Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 22:1-46

22  Jizọs ji ihe atụ zaa ha ọzọ, sị:+  “Alaeze eluigwe dị ka otu nwoke, bụ́ eze, nke meere nwa ya nwoke oriri alụmdi na nwunye.+  O wee zipụ ndị ohu ya ka ha gaa kpọọ ndị a kpọrọ òkù ịbịa oriri alụmdi na nwunye ahụ,+ ma ha ekweghị ịbịa.+  O zipụkwara ndị ohu ya ndị ọzọ,+ sị, ‘Gwanụ ndị ahụ a kpọrọ òkù, sị: “Lee! Akwadebewo m nri ehihie m,+ e gbuwo oké ehi na anụ m ndị mara abụba, a kwadebewokwa ihe niile. Bịanụ n’oriri alụmdi na nwunye a.”’+  Ma ha ejighị ya kpọrọ ihe, ha wee gawa, otu onye n’ubi ya, onye ọzọ n’ahịa ya;+  ma ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbuo ha.+  “Ma eze ahụ were iwe wee ziga ụsụụ ndị agha ya ma bibie ndị ahụ na-egbu ọchụ, gbaakwa obodo ha ọkụ.+  O wee sị ndị ohu ya, ‘N’ezie, a kwadebewo oriri alụmdi na nwunye a, ma ndị a kpọrọ òkù erughị eru.+  Ya mere, gaanụ n’okporo ụzọ ndị e si apụ n’obodo, kpọọkwanụ onye ọ bụla unu hụrụ ka ọ bịa oriri alụmdi na nwunye a.’+ 10  Ya mere, ndị ohu ahụ gara n’okporo ụzọ wee kpọkọọ ndị niile ha hụrụ, ma ndị ọjọọ ma ndị ọma;+ ọnụ ụlọ e ji eme ememme agbamakwụkwọ ahụ wee jupụta ná ndị nọ na-eri ihe+ na tebụl. 11  “Mgbe eze ahụ batara inyocha ndị ọbịa ahụ, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe alụmdi na nwunye.+ 12  O wee sị ya, ‘Enyi, olee otú i si bata n’ebe a n’eyighị uwe alụmdi na nwunye?’+ O nyeghị ya ọnụ okwu. 13  Mgbe ahụ, eze ahụ gwara ndị na-ejere ya ozi, sị, ‘Keenụ ya agbụ ụkwụ na aka ma tụpụ ya n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ọ ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.’+ 14  “N’ihi na ndị a kpọrọ òkù dị ọtụtụ, ma ole na ole ka a họọrọ.”+ 15  Mgbe ahụ, ndị Farisii gara wee gbaa izu ka ha jide ya site n’okwu ọnụ ya.+ 16  Ha wee zigara ya ndị na-eso ụzọ ha, tinyere ndị òtù Herọd,+ wee sị ya: “Onye Ozizi, anyị maara na ị na-ekwu eziokwu, ị na-ezikwa ụzọ Chineke n’eziokwu, ị dịghịkwa asọ onye ọ bụla anya, n’ihi na ị dịghị ele otú ndị mmadụ dị n’elu ahụ́ anya.+ 17  Ya mere, gwa anyị, Gịnị ka i chere? Iwu ọ̀ kwadoro ịkwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na ọ kwadoghị ya?”+ 18  Ma ebe Jizọs maara ajọ omume ha, ọ sịrị: “Gịnị mere unu ji na-ele m ule, ndị ihu abụọ?+ 19  Gosinụ m mkpụrụ ego e ji atụ ụtụ isi.” Ha wee wetara ya otu mkpụrụ ego dinarịọs. 20  O wee sị ha: “Ihe a ọ̀ bụ onyinyo onye na aha onye?”+ 21  Ha wee sị: “Ọ bụ nke Siza.” Mgbe ahụ, ọ sịrị ha: “Ya mere, kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”+ 22  Mgbe ha nụrụ ya, ọ tụrụ ha n’anya, ha wee hapụ ya pụọ.+ 23  N’ụbọchị ahụ, ndị Sadusii, bụ́ ndị na-asị na mbilite n’ọnwụ adịghị, bịakwutere ya wee jụọ ya, sị:+ 24  “Onye Ozizi, Mozis sịrị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’amụtaghị ụmụ, nwanne ya nwoke aghaghị ịkpọrọ nwunye ya lụwa wee mụtara nwanne ya nwoke nwa.’+ 25  Ma e nwere ụmụnne asaa n’etiti anyị; nke mbụ lụrụ nwunye ma nwụọ, ebe ọ na-amụtaghị nwa, ọ hapụụrụ nwanne ya nwoke nwunye ya.+ 26  Otú ahụ ka o mekwara onye nke abụọ, meekwa onye nke atọ, ruo mgbe o mechara mmadụ asaa ahụ niile.+ 27  N’ikpeazụ, nwaanyị ahụ nwụrụ. 28  Ya mere, ná mbilite n’ọnwụ, ònye n’ime mmadụ asaa ahụ ka ọ ga-abụ nwunye ya? Ebe ọ bụ na ha niile lụrụ ya.”+ 29  Jizọs wee zaa ha, sị: “Unu ehiewo ụzọ, n’ihi na unu amaghị Akwụkwọ Nsọ, unu amaghịkwa ike nke Chineke;+ 30  n’ihi na ná mbilite n’ọnwụ, ndị ikom agaghị alụ nwunye,+ a gaghịkwa eke ndị inyom di, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe. 31  Banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ̀ bụ na unu agụghị ihe Chineke gwara unu, sị,+ 32  ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb’?+ Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama nke ndị dị ndụ.”+ 33  Mgbe ìgwè mmadụ ahụ nụrụ ya, otu o si ezi ihe juru ha anya.+ 34  Mgbe ndị Farisii nụrụ na o mewo ka ọnụ mechie ndị Sadusii, ha bịakọtara ọnụ dị ka otu ìgwè. 35  Iji nwalee ya, otu n’ime ha, bụ́ onye maara Iwu,+ jụrụ ya, sị: 36  “Onye Ozizi, olee iwu kasị ukwuu n’ime Iwu ahụ?”+ 37  O wee sị ya: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’+ 38  Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ. 39  Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’+ 40  Ọ bụ n’iwu abụọ a ka Iwu ahụ dum na akwụkwọ Ndị Amụma dabeere.”+ 41  Mgbe ndị Farisii zukọtara, Jizọs jụrụ ha, sị:+ 42  “Gịnị ka unu chere banyere Kraịst? Nwa ònye ka ọ bụ?” Ha sịrị ya: “Nwa Devid.”+ 43  O wee sị ha: “Oleezi otú o si bụrụ na Devid si n’ike mmụọ nsọ+ kpọọ ya ‘Onyenwe m,’ sị, 44  ‘Jehova gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m debere ndị iro gị n’okpuru ụkwụ gị”’?+ 45  Ya mere, ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe m,’ olee otú o si bụrụ nwa ya?”+ 46  Ọ dịghị onye nwere ike ịza ya okwu ọ bụla, ọ dịghịkwa onye ọ bụla nwara ịjụ ya ajụjụ ọzọ malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji