Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 27:1-66

27  Mgbe o ruru n’ụtụtụ, ndị isi nchụàjà na ndị okenye niile nke ndị Juu gbaara Jizọs izu ka ha gbuo ya.+  Mgbe ha kesịrị ya agbụ, ha kpụụrụ ya pụọ, nyefee ya n’aka Paịlet bụ́ gọvanọ.+  Mgbe Judas, onye raara ya nye, hụrụ na a mawo Jizọs ikpe ọnwụ, ọ kwara arịrị ma chịghachiri ndị isi nchụàjà na ndị okenye mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ,+  sị: “Emehiere m mgbe m raara ọbara ezi omume nye.”+ Ha wee sị: “Nke ahụ ọ̀ gbasara anyị? Nke ahụ bụ okwu aka gị!”+  O wee wụsa mkpụrụ ego ọlaọcha ndị ahụ n’ụlọ nsọ ma pụọ, gaa kwụgbuo onwe ya.+  Ma ndị isi nchụàjà ahụ chịịrị mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ wee sị: “Iwu akwadoghị ịwụnye ha n’ebe dị nsọ a na-edebe akụ̀, n’ihi na ọ bụ ego ọbara.”  Mgbe ha gbasịrị izu, ha ji ya zụọ ala onye ọkpụite, ebe ha ga na-eli ndị bịara abịa.  Ọ bụ ya mere e ji akpọ ala ahụ “Ala Ọbara”+ ruo taa.  Mgbe ahụ, e mezuru ihe e kwuru site n’ọnụ Jeremaya onye amụma, sị: “Ha wee chịrị mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ,+ bụ́ ego ole a ga-akwụ n’isi onye ahụ e kwuru ọnụ ahịa ya, bụ́ onye ụfọdụ n’ime ụmụ Izrel kwuru ọnụ ahịa ya, 10  ha wee were ya zụta ala onye ọkpụite,+ dị ka ihe Jehova nyere m n’iwu si dị.” 11  Ma ugbu a, Jizọs guzo n’ihu gọvanọ; gọvanọ ahụ wee jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ eze ndị Juu?”+ Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụ gị kwuru ya.”+ 12  Ma mgbe ndị isi nchụàjà na ndị okenye na-ebo ya ebubo,+ ọ zaghị ihe ọ bụla.+ 13  Paịlet wee sị ya: “Ị́ naghị anụ ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị?”+ 14  Ma ọ zaghị ya ihe ọ bụla, ee e, ọbụna otu mkpụrụ okwu, nke mere na o juru gọvanọ ahụ anya nke ukwuu.+ 15  Mgbe ọ bụla a na-eme ememme a, ihe gọvanọ ahụ na-emekarị bụ ịhapụrụ ìgwè mmadụ ahụ otu onye mkpọrọ, ya bụ, onye ha chọrọ.+ 16  N’oge ahụ, ha ji otu nwoke eji, nke bụ́ onye mkpọrọ e ji ihe ọjọọ mara, onye a na-akpọ Barabas.+ 17  Ya mere, mgbe ha zukọtara, Paịlet sịrị ha: “Olee onye unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ̀ bụ Barabas ka ọ̀ bụ Jizọs, onye a sịrị na ọ bụ Kraịst?”+ 18  N’ihi na ọ maara na ọ bụ anyaụfụ+ mere ha ji nyefee ya n’aka ya.+ 19  Mgbe ọ nọkwa ọdụ n’oche ikpe, nwunye ya ziteere ya ozi, sị: “Etinyela aka n’okwu onye ezi omume ahụ,+ n’ihi na ahụsiri m anya nke ukwuu taa ná nrọ+ n’ihi ya.” 20  Ma ndị isi nchụàjà na ndị okenye kpaliri ìgwè mmadụ ahụ ikwu ka a hapụrụ ha Barabas,+ ma ka e gbuo Jizọs. 21  Ma gọvanọ ahụ zara ha, sị: “Ònye n’ime ha abụọ ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha wee sị: “Ọ bụ Barabas.”+ 22  Paịlet wee sị ha: “Gịnịzi ka m ga-eme Jizọs, onye a sịrị na ọ bụ Kraịst?” Ha niile wee sị: “Ka a kpọgide ya n’osisi!”+ 23  O wee sị: “N’ihi gịnị, olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha nọ na-etikwu mkpu, sị: “Ka a kpọgide ya n’osisi!”+ 24  Mgbe Paịlet hụrụ na ọ dịghị ihe ọma si na ya pụta, ma, kama nke ahụ, ụzụ na-arị ibe ya elu, o weere mmiri+ kwọọ aka n’ihu ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Aka m dị ọcha n’ebe ọbara nwoke a dị. Unu onwe unu aghaghị ịhụ maka ya.” 25  Ìgwè mmadụ ahụ niile wee zaa, sị: “Ka ọbara ya dị n’isi anyị, dịkwa n’isi ụmụ anyị.”+ 26  O wee hapụrụ ha Barabas, ma o mere ka a pịa Jizọs ụtarị+ wee nyefee ya ka a kpọgide ya n’osisi.+ 27  Mgbe ahụ, ndị agha gọvanọ kpọọrọ Jizọs banye n’obí gọvanọ ma mee ka ìgwè ndị agha dum zukọọ n’ebe ọ nọ.+ 28  Mgbe ha yipụrụ ya ákwà, ha yiwere ya uwe mgbokwasị na-acha uhie uhie,+ 29  ha wee jiri ogwu kpaa okpueze, kpuwe ya n’isi, nyekwa ya okporo ahịhịa amị n’aka nri ya. Ha gburu ikpere n’ala n’ihu ya, jiri ya mee ihe ọchị,+ sị: “Ndeewo, gị Eze ndị Juu!”+ 30  Ha wee gbụọ ya ọnụ mmiri,+ werekwa okporo ahịhịa amị ahụ malite iji ya na-eti ya n’isi. 31  N’ikpeazụ, mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị,+ ha yipụrụ ya ákwà mgbokwasị ahụ ma yiwe ya uwe elu ya, durukwa ya pụọ ịga kpọgide ya n’osisi.+ 32  Mgbe ha na-apụ, ha hụrụ otu onye Saịrini nke aha ya bụ Saịmọn.+ Ha manyere nwoke a ka o buru osisi ịta ahụhụ Jizọs. 33  Mgbe ha bịarutere ebe a na-akpọ Gọlgọta,+ ya bụ, Ebe Okpokoro Isi, 34  ha nyere Jizọs mmanya a gwara ihe na-elu ilu+ ka ọ ṅụọ; ma, mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị aṅụ ya.+ 35  Mgbe ha kpọgidere ya n’osisi,+ ha kere uwe elu ya+ site n’ife nza,+ 36  ha wee nọdụ ala, na-eche ya nche n’ebe ahụ. 37  Ha debekwara n’elu isi ya ebubo e boro ya, nke e dere ede, sị: “Onye a bụ Jizọs, Eze ndị Juu.”+ 38  Mgbe ahụ, a kpọgidere ya na mmadụ abụọ na-apụnara mmadụ ihe n’osisi, otu onye n’aka nri ya, otu onye n’aka ekpe ya.+ 39  Ya mere, ndị na-agafe agafe malitere ikwujọ ya,+ na-efufe+ isi ha, 40  na-asị: “Gị onye ga-akwatu ụlọ nsọ,+ onye ga-ewukwa ya n’ụbọchị atọ, zọpụta onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si n’osisi ịta ahụhụ ahụ rịdata!”+ 41  Otú ahụkwa ka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye malitere iji ya na-eme ihe ọchị, sị:+ 42  “Ọ zọpụtara ndị ọzọ; ọ pụghị ịzọpụta onwe ya! Ọ bụ Eze+ Izrel; ya si n’osisi ịta ahụhụ rịdata, anyị ga-ekwerekwa na ya.+ 43  Ọ tụkwasịrị Chineke obi; Ya napụta+ ya ugbu a ma ọ bụrụ na ihe ya masịrị Ya, n’ihi na ọ sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke.’”+ 44  Otú ahụkwa ka ọbụna ndị ahụ na-apụnara mmadụ ihe a kpọgidekọrọ ya na ha n’osisi malitere ịkọcha ya.+ 45  Ọchịchịrị gbara+ n’ala ahụ dum malite n’oge awa nke isii* ruo n’oge awa nke itoolu.