Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mak 6:1-56

6  O wee si n’ebe ahụ pụọ ma banye n’obodo a mụrụ ya, ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya.+  Mgbe o ruru ụbọchị izu ike, ọ malitere izi ihe n’ụlọ nzukọ; o juru ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị na-ege ntị anya, ha wee, sị: “Olee ebe nwoke a nwetara ihe ndị a?+ Gịnịkwa mere e ji nye nwoke a amamihe a? Gịnịkwa mere e ji si n’aka ya rụọ ọrụ dị ike ndị dị otú a?  Onye a ọ́ bụghị ọkwá nkà ahụ,+ nwa Meri+ nakwa nwanne Jems+ na Josef na Judas na Saịmọn?+ Ọ̀ bụkwa na anyị na ụmụnne ya ndị inyom anọghị n’ebe a?” Ha wee malite ịsụ ngọngọ n’ihi ya.+  Ma Jizọs gara n’ihu ịgwa ha, sị: “A na-enye onye amụma nsọpụrụ ma e wezụga n’obodo a mụrụ ya+ nakwa n’etiti ndị ikwu ya nakwa n’ụlọ nke ya.”+  Ya mere, o nweghị ike ịrụ ọrụ ọ bụla dị ike n’ebe ahụ ma e wezụga ibikwasị mmadụ ole na ole na-arịa ọrịa aka ma gwọọ ha.  N’ezie, enweghị okwukwe ha juru ya anya. O wee gazuo obodo nta ndị ahụ gburugburu, na-ezi ihe.+  O wee kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ. O wee bido izipụ ha abụọ abụọ,+ ọ malitekwara inye ha ikike ịchụpụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha.+  O nyekwara ha iwu ka ha ghara iwere ihe ọ bụla maka njem ahụ ma e wezụga naanị mkpara, ka ha gharakwa iwere achịcha na obere akpa ihe oriri,+ ka ha gharakwa itinye ego n’obere akpa ego a na-eke n’úkwù,+  kama ka ha yiri akpụkpọ ụkwụ, ka ha gharakwa iyi uwe ime abụọ.+ 10  Ọ sịkwara ha: “N’ebe ọ bụla unu banyere n’ụlọ,+ nọrọnụ n’ebe ahụ ruo mgbe unu si n’ebe ahụ pụọ.+ 11  Ebe ọ bụla a na-anabataghịkwa unu ma ọ bụ nụrụ ihe unu na-ekwu, mgbe unu si ebe ahụ na-apụ, tichapụnụ ájá dị n’okpuru ụkwụ unu ka ọ bụrụ àmà nye ha.”+ 12  Ha wee gaa na-ekwusa oziọma ka ndị mmadụ wee chegharịa;+ 13  ha na-achụpụkwa ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ,+ na-etekwa ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa mmanụ+ ma na-agwọ ha.+ 14  O wee ruo Eze Herọd ntị, n’ihi na aha Jizọs ghọrọ ihe ọha na eze maara, ndị mmadụ nọkwa na-ekwu, sị: “E mewo ka Jọn onye na-eme baptizim si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, ọ bụ ya mere o ji na-arụ ọrụ ndị a dị ike.”+ 15  Ma ndị ọzọ nọ na-asị: “Ọ bụ Ịlaịja.”+ Ndị ọzọ na-asịkwa: “Ọ bụ onye amụma nke dị ka otu n’ime ndị amụma.”+ 16  Ma mgbe Herọd nụrụ ya, ọ malitere ịsị: “A kpọlitewo Jọn ahụ m gbupụrụ isi n’ọnwụ.”+ 17  N’ihi na Herọd zipụrụ ndị mmadụ, ha wee gaa jide Jọn, kee ya agbụ, tụba ya n’ụlọ mkpọrọ n’ihi Herodias bụ́ nwunye Filip nwanne ya, n’ihi na ọ lụụrụ ya.