Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 13:1-58

13  Mgbe Jizọs si n’ụlọ pụọ n’ụbọchị ahụ, ọ nọdụrụ ala n’akụkụ oké osimiri;  ìgwè mmadụ gbakọkwara n’ebe ọ nọ, nke mere na ọ banyere n’ụgbọ mmiri ma nọdụ ala,+ ìgwè mmadụ ahụ dum guzokwa n’ikpere osimiri.  O wee jiri ihe atụ gwa ha ọtụtụ ihe, sị: “Lee! Ọgha mkpụrụ gawara ịgha mkpụrụ;+  ka ọ nọ na-agha mkpụrụ, mkpụrụ ụfọdụ dara n’akụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịakwara richapụ ha.+  Ndị ọzọ dara n’ebe nkume dị, bụ́ ebe ha na-enweghị ájá dị ukwuu, ha wee pulite ozugbo n’ihi enweghị ájá miri emi.+  Ma mgbe anyanwụ wara, ha chanwụrụ, ha kpọnwụkwara n’ihi na ha enweghị mgbọrọgwụ.+  Ndị ọzọ kwa dara n’etiti ogwu, ogwu ndị ahụ tolitekwara ma kpagbuo ha.+  Ma ndị ọzọ dara n’ala dị mma, ha wee malite ịmị mkpụrụ,+ nke a okpukpu otu narị, nke ahụ iri isii, nke ọzọ iri atọ.+  Onye nwere ntị, ya gee ntị.”+ 10  Ya mere, ndị na-eso ụzọ ya bịara wee sị ya: “Gịnị mere i ji jiri ihe atụ na-agwa ha okwu?”+ 11  O wee zaa, sị: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo ndị dị nsọ+ nke alaeze eluigwe, ma e nyeghị ndị ahụ ikike ya.+ 12  N’ihi na onye ọ bụla nke nwere, a ga-enyekwu ya, meekwa ka o nwee ihe n’ụba;+ ma onye ọ bụla nke na-enweghị, a ga-anara ya ọbụna ihe o nwere.+ 13  Ọ bụ ya mere m ji eji ihe atụ agwa ha okwu, n’ihi na n’ile anya, ha na-ele n’efu, n’ịnụ ihe, ha na-anụ n’efu, ha adịghịkwa aghọta ihe ọ pụtara;+ 14  amụma Aịzaya na-emezu n’ebe ha nọ, nke sịrị, ‘N’ịnụ ihe, unu ga-anụ ma unu agaghị aghọta ihe ọ pụtara ma ọlị; n’ile anya, unu ga-ele anya ma unu agaghị ahụ ụzọ ma ọlị.+ 15  N’ihi na obi ndị a adịkwaghị anabata ihe, ha ejiwokwa ntị ha nụ ihe ma ha emeghị ihe ọ bụla, ha emechiwokwa anya ha; ka ha wee ghara iji anya ha hụ ụzọ ma ọlị, jiri ntị ha nụ ihe, jirikwa obi ha ghọta ihe ọ pụtara wee chigharịa, m wee gwọọ ha.’+ 16  “Otú ọ dị, obi ụtọ na-adịrị anya unu+ n’ihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu n’ihi na ha na-anụ ihe. 17  N’ihi na n’ezie, ana m asị unu, Ọtụtụ ndị amụma+ na ndị ezi omume chọrọ ịhụ ihe ndị unu na-ahụ ma ha ahụghị ha,+ nakwa ịnụ ihe ndị unu na-anụ, ma ha anụghị ha.+ 18  “N’ihi ya, geenụ ntị n’ihe atụ nke nwoke ahụ ghara mkpụrụ.+ 19  Ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ okwu banyere alaeze ahụ ma ọ ghọtaghị ihe ọ pụtara, ajọ onye ahụ+ na-abịa pụnara ya ihe a ghara n’obi ya; nke a bụ nke a ghara n’akụkụ ụzọ. 20  Ma nke ahụ a ghara n’ebe nkume dị bụ onye na-anụ okwu ahụ ma na-eji ọṅụ anakwere ya ozugbo.