*+ 46  N’ihe dị ka n’awa nke itoolu, Jizọs tiri mkpu n’oké olu, sị: “Eli, Eli, lama sabaktani?” ya bụ, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?”+ 47  Mgbe ụfọdụ n’ime ndị guzo n’ebe ahụ nụrụ ihe a, ha malitere ịsị: “Nwoke a na-akpọ Ịlaịja.”+ 48  Ozugbo ahụ, otu onye n’ime ha gbaara ọsọ were ogbo, mikpuo ya n’ime mmanya gbara ụka,+ dokwasịkwa ya n’okporo amị wee malite inye ya ka ọ ṅụọ.+ 49  Ma ndị ọzọ n’ime ha sịrị: “Hapụnụ ya! Ka anyị hụ ma Ịlaịja ọ̀ ga-abịa zọpụta ya.”+ [Nwoke ọzọ buuru ube maa ya n’akụkụ, ọbara na mmiri wee gbapụta.]*+ 50  Jizọs tiri mkpu ọzọ n’oké olu, wee kubie ume.+ 51  Ma, lee! ákwà mgbochi+ nke ebe nsọ dọwara ụzọ abụọ, malite n’elu ruo n’ala,+ ala wee maa jijiji, oké nkume wee gbawasịa.+ 52  Ili ncheta wee meghesịa, ọtụtụ ozu nke ndị nsọ bụ́ ndị dara n’ụra dapụtara, 53  (ndị mmadụ si n’ebe ili ncheta ndị ahụ dị pụta wee banye n’obodo nsọ mgbe a kpọlitesịrị ya,)+ ọtụtụ mmadụ hụkwara ha anya. 54  Ma mgbe onyeisi ndị agha ahụ na ndị ha na ya na-eche Jizọs nche hụrụ ala ọma jijiji ahụ na ihe ndị na-emenụ, ha tụrụ egwu nke ukwuu, sị: “N’ezie, onye a bụ Ọkpara Chineke.”+ 55  Ọtụtụ ndị inyom nọkwa n’ebe ahụ, ha nọ n’ebe dịtụ anya na-ele anya.+ Ha bụ ndị si Galili soro Jizọs ka ha wee na-ejere ya ozi;+ 56  otu n’ime ha bụ Meri Magdalin, tinyere Meri nne Jems na Josis, na nne ụmụ Zebedi.+ 57  Ma mgbe o ruru mgbede, otu onye Arimatia nke bara ọgaranya bịara. Aha ya bụ Josef, onye bụkwa onye na-eso ụzọ Jizọs.+ 58  Nwoke a gakwuuru Paịlet ma rịọ ka e bunye ya ozu Jizọs.+ Paịlet wee nye iwu ka e bunye ya ozu ahụ.+ 59  Josef wee buru ozu ahụ, fụchie ya ákwà linin ọma dị ọcha,+ 60  liekwa ya n’ili ncheta ọhụrụ ya,+ nke o gwuru n’oké nkume. Mgbe ọ kwaara nnukwu nkume kwachie ọnụ ụzọ ili ncheta ahụ, ọ lara.+ 61  Ma Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọgidere n’ebe ahụ, nọdụ ala n’ihu ili ahụ.+ 62  N’echi ya, nke bụ́ mgbe Nkwadebe+ gasịrị, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii zukọtara n’ihu Paịlet, 63  sị: “Nna anyị ukwu, anyị chetara na onye nduhie ahụ kwuru mgbe ọ ka nọ ndụ, sị, ‘Mgbe ụbọchị atọ gasịrị,+ a ga-akpọlite m.’ 64  Ya mere, nye iwu ka a na-eche ili ahụ nche ruo n’ụbọchị nke atọ, ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịbịa zuru+ ya wee gwa ndị mmadụ, sị, ‘E mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie!’ nduhie nke ikpeazụ a ga-akakwa nke mbụ njọ.” 65  Paịlet wee sị ha: “Unu nwere ndị nche.+ Gaanụ chee ya nche otú ọ bụla unu maara unu ga-esi chee ya.” 66  Ha wee gaa mechisie ili ahụ ike, kaa nkume ahụ akara,+ debekwa ndị nche na ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Mt 27:45*  Ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
Mt 27:45*  Ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
Mt 27:49*  Lee ihe e dere n’ala ala peeji na Mt 16:3.