Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mkpughe 15:1-8

15  M wee hụ ihe ịrịba ama ọzọ+ n’eluigwe, nke dị egwu, dịkwa ebube, ya bụ, ndị mmụọ ozi asaa+ ndị ji ihe otiti asaa.+ Ndị a bụ ndị ikpeazụ, n’ihi na a ga-esi n’aka ha mee ka iwe+ Chineke dajụọ.+  M wee hụ ihe dị ka oké osimiri yiri enyo,+ nke ya na ọkụ gwakọtara, hụkwa ndị meriri+ anụ ọhịa ahụ na onyinyo ya+ na nọmba+ nke aha ya ka ha guzo n’akụkụ oké osimiri ahụ yiri enyo,+ ha ji ụbọ akwara+ nke Chineke n’aka.  Ha na-abụkwa abụ Mozis+ bụ́ ohu Chineke, na abụ Nwa Atụrụ ahụ,+ sị: “Ọrụ gị dị ukwuu ma dị ebube,+ Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Ụzọ gị ziri ezi, bụrụkwa eziokwu,+ Eze mgbe ebighị ebi.+  Olee onye na-agaghị atụ egwu gị,+ Jehova,+ ma too aha gị,+ n’ihi na ọ bụ naanị gị na-eguzosi ike n’ihe?+ N’ihi na mba niile ga-abịa kpọọ isiala n’ihu gị,+ n’ihi na e mewo ka iwu ezi omume gị pụta ìhè.”+  Mgbe ihe ndị a gasịrị, m wee hụ, e meghekwara ebe nsọ nke ụlọikwuu+ ịgba àmà+ n’eluigwe,+  ndị mmụọ ozi asaa ahụ,+ ndị ji ihe otiti asaa ahụ,+ wee si n’ebe nsọ ahụ pụta, ha yi ákwà linin dị ọcha nke na-enwu gbaa,+ jirikwa ájị̀ ọlaedo kee gburugburu obi ha.  Otu n’ime ihe anọ ahụ dị ndụ+ wee nye ndị mmụọ ozi asaa ahụ efere ọlaedo asaa jupụtara n’iwe Chineke,+ bụ́ onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi.+  Ebe nsọ ahụ wee jupụta n’anwụrụ ọkụ n’ihi ebube Chineke+ nakwa n’ihi ike ya, ọ dịghịkwa onye nwere ike ịbanye n’ebe nsọ ahụ ruo mgbe ihe otiti asaa+ nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ gwụsịrị.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji