Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mak 9:1-50

9  Ọ gakwara n’ihu ịsị ha: “N’ezie, ana m asị unu, E nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo n’ebe a bụ́ ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha bu ụzọ hụ ka alaeze Chineke ji ike bịa.”+  Ya mere, mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jizọs kpọọrọ naanị Pita na Jems na Jọn ma kpọgote ha n’ugwu dị oké elu. O wee nwoghaa n’ihu ha,+  uwe elu ya wee na-egbuke egbuke, na-enwu gbaa karịa ka onye ọ bụla nke na-asụ ákwà n’ụwa pụrụ ime ka ha dị ọcha.+  Ịlaịja na Mozis pụtakwara n’ihu ha, ha na Jizọs wee na-akparịta ụka.+  Pita wee sị Jizọs: “Rabaị, ọ dị mma na anyị nọ n’ebe a, ya mere, ka anyị maa ụlọikwuu atọ, otu maka gị, otu maka Mozis, otu maka Ịlaịja.”+  N’eziokwu, ọ maghị ihe ọ ga-ekwu, n’ihi na egwu ji ha.  Ígwé ojii wee gbachie, kpuchie ha, otu olu+ sikwa n’ígwé ojii ahụ kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m,+ onye m hụrụ n’anya; geenụ ya ntị.”+  Otú ọ dị, na mberede, ha lere anya gburugburu ma hụ na ọ dịkwaghị onye ha na ya nọ, ma e wezụga naanị Jizọs.+  Ka ha si n’ugwu ahụ na-arịdata, o nyere ha iwu n’ụzọ doro anya ka ha ghara ịkọrọ+ onye ọ bụla ihe ha hụrụ, ruo mgbe Nwa nke mmadụ si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.+ 10  Ha wee buru okwu ahụ n’obi, ma kwurịta n’etiti onwe ha ihe isi ná ndị nwụrụ anwụ bilie nke a pụtara. 11  Ha wee malite ịjụ ya ajụjụ, sị: “Gịnị mere ndị odeakwụkwọ ji ekwu na Ịlaịja+ ga-ebu ụzọ bịa?”+ 12  Ọ sịrị ha: “Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa, meekwa ka ihe niile dị otú ha dị na mbụ;+ ma gịnị mere e ji dee na Nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ,+ e mesookwa ya dị ka onye na-abaghị uru?+ 13  Ma ana m agwa unu na, n’eziokwu, Ịlaịja+ abịawo, ha mekwara ya ọtụtụ ihe dị ka ha chọrọ, dị nnọọ ka e dere banyere ya.”+ 14  Mgbe ha bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ, ha hụrụ ka oké ìgwè mmadụ gbara ha gburugburu nakwa ka ndị odeakwụkwọ na-arụ ha ụka.+ 15  Ma ozugbo ìgwè mmadụ ahụ dum hụrụ ya, o juru ha anya, ha wee gbakwuru ya, malite ikele ya. 16  O wee jụọ ha, sị: “Gịnị ka unu na ha na-arụrịta ụka ya?” 17  Otu onye n’ime ìgwè mmadụ ahụ zara ya, sị: “Onye Ozizi, m kpọtaara gị nwa m nwoke n’ihi na o nwere mmụọ na-eme ka mmadụ ghara ikwu okwu;+ 18  ebe ọ bụla o jidere ya, ọ na-akụ ya n’ala, ọ na-agbọpụtakwa ụfụfụ, na-atakwa ikikere ezé, ọ dịkwaghị enwe ume. M wee gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike ịchụpụ ya.”+ 19  Ọ zara ha, sị: “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe,+ ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga na-edi ihe unu na-eme? Kpọtaranụ m ya.”+ 20  Ha wee kpọtara ya nwa ahụ. Ma mgbe ọ hụrụ ya, ozugbo ahụ, mmụọ ahụ mere ka ihe ọdụdọ dọwa nwa ahụ, mgbe ọ dara n’ala, ọ nọ na-atụrụgharị, na-agbọpụta ụfụfụ.+ 21  O wee jụọ nna ya, sị: “Olee mgbe ihe a malitere ime ya?” Ọ zara, sị: “Ọ malitere kemgbe ọ bụ nwata; 22  mgbe mgbe, ọ na-atụba ya ma n’ime ọkụ ma n’ime mmiri ka o wee laa ya n’iyi.+ Ma ọ bụrụ na ị pụrụ ime ihe ọ bụla, nwee ọmịiko n’ebe anyị nọ ma nyere anyị aka.” 23  Jizọs sịrị ya: “Okwu ahụ bụ́, ‘Ọ bụrụ na ị pụrụ’! N’ezie, ihe niile pụrụ ikwe mmadụ omume ma ọ bụrụ na mmadụ enwee okwukwe.”+ 24  Nna nwatakịrị ahụ tiri mkpu ozugbo, sị: “Enwere m okwukwe! Nyere m aka n’ebe okwukwe dị m mkpa!”+ 25  Mgbe Jizọs hụrụ na ìgwè mmadụ na-agbakọta n’ebe ha nọ, ọ baara mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mba,+ sị ya: “Gị mmụọ na-eme ka mmadụ ghara ikwu okwu ma ghara ịnụ ihe, ana m enye gị iwu, si n’ime ya pụọ, abanyekwala n’ime ya ọzọ.” 26  Mgbe o tisịrị mkpu, ihe ọdụdọ adọọkwa ya ọtụtụ ugboro, ọ pụtara;+ o wee dị ka onye nwụrụ anwụ, nke mere na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha nọ na-asị: “Ọ nwụọla!” 27  Ma Jizọs seere ya n’aka dọlite ya, o wee bilie.+ 28  Mgbe ọ banyesịrị n’ime ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya wee jụọ ya n’ebe naanị ha nọ, sị: “Gịnị mere na anyị achụpụlighị ya?”+ 29  O wee sị ha: “Ọ dịghị ihe ọ bụla pụrụ ime ka ụdị a pụọ ma e wezụga ekpere.”+ 30  Ha si n’ebe ahụ pụọ wee si Galili gafere gawa, ma ọ chọghị ka onye ọ bụla mara banyere ya. 31  N’ihi na ọ nọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe ma na-asị ha: “A ga-enyefe Nwa nke mmadụ n’aka ndị mmadụ, ha ga-egbukwa ya,+ ma, n’agbanyeghị na a ga-egbu ya, ọ ga-ebili mgbe ụbọchị atọ gasịrị.”+ 32  Otú ọ dị, ha aghọtaghị okwu ahụ, egwu na-atụkwa ha ịjụ ya ajụjụ.+ 33  Ha wee bata n’ime Kapaniọm. Mgbe ọ nọkwa n’ime ụlọ, ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka unu na-arụ ụka ya n’okporo ụzọ?”+ 34  Ha gbachiri nkịtị, n’ihi na n’okporo ụzọ, ha rụrụ ụka n’etiti onwe ha banyere onye ka ukwuu.+ 35  O wee nọdụ ala ma kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ga-abụ onye ikpeazụ n’ebe mmadụ niile nọ na onye na-ejere mmadụ niile ozi.”+ 36  O wee kpọrọ otu nwatakịrị, mee ka o guzoro n’etiti ha, tụkwasịkwa ya aka n’ubu wee sị ha:+ 37  “Onye ọ bụla nke na-anabata otu n’ime ụmụntakịrị dị otú a n’aha m na-anabata m; onye ọ bụla nke na-anabatakwa m na-anabata, ọ bụghị naanị m, kamakwa onye ahụ nke zitere m.”+ 38  Jọn sịrị ya: “Onye Ozizi, anyị hụrụ otu nwoke nke ji aha gị na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, anyị gbalịkwara igbochi ya,+ n’ihi na ọ dịghị eso anyị.”+ 39  Ma Jizọs sịrị: “Unu anwala igbochi ya, n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla nke ga-arụ ọrụ dị ike n’aha m nke ga-enwe ike ikwujọ m ọsọ ọsọ;+ 40  n’ihi na onye na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị.+ 41  N’ihi na onye ọ bụla nke kunyere unu otu iko+ mmiri ka unu ṅụọ n’ihi na unu bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst,+ n’ezie, ana m asị unu, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya. 42  Ma onye ọ bụla nke mere ka otu n’ime ndị a dị nta kwere ekwe sụọ ngọngọ, ọ ga-akara ya mma ma ọ bụrụ na e konye nkume igwe nri, dị ka nke ịnyịnya ibu na-akwagharị, n’olu ya wee tụba ya nnọọ n’ime oké osimiri.+ 43  “Ọ bụrụkwa na aka gị emee ka ị sụọ ngọngọ, gbupụ ya; ọ kaara gị mma ibu nkwarụ nweta ndụ kama inwe aka abụọ banye na Gehena,* n’ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.+ 44*  —— 45  Ọ bụrụkwa na ụkwụ gị emee ka ị sụọ ngọngọ, gbupụ ya; ọ kaara gị mma inwe otu ụkwụ+ wee nweta ndụ kama inwe ụkwụ abụọ e wee tụba gị n’ime Gehena.+ 46  —— 47  Ọ bụrụkwa na anya gị emee ka ị sụọ ngọngọ, tụfuo ya,+ ọ kaara gị mma ibu otu anya banye n’alaeze Chineke kama inwe anya abụọ e wee tụba gị n’ime Gehena,+ 48  bụ́ ebe ikpuru ha na-adịghị anwụ anwụ, a dịghị emenyụkwa ọkụ ya emenyụ.+ 49  “N’ihi na a ga-agha onye ọ bụla nnu+ nke bụ́ ọkụ. 50  Nnu dị mma; ma ọ bụrụ na o nwee ka nnu si ghara ịdịkwa ụtọ, gịnị ka unu ga-eji mee ka ọ dị ụtọ?+ Nweenụ nnu+ n’ime onwe unu, unu na ibe unu dị n’udo.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Mk 9:43*  Lee Ihe Odide Ntụkwasị nke 2.
Mk 9:44*  Lee ihe e dere n’ala ala peeji na Mt 17:21.