+ 18  N’ihi na Jọn gwara Herọd ugboro ugboro, sị: “Iwu akwadoghị ka ị lụrụ nwunye nwanne gị.”+ 19  Ma Herodias buuru Jọn iwe n’obi,+ ọ na-achọkwa igbu ya, ma o nweghị ike igbu ya.+ 20  N’ihi na Herọd na-atụ Jọn egwu,+ ebe ọ maara na ọ bụ onye ezi omume, nke dịkwa nsọ;+ ọ nọkwa na-echebe ya. Mgbe ọ bụla ọ nụrụ ihe o kwuru,+ ọ naghị ama ihe ọ ga-eme ya, ma ọ na-eji obi ụtọ na-ege ntị n’ihe ọ na-ekwu. 21  Ma ọ dabaara ya otu ụbọchị+ mgbe Herọd kpọrọ ndị nọ n’ọkwá ukwu na ndị ọchịagha ya na ndị bụ́ ndị isi na Galili iri nri anyasị n’ememme ụbọchị ọmụmụ ya.+ 22  Ada Herodias a batakwara gbaa egwú ma mee ka obi dị Herọd na ndị ha na ya nọ na-eri ihe mma.+ Eze sịrị nwa agbọghọ ahụ: “Rịọ m ihe ọ bụla ị chọrọ, m ga-enyekwa gị ya.” 23  Ee, ọ ṅụụrụ ya iyi, sị: “Ihe ọ bụla ị rịọrọ m, m ga-enye gị ya,+ ruo ọkara nke alaeze m.”+ 24  O wee gaa jụọ nne ya, sị: “Gịnị ka m ga-arịọ?” Ọ zara ya, sị: “Isi Jọn onye na-eme baptizim.”+ 25  Ozugbo ahụ, ọ gakwuuru eze ahụ ngwa ngwa wee kwuo ihe ọ chọrọ, sị: “Achọrọ m ka i bunye m isi Jọn Onye Na-eme Baptizim ozugbo n’efere dị mbadamba.” 26  Ọ bụ ezie na o wutere eze nke ukwuu, ma ọ chọghị ileghara ya anya, n’ihi iyi ọ ṅụrụ nakwa n’ihi ndị ahụ nọ na-eri ihe na tebụl.+ 27  Eze wee zipụ otu n’ime ndị agha na-eche nche ozugbo ma nye ya iwu ka o bute isi ya. O wee gaa gbupụ ya isi n’ụlọ mkpọrọ+ 28  ma bute isi ya n’efere dị mbadamba. O wee bunye ya nwa agbọghọ ahụ, nwa agbọghọ ahụ wee bunye ya nne ya.+ 29  Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ ya, ha bịara buru ozu ya, gaa lie ya n’ili ncheta.+ 30  Ndịozi ahụ wee zukọta n’ihu Jizọs ma kọọrọ ya ihe niile ha mere nakwa ihe ha kụziri.+ 31  O wee sị ha: “Bịanụ ka anyị gaa zurutụ ike+ n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị.”+ N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị na-abịa ma na-ala, ha enweghịkwa ohere ọ bụla iri nri.+ 32  Ha wee jiri ụgbọ mmiri gawa naanị ha n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị.+ 33  Ma ndị mmadụ hụrụ ka ha na-aga, ọtụtụ wee mara. Ha wee jiri ụkwụ si n’obodo niile ahụ buru ha ụzọ gbaruo n’ebe ahụ.+ 34  Mgbe ha pụtara, ọ hụrụ oké ìgwè mmadụ, ma o nwere ọmịiko+ n’ebe ha nọ, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.+ 35  Ugbu a chi ejiwela, ndị na-eso ụzọ ya wee bịakwute ya wee malite ịsị ya: “Ebe a dịpụrụ adịpụ, chi ejiwekwala.+ 36  Sị ha lawa, ka ha gaa n’ime ime obodo nakwa n’obodo nta ndị dị gburugburu zụrụ ihe ha ga-eri.”+ 37  Ọ zara ha, sị: “Nyenụ ha ihe ka ha rie.” Ha wee sị ya: “Ànyị ga-aga zụta achịcha ruru narị mkpụrụ ego dinarịọs abụọ wee nye ha ka ha rie?”+ 38  O wee sị ha: “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ lee!” Mgbe ha chọpụtara, ha sịrị: “Ise, tinyere azụ̀ abụọ.”+ 39  O wee gwa mmadụ niile ka ha nọdụ n’ìgwè n’ìgwè+ n’elu ahịhịa ndụ.+ 40  Ha wee nọdụ n’ìgwè n’ìgwè, ụfọdụ dị otu narị mmadụ, ụfọdụ adịrị mmadụ iri ise.+ 41  O wee were ogbe achịcha ise ahụ na azụ̀ abụọ ahụ lelie anya n’eluigwe wee gọzie+ ha, ma nyawaa+ ogbe achịcha ndị ahụ wee malite inye ha ndị na-eso ụzọ ya, ka ha na-enye ìgwè mmadụ ahụ; o wee keere mmadụ niile azụ̀ abụọ ahụ. 42  Ha niile wee rie ihe oriri, rijuo afọ;+ 43  ha wee tụtụkọta nke ha rifọrọ erifọ. O wee ju nkata iri na abụọ, n’agụnyeghị azụ̀. 44  Ndị riri achịcha ahụ dị puku ndị ikom ise.+ 45  N’egbughị oge, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye n’ụgbọ wee buru ya ụzọ gaa n’ofe osimiri nke dị Betseida nso, ma ya onwe ya sịrị ìgwè mmadụ ahụ lawa.+ 46  Ma mgbe ọ sịchara ha gaa nke ọma, ọ gawara n’otu ugwu ka o kpee ekpere.+ 47  Ọ bụ mgbede ugbu a, ụgbọ mmiri ahụ nọkwa n’etiti oké osimiri, ma ọ bụ naanị ya nọ n’elu ala.+ 48  Mgbe ọ hụrụ na ọ na-esiri ha ike+ ịkwọ ụgbọ ahụ, n’ihi na ifufe na-efegide ha, n’ihe dị ka n’oge nche nke anọ* nke abalị, ọ bịawara n’ebe ha nọ, na-eje ije n’elu oké osimiri ahụ; ma o yiri ka ọ̀ chọrọ ịgafe ha. 49  Mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-eje ije n’elu oké osimiri, ha chere, sị: “Ọ bụ onyinyo ụgha!” ha wee tie mkpu.+ 50  N’ihi na ha niile hụrụ ya, obi wee lọọ ha mmiri. Ma ọ gwara ha okwu ozugbo, sị ha: “Nweenụ obi ike, ọ bụ m; unu atụla egwu.”+ 51  O wee bakwuru ha n’ụgbọ ahụ, ifufe ahụ wee kwụsị. O wee ju ha anya nke ukwuu n’ime onwe ha,+ 52  n’ihi na ha aghọtabeghị ihe achịcha ahụ pụtara, kama n’ime obi ha, ọ ka siiri ha ike ịghọta ihe.+ 53  Mgbe ha gafetara n’elu ala, ha batara n’ime Genesaret ma tụda arịlịka ụgbọ mmiri n’akụkụ ebe ahụ.+ 54  Ma ozugbo ha pụtara n’ụgbọ ahụ, ndị mmadụ matara onye ọ bụ, 55  ha wee gbagharịa n’ógbè ahụ dum wee malite iji ihe ndina na-ebute ndị ahụ́ na-enye nsogbu n’ebe ha nụrụ na ọ nọ. 56  N’obodo nta ọ bụla ma ọ bụ n’obodo ukwu ọ bụla ma ọ bụ n’ime ime obodo+ ọ bụla ọ banyere, ha na-ebusa ndị na-arịa ọrịa n’ọma ahịa, ha na-arịọkwa ya ka ha bitụ+ naanị ọnụ ọnụ+ uwe elu ya aka. E mekwara ka ahụ́ dị ndị niile bitụrụ ya aka mma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Mk 6:48*  Lee ihe e dere n’ala ala peeji na Mak 13:35.