+ 21  Ma o nweghị mgbọrọgwụ n’ime onwe ya, kama ọ na-anọru nwa oge, mgbe ahụhụ ma ọ bụ mkpagbu bilitere n’ihi okwu ahụ, ya asụọ ngọngọ ozugbo.+ 22  Ma nke ahụ a ghara n’etiti ogwu bụ onye na-anụ okwu ahụ, ma nchegbu nke usoro ihe a+ na ike dị aghụghọ nke akụnụba na-akpagbu okwu ahụ, o wee ghọọ onye na-adịghị amị mkpụrụ.+ 23  Ma nke ahụ a ghara n’ala dị mma bụ onye na-anụ okwu ahụ ma na-aghọta ihe ọ pụtara, bụ́ onye na-amị mkpụrụ ma na-emepụta ihe, nke a okpukpu otu narị, nke ahụ iri isii, nke ọzọ iri atọ.”+ 24  O meere ha ihe atụ ọzọ, sị: “Alaeze eluigwe dị ka nwoke ghara ezi mkpụrụ n’ubi ya.+ 25  Mgbe ndị mmadụ nọ na-ehi ụra, onye iro ya bịara kụọ ata n’etiti ọka wit ahụ, ma pụọ. 26  Mgbe akwụkwọ ya pulitere wee mịa mkpụrụ, ata ndị ahụ pulitekwara. 27  Ya mere, ndị ohu nke onyeisi ezinụlọ ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ́ bụghị ezi mkpụrụ ka ị ghara n’ubi gị?+ Oleezi otú o si nwee ata?’+ 28  O wee sị ha, ‘Ọ bụ onye iro nke bụ́ mmadụ mere ihe a.’+ Ha wee sị ya, ‘Ị̀ chọrọ ka anyị gaa fopụsịa ha? 29  O wee sị, ‘Ee e; ka ọ ghara ịbụ na mgbe unu na-efopụ ata ahụ, unu efopụkọta ha na ọka wit ahụ. 30  Hapụnụ ha abụọ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi; n’oge owuwe ihe ubi, m ga-agwa ndị na-ewe ihe ubi, sị, Burunụ ụzọ chịkọta ata ahụ ma kee ha n’ùkwù n’ùkwù ka e suo ha ọkụ,+ e mesia, unu agaa chịkọta ọka wit ahụ chịba n’ụlọ nkwakọba ihe m.’”+ 31  O meere ha ihe atụ ọzọ,+ sị: “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ osisi mọstad,+ nke mmadụ weere kụọ n’ubi ya; 32  nke bụ́, n’eziokwu, mkpụrụ osisi kasị nta, ma mgbe o toro, ọ na-abụ mkpụrụ akụ́kụ́ kasị ibu ma ghọọ osisi, nke mere na anụ ufe nke eluigwe+ na-abịa wee nweta ebe obibi n’alaka ya.”+ 33  O meere ha ihe atụ ọzọ, sị: “Alaeze eluigwe dị ka ihe iko achịcha,+ nke nwaanyị weere tinye n’ime ntụ ọka nke juru arịa atọ buru ibu, ruo mgbe ntụ ọka ahụ dum koro eko.” 34  Ihe ndị a niile ka Jizọs ji ihe atụ dị iche iche gwa ìgwè mmadụ ahụ. N’ezie, ọ dịghị agwa ha okwu ma ọ bụrụ na o jighị ihe atụ;+ 35  ka e wee mezuo ihe e kwuru site n’ọnụ onye amụma, bụ́ onye sịrị: “M ga-emeghe ọnụ m jiri ihe atụ kwuo okwu. M ga-ekwusa ihe ndị zoro ezo kemgbe a tọrọ ntọala ụwa.”+ 36  Mgbe ọ gwasịrị ìgwè mmadụ ahụ ka ha laa, ọ banyere n’ụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya wee sị: “Kọwaara anyị ihe atụ nke ata ahụ dị n’ubi.” 37  Ọ zara, sị: “Onye ghara ezi mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke mmadụ; 38  ubi ahụ bụ ụwa;+ ma ezi mkpụrụ ahụ bụ ụmụ nke alaeze; ma ata ahụ bụ ụmụ ajọ+ onye ahụ, 39  onye iro nke kụrụ ha bụ Ekwensu.+ Owuwe ihe ubi+ ahụ bụ ọgwụgwụ nke usoro ihe a,+ ndị ahụ na-ewe ihe ubi bụ ndị mmụọ ozi. 40  Ya mere, dị nnọọ ka a na-achịkọta ata ma suo ha ọkụ, otú ahụ ka ọ ga-adị n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.+ 41  Nwa nke mmadụ ga-eziga ndị mmụọ ozi ya, ha ga-achịpụta ihe niile na-eme ka a sụọ ngọngọ+ n’alaeze ya nakwa ụmụ mmadụ ndị na-emebi iwu, 42  ha ga-atụbakwa ha n’oké ọkụ.+ N’ebe ahụ ka ha ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.+ 43  N’oge ahụ, ndị ezi omume ga-enwu+ gbaa dị ka anyanwụ+ n’alaeze nke Nna ha. Onye nwere ntị, ya gee ntị.+ 44  “Alaeze eluigwe dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke e zoro n’ala, nke otu nwoke hụrụ wee zoo ya; n’ihi ọṅụ o nwere, ọ gara ree+ ihe ndị o nwere wee zụọ ala ahụ.+ 45  “Ọzọ, alaeze eluigwe dị ka onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma. 46  Mgbe ọ hụrụ otu nkume pel dị nnọọ oké ọnụ ahịa,+ ọ lara ma ree ihe niile o nwere ozugbo wee zụọ ya.+ 47  “Ọzọ, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ a wụnyere n’oké osimiri nke na-ekpokọta ụdị azụ̀ niile.+ 48  Mgbe o juru, ha dọgotara ya n’ikpere osimiri, ha wee nọdụ ala, chịkọta ndị dị mma+ wụnye n’arịa dị iche iche, ma ha tụfuru ndị na-adịghị mma.+ 49  Otú ahụ ka ọ ga-adị n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a: ndị mmụọ ozi ga-aga kewapụ ndị ajọ omume+ n’etiti ndị ezi omume,+ 50  ha ga-atụbakwa ha n’oké ọkụ. N’ebe ahụ ka ha ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.+ 51  “Ùnu ghọtara ihe ihe ndị a niile pụtara?” Ha wee sị ya: “Ee.” 52  Ya mere, ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ otú ahụ, onye ọ bụla bụ́ onye na-ezi ihe n’ihu ọha, mgbe e ziri ya ihe banyere alaeze eluigwe,+ yiri nwoke bụ́ onyeisi ezinụlọ, onye na-esi n’ụlọ akụ̀ ya ewepụta ihe ndị dị ọhụrụ na ndị mere ochie.”+ 53  Mgbe Jizọs mesịrị ihe atụ ndị a, o si ebe ahụ gafee n’obodo ọzọ. 54  Mgbe ọ banyere n’obodo a mụrụ ya,+ ọ malitere izi ha ihe n’ụlọ nzukọ ha,+ nke mere na o juru ha anya, ha wee sị: “Olee ebe nwoke a si nweta amamihe a na ọrụ ndị a dị ike? 55  Onye a ọ́ bụghị nwa ọkwá nkà ahụ?+ Ọ́ bụghị nne ya ka a na-akpọ Meri, ọ̀ bụkwa na ụmụnne ya ndị ikom abụghị Jems na Josef na Saịmọn na Judas? 56  Ọ̀ bụ na anyị na ụmụnne ya ndị inyom niile anọghị?+ Oleezi ebe nwoke a si nweta ihe ndị a niile?”+ 57  Ya mere, ha malitere ịsụ ngọngọ n’ihi ya.+ Ma Jizọs sịrị ha: “A na-enye onye amụma nsọpụrụ ma e wezụga n’obodo a mụrụ ya nakwa n’ụlọ ya.”+ 58  Ọ rụghịkwa ọtụtụ ọrụ dị ike n’ebe ahụ n’ihi enweghị okwukwe ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji