Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mak 8:1-38

8  N’ụbọchị ndị ahụ, mgbe e nwere ìgwè mmadụ buru ibu ọzọ, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya wee sị ha:+  “Enwere m ọmịiko+ n’ebe ìgwè mmadụ a nọ, n’ihi na ka ọ dị ugbu a, mụ na ha anọwo ruo ụbọchị atọ, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri;  ọ bụrụkwa na mụ asị ha lawa n’ụlọ ha n’agụụ, ha ga-ada mbà n’okporo ụzọ. N’ezie, ụfọdụ n’ime ha si ebe dị anya.”  Ma ndị na-eso ụzọ ya zara ya, sị: “Ebee ka mmadụ ga-esi nweta achịcha ga-eju ndị a afọ n’ebe a dịpụrụ adịpụ?”+  Ma ọ jụrụ ha, sị: “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya: “Asaa.”+  O wee gwa ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ n’ala. O wee were ogbe achịcha asaa ahụ, kelee Chineke,+ nyawaa ha, malite iwere ha na-enye ndị na-eso ụzọ ya ka ha kesaa, ha wee were ha kesaara ìgwè mmadụ ahụ.+  Ha nwekwara obere azụ̀ ole na ole; mgbe ọ gọzichara azụ̀ ndị a, ọ gwara ha ka ha kee ha.+  Ha wee rie ihe oriri, rijuo afọ, ha wee tụtụkọta ihe ha rifọrọ erifọ, o juru nkata asaa.+  Ma e nwere ihe dị ka puku ndị ikom anọ. N’ikpeazụ, ọ sịrị ha lawa.+ 10  Ozugbo ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ụgbọ wee bata ná mpaghara Dalmanuta.+ 11  N’ebe a, ndị Farisii pụtara wee malite ịrụ ya ụka, na-achọ ka o gosi ha ihe ịrịba ama si n’eluigwe, iji lee ya ule.+ 12  Ya mere, ọ sụrụ ude+ na mmụọ ya, sị: “Gịnị mere ọgbọ a ji na-achọ ihe ịrịba ama? N’eziokwu, ana m asị, A gaghị enye ọgbọ a ihe ịrịba ama ọ bụla.”+ 13  O wee hapụ ha, banyeghachi n’ụgbọ, ma gaa n’ikpere mmiri dị n’ofe nke ọzọ. 14  Otú ọ dị, ha chefuru iwere achịcha, e wezụgakwa otu ogbe achịcha, ọ dịghị ihe ha nwere n’ụgbọ mmiri ahụ.+ 15  O wee malite inye ha iwu n’ụzọ doro anya, sị: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya maka ihe iko achịcha nke ndị Farisii nakwa maka ihe iko achịcha nke Herọd.”+ 16  Ya mere, ha malitere ịrụrịta ụka maka na ha ejighị achịcha.+ 17  Mgbe ọ matara nke a, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji arụ ụka maka na unu ejighị achịcha?+ Ùnu amatabeghị, ùnu aghọtabeghịkwa ihe ọ pụtara? Ọ̀ na-esiri obi unu ike ịghọta ihe?+ 18  ‘Ùnu adịghị ahụ ụzọ, ọ bụ ezie na unu nwere anya; ùnu adịghịkwa anụ ihe ọ bụ ezie na unu nwere ntị?’+ Ùnu echetaghị, 19  mgbe m nyawaara puku ndị ikom ise ahụ ogbe achịcha ise+ ahụ, nkata ole ka unu tụtụjuru achịcha e rifọrọ erifọ?” Ha sịrị ya: “Iri na abụọ.”+ 20  “Mgbe m nyawaara puku ndị ikom anọ ahụ ogbe achịcha asaa ahụ, nkata ole ka unu tụtụjuru achịcha e rifọrọ erifọ?” Ha wee sị ya: “Asaa.”+ 21  O wee sị ha: “Ùnu aghọtabeghị ihe ọ pụtara?”+ 22  Ha wee banye Betseida. N’ebe a, ndị mmadụ kpọtaara ya otu nwoke kpuru ìsì, ha rịọsikwara ya arịrịọ ike ka o bitụ ya aka.+ 23  O wee sere nwoke ahụ kpuru ìsì n’aka, kpọrọ ya pụọ n’obodo nta ahụ, mgbe ọ gbụsasịrị ya ọnụ mmiri+ n’anya, o bikwasịrị ya aka wee malite ịjụ ya, sị: “Ò nwere ihe ị na-ahụ?” 24  Nwoke ahụ wee lelie anya ma malite ịsị: “Ana m ahụ ndị mmadụ, n’ihi na ana m ahụ ihe yigasịrị osisi, ma ha na-ejegharị ejegharị.” 25  O wee bikwasị nwoke ahụ aka n’anya ọzọ, nwoke ahụ wee hụwa ụzọ nke ọma, e wee gwọọ ya, o wee na-ahụ ihe niile nke ọma. 26  O wee sị ya lawa, sịkwa ya: “Ma abanyela n’obodo nta a.”+ 27  Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya wee gawazie obodo nta ndị dị na Sesaria Filipaị, mgbe ha nọ n’ụzọ, ọ malitere ịjụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ, sị ha: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”+ 28  Ha sịrị ya: “Jọn Onye Na-eme Baptizim,+ ndị ọzọ na-asịkwa, Ịlaịja,+ ma ndị ọzọ na-asị, Otu n’ime ndị amụma.”+ 29  O wee jụọ ha, sị: “Ma unu onwe unu, ònye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara ya, sị: “Ị bụ Kraịst.”+ 30  Ya mere, o nyesiri ha iwu ike ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla banyere onwe ya.+ 31  Ọ malitekwara ịkụziri ha na Nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ, na ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ajụkwa ya, na a ga-egbukwa ya,+ na ọ ga-ebilikwa mgbe ụbọchị atọ gasịrị.+ 32  N’ezie, ọ nọ na-ekwu okwu ahụ n’ezoghị ọnụ. Ma Pita kpọpụrụ ya n’akụkụ wee malite ịbara ya mba.+ 33  Ọ tụgharịrị, lee ndị na-eso ụzọ ya anya ma baara Pita mba, sị: “Gaa m n’azụ, Setan, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.”+ 34  O wee kpọọ ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya, o wee sị ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, na-eso m mgbe niile.+ 35  N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta mkpụrụ obi ya ga-atụfu ya; ma onye ọ bụla nke tụfuru mkpụrụ obi ya n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma ahụ ga-azọpụta ya.+ 36  N’ezie, olee uru ọ baara mmadụ irite ụwa dum n’uru ma tụfuo mkpụrụ obi ya?+ 37  N’ezie, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere mkpụrụ obi ya?+ 38  N’ihi na onye ọ bụla ihere m na ihere okwu m na-eme n’ọgbọ a nke na-akwa iko,* nke na-emekwa mmehie, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke mmadụ+ mgbe ọ ga-abịarute n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Mk 8:38*  Ma ọ bụ, “na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ.”