Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 9:1-38

9  Ya mere, ọ banyere n’ụgbọ mmiri wee gafee n’ofe nke ọzọ wee banye n’obodo ya.+  Ma, lee! ha na-ebutere ya otu onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, nke dina n’ihe ndina.+ Mgbe Jizọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ: “Nwee obi ike, nwa m; a gbagharawo gị mmehie gị.”+  Ma, lee! ụfọdụ n’ime ndị odeakwụkwọ kwuru n’obi ha, sị: “Onye a na-ekwulu Chineke.”+  Ma ebe Jizọs maara ihe ha na-eche,+ ọ sịrị: “Gịnị mere unu ji na-eche ihe dị njọ n’obi unu?+  Dị ka ihe atụ, olee nke ka mfe, ọ̀ bụ ịsị, A gbagharawo gị mmehie gị, ka ọ̀ bụ ịsị, Bilie gawa ije?+  Otú ọ dị, ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ nwere ikike n’ụwa ịgbaghara mmehie+—” mgbe ahụ, ọ gwara onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie, buru ihe ndina gị laa n’ụlọ gị.”+  O wee bilie laa n’ụlọ ya.  Mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ ihe a, egwu jidere ha, ha wee nye Chineke otuto,+ bụ́ onye nyere ụmụ mmadụ ikike dị otú ahụ.+  Mgbe Jizọs sikwa ebe ahụ na-agafe, ọ hụrụ otu onye a na-akpọ Matiu ka ọ nọ ọdụ n’ụlọ a na-anakọta ụtụ isi, o wee sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ O wee bilie, soro ya.+ 10  E mesịa, mgbe ọ nọ na-eri ihe na tebụl n’ime ụlọ,+ lee! ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie bịara wee soro Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri ihe. 11  Ma mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha malitere ịgwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gịnị mere onye ozizi unu ji na-eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie eri ihe?”+ 12  Mgbe ọ nụrụ ihe ha kwuru, ọ sịrị: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma,+ kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu. 13  Ya mere, gaanụ mata ihe ihe a pụtara, ‘Achọrọ m ebere, ọ bụghị àjà.’+ N’ihi na ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.” 14  Ndị na-eso ụzọ Jọn wee bịakwute ya, jụọ ya, sị: “Gịnị mere anyị na ndị Farisii ji ebu ọnụ ma ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ?”+ 15  Jizọs wee sị ha: “Ndị enyi nke nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ enweghị ihe mere ha ga-eji ruo uju mgbe ha na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ,+ ka hà nwere? Ma ụbọchị na-abịa mgbe a ga-akpọpụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ+ n’ebe ha nọ, ọ bụ mgbe ahụ ka ha ga-ebu ọnụ.+ 16  Ọ dịghị onye na-adụnye ibé ákwà ọhụrụ n’uwe elu mere ochie; n’ihi na ike ya dum ga-eme ka uwe elu ahụ dọkaa, ọ ga-adọwa wee ka njọ.+ 17  Ndị mmadụ adịghịkwa agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya mere ochie; ma ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, karama akpụkpọ mmanya ahụ na-agbawa, mmanya ahụ na-awụfukwa, karama akpụkpọ mmanya ahụ ebibiekwa.+ Kama ndị mmadụ na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya ọhụrụ, ha abụọ na-adịgidekwa.”+ 18  Mgbe ọ na-akọrọ ha ihe ndị a, lee! otu onye na-achị achị+ nke bịakwutere ya malitere ịkpọrọ ya isiala,+ sị: “Ada m ga-anwụworị ugbu a;+ ma bịa bikwasị ya aka, ọ ga-adịkwa ndụ.”+ 19  Ya mere, Jizọs biliri wee soro ya; ndị na-eso ụzọ ya mekwara otú ahụ. 20  Ma, lee! otu nwaanyị na-arịa ọrịa oruru ọbara+ kemgbe afọ iri na abụọ bịara ya n’azụ wee bitụ ọnụ ọnụ uwe elu ya aka;+ 21  n’ihi na ọ nọ na-agwa onwe ya, sị: “Ọ bụrụ na m bitụ naanị uwe elu ya aka, m ga-agbake.”+ 22  Jizọs tụgharịrị, hụ ya wee sị: “Nwee obi ike, nwa m nwaanyị; okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma.”+ Malite n’oge awa ahụ, ahụ́ dịrị nwaanyị ahụ mma.+ 23  Mgbe ọ batara n’ụlọ onye ahụ na-achị achị+ ma hụ ndị na-egbu ọjà nakwa ìgwè mmadụ ka ha nọ n’ọgba aghara,+ 24  Jizọs malitere ịsị: “Sinụ n’ebe a pụọ, n’ihi na nwata nwaanyị a anwụghị anwụ, kama ọ na-ehi ụra.”+ Ha wee malite ịchị ya ọchị, na-akwa ya emo.+ 25  Ozugbo a chụpụrụ ìgwè mmadụ ahụ n’èzí, ọ banyere wee sere ya n’aka,+ nwata nwaanyị ahụ wee bilie.+ 26  N’ezie, okwu banyere ihe a gbasara n’ógbè ahụ dum. 27  Mgbe Jizọs si ebe ahụ na-agafe, ndị ìsì abụọ+ sooro ya, na-eti mkpu, sị: “Meere anyị ebere,+ Nwa Devid.” 28  Mgbe Jizọs banyere n’ime ụlọ, ndị ìsì ahụ bịakwutere ya, o wee jụọ ha, sị: “Ùnu nwere okwukwe+ na m pụrụ ime ihe a?” Ha azaa ya, sị: “Ee, Onyenwe anyị.” 29  O wee bitụ ha aka n’anya,+ sị: “Ya meere unu dị ka okwukwe unu si dị.” 30  E wee meghee anya ha. Jizọs nyesikwara ha iwu ike, sị: “Hụnụ na ọ dịghị onye maara banyere ya.”+ 31  Ma mgbe ha pụrụ n’èzí, ha kọsara ihe banyere ya n’ógbè ahụ dum.+ 32  Mgbe ha na-apụkwa, lee! ndị mmadụ kpọtaara ya otu onye ogbi nke mmụọ ọjọọ ji;+ 33  mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ kwuru okwu.+ O wee ju ìgwè mmadụ ahụ anya,+ ha wee sị: “A hụtụbeghị ụdị ihe a n’Izrel.” 34  Ma ndị Farisii malitere ịsị: “Ọ bụ ike onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 35  Jizọs wee malite ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ ma na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla.+ 36  Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko+ n’ebe ha nọ, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ,* na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ 37  Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Ee, ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole.+ 38  Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Mt 9:36*  Ma ọ bụ, “a na-emegbu ha.”