Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 21:1-46

21  Mgbe ha ruru Jeruselem nso wee bịarute Betfeji, n’Ugwu Oliv, Jizọs zipụrụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya,+  sị ha: “Gaanụ n’obodo nta ahụ unu na-ahụ, ozugbo ahụ, unu ga-ahụ ịnyịnya ibu e liwere eliwe, na nwa ịnyịnya ibu ya na ya nọ; tọpụnụ ha, kpụtara m ha.+  Ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa unu ihe ọ bụla, sịnụ ya, ‘Ha dị Onyenwe anyị mkpa.’ Mgbe ahụ, ọ ga-ahapụ ha ka unu kpụrụ ha.”  Ihe a mere n’ezie ka e wee mezuo ihe e si n’ọnụ onye amụma kwuo, sị:  “Sịnụ ada bụ́ Zayọn, ‘Lee! Eze gị na-abịakwute gị,+ bụ́ onye dị nwayọọ n’obi,+ ọ nọkwasịrị n’ịnyịnya ibu, ee, nwa ịnyịnya ibu, nwa nke anụ na-ebu ibu.’”+  Ya mere, ndị na-eso ụzọ ya ahụ gara mee dị nnọọ ka Jizọs nyere ha iwu.  Ha wee kpụta ịnyịnya ibu ahụ na nwa ya, ha wee wụkwasị uwe elu ha n’elu ha, o wee nọkwasị ya.+  Ihe ka ọtụtụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ gbasara uwe elu ha+ n’okporo ụzọ, ebe ndị ọzọ malitere igbute alaka osisi ma na-atụsa ha n’okporo ụzọ.+  Ma ìgwè mmadụ ahụ, ma ndị na-aga ya n’ihu ma ndị na-eso ya n’azụ, nọ na-eti mkpu, sị: “Biko, zọpụta+ Nwa Devid!+ Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova bụ!+ Zọpụta ya, biko, n’ebe kasị elu!”+ 10  Mgbe ọ banyere na Jeruselem,+ obodo ahụ dum malitere ịgba aghara, ha ana-asị: “Ònye bụ onye a?” 11  Ìgwè mmadụ ahụ nọ na-akọ, sị, “Onye a bụ Jizọs onye amụma,+ onye Nazaret nke Galili!” 12  Jizọs wee banye n’ime ụlọ nsọ ma chụpụ ndị niile na-ere ma na-azụ ahịa n’ime ụlọ nsọ ahụ, o kpukwara tebụl nke ndị na-agbanwe ego na oche nke ndị na-ere nduru ihu.+ 13  O wee sị ha: “E dere, sị, ‘A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere,’+ ma unu na-eme ya ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.”+ 14  Ndị ìsì na ndị ngwọrọ bịakwutekwara ya n’ụlọ nsọ ahụ, o wee gwọọ ha. 15  Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ hụrụ ihe ịtụnanya ndị o mere+ nakwa ụmụ okoro ndị na-eti mkpu n’ụlọ nsọ, sị: “Biko, zọpụta+ Nwa Devid!”+ iwe were ha, 16  ha wee sị ya: “Ị̀ na-anụ ihe ndị a na-ekwu?” Jizọs sịrị ha: “Ee. Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị+ ihe e dere, sị, ‘I mewo ka otuto si n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara pụta’?”+ 17  Mgbe ọ hapụrụ ha, ọ pụrụ n’obodo ahụ wee gawa Betani, rahụkwa n’ebe ahụ.+ 18  Mgbe ọ na-alọghachi n’obodo ahụ n’isi ụtụtụ, agụụ gụwara ya.+ 19  O wee hụ otu osisi fig n’akụkụ okporo ụzọ wee jee na ya, ma ọ dịghị ihe ọ hụrụ+ n’elu ya ma e wezụga naanị akwụkwọ, o wee sị ya: “Amịla mkpụrụ ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.”+ Osisi fig ahụ wee kpọnwụọ ozugbo. 20  Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, o juru ha anya, ha wee na-asị: “Olee otú osisi fig a si kpọnwụọ ozugbo?”+ 21  Jizọs zara ha, sị: “N’ezie, ana m asị unu, A sị nnọọ na unu nwere okwukwe ma ghara inwe obi abụọ,+ ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe m mere osisi fig a, kama, ọ bụrụ na unu asị ugwu a, ‘Ka e bulie gị tụba gị n’oké osimiri,’ ọ ga-eme.+ 22  Ihe niile unu na-arịọ n’ekpere ma nwee okwukwe, unu ga-enweta ha.”+ 23  Mgbe ọ banyere n’ime ụlọ nsọ, ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya ka ọ na-ezi ihe wee sị:+ “Olee ikike i ji eme ihe ndị a? Ònye nyekwara gị ikike a?”+ 24  Jizọs zara ha, sị: “Mụ onwe m kwa ga-ajụ unu otu ihe. Ọ bụrụ na unu agwa m ya, mụ onwe m ga-agwakwa unu ikike m ji eme ihe ndị a:+ 25  Baptizim Jọn mere, ebee ka o si? Ò si n’eluigwe ka ò si n’aka mmadụ?”+ Ma ha malitere ikwu n’etiti onwe ha, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’eluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnịzi mere unu ekwereghị ya?’+ 26  Ma, ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’aka mmadụ,’ anyị na-atụ ìgwè mmadụ a egwu,+ n’ihi na ha niile weere Jọn dị ka onye amụma.”+ 27  Ha wee zaa Jizọs, sị: “Anyị amaghị.” Ya onwe ya sịrị ha: “M gaghịkwa agwa unu ikike m ji eme ihe ndị a.+ 28  “Gịnị ka unu chere? Otu nwoke nwere ụmụ abụọ.+ Mgbe ọ gakwuuru onye nke mbụ, ọ sịrị, ‘Nwa m, gaa rụọ ọrụ taa n’ubi vaịn m.’ 29  Onye nke a zara, sị, ‘M ga-aga, nna m,’+ ma ọ gaghị. 30  Mgbe ọ bịakwutere onye nke abụọ, gwa ya otu ihe ahụ. Onye nke a sịrị, ‘Agaghị m aga.’ E mesịa, ọ kwara ụta+ wee gaa. 31  Ònye n’ime ha abụọ mere uche nna ya?”+ Ha wee sị: “Onye nke abụọ.” Jizọs wee sị ha: “N’ezie, ana m asị unu na ndị ọnaụtụ na ụmụ nwaanyị akwụna bu unu ụzọ na-abanye n’alaeze Chineke. 32  N’ihi na Jọn bịakwutere unu, na-egosi unu ụzọ ezi omume,+ ma unu ekwereghị ya.+ Otú ọ dị, ndị ọnaụtụ na ụmụ nwaanyị akwụna kweere ya,+ ma unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu hụrụ nke a, unu akwaghị ụta n’ikpeazụ ka unu wee kwere ya. 33  “Nụrụnụ ihe atụ ọzọ: E nwere otu nwoke, bụ́ onyeisi ezinụlọ,+ onye kọrọ ubi vaịn, gbaakwa ya ogige ma gwuo ebe nzọchapụta mmanya na ya, wuokwa ụlọ elu,+ ma nyefee ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gaa mba ọzọ.+ 34  Mgbe oge mkpụrụ ruru, o zipụrụ ndị ohu ya ka ha gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ iweta mkpụrụ ya. 35  Otú ọ dị, ndị ọrụ ubi ahụ jidere ndị ohu ya, ha tikasịkwara otu ahụ́, ha gburu onye nke ọzọ, ha tụrụ onye nke ọzọ nkume.+ 36  O zipụkwara ndị ohu ọzọ, ndị dị ọtụtụ karịa ndị nke mbụ, ma ha mere ha otu ihe ahụ.+ 37  N’ikpeazụ, o zigaara ha ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-akwanyere ọkpara m ùgwù.’ 38  Mgbe ha hụrụ ọkpara ya, ndị ọrụ ubi ahụ kwurịtara n’etiti onwe ha, sị, ‘Onye a bụ onye ga-eketa ubi a;+ bịanụ ka anyị gbuo ya wee nweta ihe nketa ya!’+ 39  Ha wee jide ya, kpọpụ ya n’ubi vaịn ahụ ma gbuo ya.+ 40  Ya mere, mgbe onye nwe ubi vaịn ahụ bịara, gịnị ka ọ ga-eme ndị ọrụ ubi ahụ?” 41  Ha sịrị ya: “Ebe ọ bụ na ha bụ ndị ọjọọ, ọ ga-abịa bibie ha ajọ mbibi,+ ọ ga-enyefekwa ubi vaịn ahụ n’aka ndị ọzọ bụ́ ndị ọrụ ubi, ndị ga-enye ya mkpụrụ ya mgbe oge ya ruru.”+ 42  Jizọs wee sị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị, ‘Ọ bụ nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ+ ghọrọ nkume isi nkuku bụ́ isi.+ Ihe a si n’aka Jehova, ọ dịkwa ebube n’anya anyị’? 43  Ọ bụ ya mere m ji asị unu, A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.+ 44  Onye dakwara n’elu nkume a ga-akụri. Onye ọ bụla ọ dakwasịrị, ọ ga-egweri ya.”+ 45  Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị Farisii nụrụ ihe atụ ya, ha matara na ọ na-ekwu banyere ha.+ 46  Ma, ọ bụ ezie na ha na-achọ ijide ya, ha tụrụ ìgwè mmadụ egwu, n’ihi na ndị a weere ya na ọ bụ onye amụma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji