmadụ.+ 14  Ee, mkpụrụ ọma nke gụrụ mkpụrụ obi gị agụụ+ adịkwaghị eru gị aka, ihe niile dị ụtọ na ihe mara oké mma ndị dị n’ebe ị nọ alawo n’iyi, ọ dịghịkwa mgbe ndị mmadụ ga-ahụ ha ọzọ.+ 15  “Ndị na-azụ ahịa+ ihe ndị a, bụ́ ndị nwaanyị ahụ mere ka ha baa ọgaranya, ga-eguzo n’ebe dị anya n’ihi egwu ha na-atụ mmekpa ahụ́ ya, ha ga-akwa ákwá, ruokwa uju,+ 16  na-asị, ‘Ewoo, ewoo—obodo ukwu ahụ,+ nke na-eyi ákwà linin ọma na nke odo odo na ákwà uhie, nke jikwa ihe ịchọ mma ọlaedo na nkume dị oké ọnụ ahịa na nkume pel+ chọọ onwe ya mma nke ukwuu, 17  n’ihi na n’otu awa ka a lara oké akụnụba dị otú ahụ n’iyi!’+ “Onyeisi ụgbọ mmiri ọ bụla na onye ọ bụla nke na-eme njem ụgbọ mmiri n’ebe ọ bụla,+ na ndị ọrụ ụgbọ mmiri na ndị niile na-enweta ihe ha ji ebi ndụ site n’oké osimiri, guzokwa n’ebe dị anya+ 18  wee tie mkpu, mgbe ha nọ na-ele anwụrụ ọkụ nke si n’ọkụ nke na-agba ya, ha wee sị, ‘Olee obodo yiri obodo ukwu a?’+ 19  Ha wụkwasịkwara ájá n’isi ha,+ tiekwa mkpu, na-akwa ákwá, na-erukwa uju,+ na-asị, ‘Ewoo, ewoo—obodo ukwu ahụ, bụ́ ebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri n’oké osimiri+ bara ọgaranya+ site n’oké akụnụba ya, n’ihi na n’otu awa ka a lara ya n’iyi!’+ 20  “Ṅụrịa ọṅụ, gị eluigwe,+ na unu ndị nsọ+ na unu ndịozi+ na unu ndị amụma n’ihi ihe mere ya, n’ihi na Chineke amawo ya ikpe ma nye ya ntaramahụhụ n’ihi unu!”+ 21  Otu mmụọ ozi dị ike wee buru otu nkume yiri nnukwu nkume igwe nri+ wee tụba ya n’oké osimiri,+ sị: “Otú a ka a ga-esi tụda obodo ukwu ahụ bụ́ Babịlọn ngwa ngwa, a gakwaghị ahụ ya ọzọ.+ 22  A gakwaghị anụ ụda egwú nke ndị na-agụ egwú, bụ́ ndị na-akpọ ụbọ, na ụda egwú nke ndị na-akụ egwú na nke ndị na-egbu ọjà na nke ndị na-afụ opi n’ime gị ọzọ ma ọlị,+ a gakwaghị ahụ omenkà nke na-arụ ụdị ọrụ ọ bụla n’ime gị ọzọ, a gakwaghị anụ ụda nkume igwe nri n’ime gị ọzọ, 23  ìhè oriọna agakwaghị enwu n’ime gị ọzọ ma ọlị, a gakwaghị anụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na nke nwaanyị a na-alụ ọhụrụ n’ime gị ọzọ;+ n’ihi na ndị ahịa gị+ bụ ndị nọ n’ọkwá ukwu+ n’ụwa, n’ihi na e ji mgbaasị+ ị na-eme duhie mba niile. 24  Ee, a hụrụ ọbara+ ndị amụma+ na nke ndị nsọ+ na nke ndị niile e gburu n’ụwa+ n’ime ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji