Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mkpughe 1:1-20

1  Mkpughe+ nke si n’aka Jizọs Kraịst, nke Chineke kpugheere ya+ ka o gosi ndị ohu ya+ ihe ndị na-aghaghị ime n’oge na-adịghị anya.+ O wee ziga mmụọ ozi ya+ ma site n’aka ya gosi ya ohu ya bụ́ Jọn+ n’ụzọ ihe atụ,+  bụ́ onye gbara àmà banyere okwu Chineke kwuru+ nakwa banyere àmà nke Jizọs Kraịst gbara,+ ya bụ, banyere ihe niile ọ hụrụ.  Obi ụtọ+ na-adịrị onye na-agụpụta+ na ndị na-anụ okwu amụma nke a,+ na ndị na-eme ihe ndị e dere n’ime ya;+ n’ihi na oge ahụ a kara aka dị nso.+  Jọn na-edegara ọgbakọ asaa+ dị ná mpaghara Eshia akwụkwọ: Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo nke si n’aka “Onye ahụ dị adị na onye dịbu adị na onye na-abịa”+ dịrị unu, nke sikwa n’aka mmụọ asaa+ ahụ nọ n’ihu ocheeze ya,  nke sikwa n’aka Jizọs Kraịst, bụ́ “Onye Àmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi,”+ “Onye e bu ụzọ mụọ site ná ndị nwụrụ anwụ,”+ na “Onye Na-achị ndị eze nke ụwa.”+ Ka ebube na ike dịrị onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya,+ onye tọpụkwara anyị ná mmehie anyị site n’ọbara nke ya+  o wee mee ka anyị bụrụ otu alaeze,+ ndị nchụàjà+ nke Chineke ya bụ́ Nna ya—ee, ka ebube na ike dịrị ya ruo mgbe ebighị ebi.+ Amen.  Lee! Ọ na-abịa n’ígwé ojii,+ anya niile ga-ahụ ya,+ ndị mara ya ube+ ga-ahụkwa ya; ebo niile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi n’iru uju n’ihi ya.+ Ee, Amen.  “Abụ m Alfa na Omega,”+ ka Jehova Chineke kwuru, “Onye dị adị na onye dịbu adị na onye na-abịa,+ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”+  Mụ onwe m bụ́ Jọn, nwanna unu na onye unu na ya na-eketa òkè ná mkpagbu+ na alaeze+ na ntachi obi+ ná mmekọrịta anyị na Jizọs,+ wee nọrọ n’agwaetiti a na-akpọ Patmọs n’ihi ikwu banyere Chineke na ịgbara Jizọs àmà.+ 10  Site n’ike mmụọ nsọ,+ anọrọ m+ n’ụbọchị Onyenwe anyị,+ m wee nụ olu nke na-adasi ike+ ka opi n’azụ m. 11  Olu ahụ sịrị: “Dee+ ihe ị na-ahụ n’akwụkwọ mpịakọta ma zigara ya ọgbakọ asaa ahụ,+ ya bụ, nke dị n’Efesọs,+ na nke dị na Smeana,+ na nke dị na Pagamọm,+ na nke dị na Tayataịra,+ na nke dị na Sadis,+ na nke dị na Filadelfịa,+ na nke dị na Leodisia.”+ 12  M wee tụgharịa ka m hụ onye nwe olu ahụ na-agwa m okwu. Mgbe m tụgharịrị, ahụrụ m ihe ndọba oriọna asaa e ji ọlaedo rụọ,+ 13  na onye yiri nwa nke mmadụ+ n’etiti ihe ndọba oriọna ndị ahụ. O yi uwe gbadaruru ya n’ụkwụ, keekwa ájị̀ ọlaedo n’obi. 14  Isi ya na ntutu isi ya na-achakwa ọcha+ dị ka owu ọcha, dị ka snoo, anya ya dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu;+ 15  ụkwụ ya dịkwa ka ezigbo ọla kọpa+ nke na-egbukepụ n’oké ọkụ; olu ya+ na-ada ka ọtụtụ mmiri. 16  Ọ chịkwa kpakpando asaa n’aka nri ya,+ otu ogologo mma agha dị nkọ nke nwere ihu abụọ+ sikwa n’ọnụ ya pụta, ihu ya dịkwa ka anyanwụ nke na-achasi ike.+ 17  Mgbe m hụrụ ya, m dara wee dị ka m nwụrụ anwụ n’ụkwụ ya. O wee bikwasị m aka nri ya, sị: “Atụla egwu.+ Abụ m Onye Mbụ+ na Onye Ikpeazụ,+ 18  na onye dị ndụ;+ aghọkwara m onye nwụrụ anwụ,+ ma, lee! ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi,+ achịkwa m mkpịsị ugodi nke ọnwụ+ na nke Hedis.+ 19  Ya mere, dee ihe ndị ị hụrụ n’akwụkwọ, tinyere ihe ndị dị adị na ihe ndị ga-eme mgbe ihe ndị a gasịrị.+ 20  Banyere ihe nzuzo dị nsọ nke kpakpando asaa+ ahụ ị hụrụ n’aka nri m, nakwa banyere ihe ndọba oriọna asaa ahụ e ji ọlaedo rụọ:+ Kpakpando asaa ahụ pụtara ndị mmụọ ozi nke ọgbakọ asaa ahụ, ihe ndọba oriọna asaa ahụ pụtara ọgbakọ asaa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji