Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 3:1-17

3  N’ụbọchị ndị ahụ, Jọn Onye Na-eme Baptizim+ bịara na-ekwusa n’ala ịkpa+ nke Judia,  sị: “Chegharịanụ,+ n’ihi na alaeze eluigwe eruwo nso.”+  N’eziokwu, nke a bụ onye ahụ e kwuru banyere ya site n’ọnụ Aịzaya onye amụma+ n’okwu ndị a: “Geenụ ntị! E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị, ‘Kwadebenụ+ ụzọ Jehova! Meenụ ka okporo ụzọ ya kwụrụ ọtọ.’”  Ma Jọn nke a yi uwe e ji ajị kamel mee,+ keekwa ájị̀ akpụkpọ anụ+ n’úkwù; nri ya bụkwa igurube+ na mmanụ aṅụ ọhịa.+  Mgbe ahụ, ndị nọ na Jeruselem na Judia dum na obodo dum dị gburugburu Osimiri Jọdan wee na-agakwuru ya,  o wee na-eme ndị mmadụ baptizim n’Osimiri Jọdan,+ ha wee na-ekwupụta mmehie ha n’ihu ọha.  Mgbe ọ hụrụ ọtụtụ n’ime ndị Farisii na ndị Sadusii+ ka ha na-abịa n’ebe ahụ a na-eme baptizim, ọ sịrị ha: “Unu ụmụ ajụala,+ ònye gwara unu ka unu gbanahụ ọnụma ahụ nke na-abịa?+  Ya mere, mịanụ mkpụrụ kwesịrị nchegharị;+  unu asịkwala n’ime onwe unu, ‘Ebreham bụ nna anyị.’+ N’ihi na ana m asị unu na Chineke nwere ike ime ka Ebreham nweta ụmụ+ site na nkume ndị a. 10  Anyụike+ atọgbọrọworị na mgbọrọgwụ osisi; n’ihi ya, a ga-egbutu osisi+ ọ bụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ, tụbakwa ya n’ọkụ.+ 11  Mụ onwe m ji mmiri na-eme unu baptizim+ n’ihi nchegharị unu;+ ma onye ahụ nke na-abịa+ n’azụ m ka m ike, onye m na-erughị eru iyipụ akpụkpọ ụkwụ ya.+ Onye ahụ ga-eji mmụọ nsọ+ na ọkụ+ mee unu baptizim. 12  O ji shọvel o ji afụcha ihe n’aka, ọ ga-edebekwa ebe nzọcha mkpụrụ ya ọcha nke ọma, ọ ga-ekpokọtakwa ọka wit ya n’ime ụlọ nkwakọba ihe,+ ma ọ ga-esu igbogbo ya ọkụ+ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.” 13  Jizọs wee si Galili+ bịakwute Jọn na Jọdan, ka o mee ya baptizim.+ 14  Ma Jọn nwara igbochi ya, sị: “Ọ bụ m ka ọ dị mkpa ka i mee baptizim, ọ̀ bụzi gị na-abịakwute m?” 15  Jizọs zara ya, sị: “Ka ọ dị otú a n’oge a, n’ihi na otú a ka o kwesịrị ekwesị ka anyị mezuo ihe niile bụ́ ezi omume.”+ Mgbe ahụ, ọ kwụsịrị igbochi ya. 16  Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, o si na mmiri ahụ bilie ozugbo; ma, lee! eluigwe meghere,+ o wee hụ ka mmụọ Chineke na-efedata dị ka nduru+ wee bekwasị ya.+ 17  Lee! Otu olu+ sikwa n’eluigwe kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m,+ onye m hụrụ n’anya,+ onye ihe ya masịrị m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji