Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Matiu 1:1-25

1  Akwụkwọ nke kọrọ akụkọ+ banyere Jizọs Kraịst, nwa Devid,+ nwa Ebreham:+   Ebreham mụrụ Aịzik;+ Aịzik amụọ Jekọb;+ Jekọb amụọ Juda+ na ụmụnne ya ndị ikom;   Juda amụọ Pirez+ na Zira, bụ́ ndị Tema mụụrụ ya; Pirez amụọ Hezrọn;+ Hezrọn amụọ Ram;+   Ram amụọ Aminadab; Aminadab amụọ Nashọn;+ Nashọn amụọ Salmọn;+   Salmọn amụọ Boaz, bụ́ onye Rehab+ mụụrụ ya; Boaz amụọ Obed, bụ́ onye Rut+ mụụrụ ya; Obed amụọ Jesi;+   Jesi amụọ Devid+ bụ́ eze.+  Devid mụrụ Sọlọmọn,+ bụ́ onye nwunye Yuraya mụụrụ ya;   Sọlọmọn amụọ Rehoboam;+ Rehoboam amụọ Abaịja; Abaịja+ amụọ Esa;+   Esa amụọ Jehọshafat;+ Jehọshafat amụọ Jehoram+ Jehoram amụọ Ọzaya;   Ọzaya amụọ Jotam; Jotam+ amụọ Ehaz;+ Ehaz amụọ Hezekaya;+ 10  Hezekaya amụọ Manase;+ Manase+ amụọ Emọn;+ Emọn+ amụọ Josaya; 11  Josaya+ amụọ Jekonaya+ na ụmụnne ya ndị ikom mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn.+ 12  Mgbe a dọsịịrị ha n’agha laa Babịlọn, Jekonaya mụrụ Shieltiel;+ Shieltiel amụọ Zerọbabel;+ 13  Zerọbabel amụọ Abayọd; Abayọd amụọ Elayakim; Elayakim amụọ Ezọ; 14  Ezọ amụọ Zedọk; Zedọk amụọ Ekim; Ekim amụọ Ịlayọd; 15  Ịlayọd amụọ Elieza; Elieza amụọ Matan; Matan amụọ Jekọb; 16  Jekọb amụọ Josef di Meri, bụ́ onye mụrụ Jizọs,+ onye a na-akpọ Kraịst.+ 17  Ya mere, ọgbọ ahụ niile, malite n’Ebreham ruo na Devid, dị ọgbọ iri na anọ, malitekwa na Devid ruo mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn dị ọgbọ iri na anọ, malitekwa mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn ruo na Kraịst dị ọgbọ iri na anọ. 18  Ma, otú a ka e si mụọ Jizọs Kraịst. N’oge e kwere nne ya bụ́ Meri nkwa+ na Josef ga-alụ ya, a hụrụ na ọ dị ime site n’ike mmụọ nsọ+ tupu e jikọọ ha. 19  Otú ọ dị, Josef bụ́ di ya bu n’uche ịgba ya alụkwaghịm*+ na nzuzo n’ihi na ọ bụ onye ezi omume, ọ chọghịkwa ibupụta ya n’ihu ọha.+ 20  Ma mgbe o chebasịịrị ihe ndị a echiche, lee! mmụọ ozi Jehova bịakwutere ya ná nrọ, sị: “Josef, nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri nwunye gị laa, n’ihi na ọ bụ mmụọ nsọ mere ka ọ dị ime ahụ ọ dị.+ 21  Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụ ya Jizọs,+ n’ihi na ọ ga-azọpụta+ ndị ya+ ná mmehie ha.”+ 22  Ihe a niile mere ka ihe Jehova kwuru+ site n’ọnụ onye amụma ya+ wee mezuo, nke sịrị: 23  “Lee! Nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke+ ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke, a ga-agụ ya Ịmanuel,”+ nke pụtara, ma a sụgharịa ya, “Chineke Nọnyeere Anyị.”+ 24  Josef wee teta n’ụra ya ma mee ihe mmụọ ozi Jehova gwara ya, o wee kpọrọ nwunye ya laa. 25  Ma ya na ya enweghị mmekọahụ+ ọ bụla ruo mgbe ọ mụrụ nwa nwoke;+ o wee gụọ ya Jizọs.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Mt 1:19*  Dị ka omenala ndị Juu si dị, ọ dị mkpa ịgba mmadụ alụkwaghịm iji gbubie nkwa ọlụlụ.