Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mak 4:1-41

4  O wee malite ọzọ izi ihe n’akụkụ oké osimiri.+ Ìgwè mmadụ dị nnọọ ukwuu wee zukọta n’ebe ọ nọ, nke mere na ọ banyere n’ụgbọ ma gamitụ nke nta n’elu oké osimiri, ma ìgwè mmadụ ahụ niile ndị nọ n’akụkụ oké osimiri nọ n’ikpere mmiri ahụ.+  Ya mere, ọ malitere iji ihe atụ dị iche iche na-ezi ha ọtụtụ ihe,+ ọ gwakwara ha mgbe ọ na-ezi ihe,+ sị:  “Geenụ ntị. Lee! Ọgha mkpụrụ gawara ịgha mkpụrụ.+  Ka ọ nọkwa na-agha mkpụrụ, mkpụrụ ụfọdụ dara n’akụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịakwara richapụ ha.+  Mkpụrụ ndị ọzọ dakwara n’ebe nkume dị, bụ́ ebe ha na-enweghị ájá dị ukwuu, ha wee pulite ozugbo n’ihi enweghị ájá miri emi.+  Ma mgbe anyanwụ wara, ha chanwụrụ, ha kpọnwụkwara n’ihi na ha enweghị mgbọrọgwụ.+  Mkpụrụ ndị ọzọ dakwara n’etiti ogwu, ogwu ndị ahụ tolitekwara ma kpagbuo ha, ha amịghịkwa mkpụrụ ọ bụla.+  Ma ndị ọzọ dara n’ala dị mma,+ mgbe ha tolitere ma buo ibu, ha malitere ịmị mkpụrụ, ha na-amịkwa okpukpu iri atọ, nakwa iri isii nakwa otu narị.”+  O wee sị: “Onye nwere ntị ige ntị, ya gee ntị.”+ 10  Ma mgbe ọ nọ naanị ya, ndị nọ ya gburugburu, tinyere mmadụ iri na abụọ ahụ, malitere ịjụ ya ajụjụ banyere ihe atụ ndị ahụ.+ 11  O wee sị ha: “Ọ bụ unu ka e nyere ikike ịghọta ihe nzuzo dị nsọ+ nke alaeze Chineke, ma n’ebe ndị nọ n’èzí nọ, ihe niile na-eme bụụrụ ha ihe atụ,+ 12  ka ha wee lee anya ma ghara ịhụ ụzọ, ọ bụ ezie na ha na-ele anya, ka ha wee nụkwa ma ghara ịghọta ihe ọ pụtara, ọ bụ ezie na ha na-anụ ihe, ka ọ gharakwa inwe mgbe ha ga-agbanwe, e wee gbaghara ha.”+ 13  Ọ sịkwara ha: “Unu aghọtaghị ihe atụ a, oleezi otú unu ga-esi ghọta ihe atụ ndị nke ọzọ niile? 14  “Ọgha mkpụrụ na-agha okwu ahụ.+ 15  Ndị a bụ ndị dị n’akụkụ ụzọ bụ́ ebe a ghara okwu ahụ; ma ozugbo ha nụrụ ya, Setan na-abịa+ were okwu ahụ a ghara n’ime ha dị ka mkpụrụ.+ 16  N’otu aka ahụ, ndị a bụ ndị a ghara n’ebe nkume dị: ozugbo ha nụrụ okwu ahụ, ha na-eji ọṅụ nabata ya.+ 17  Ma ha enweghị mgbọrọgwụ n’ime onwe ha, kama ha na-anọru nwa oge; e mesịa, ozugbo ahụhụ ma ọ bụ mkpagbu malitere n’ihi okwu ahụ, ha na-asụ ngọngọ.+ 18  E nwekwara ndị ọzọ bụ́ ndị a ghara n’etiti ogwu; ndị a bụ ndị nụrụ okwu ahụ,+ 19  ma nchegbu+ nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụnụba+ na ọchịchọ+ maka ihe ndị ọzọ na-awabata ma kpagbuo okwu ahụ, o wee ghọọ nke na-amịghị mkpụrụ.+ 20  N’ikpeazụ, ndị a ghara n’ala dị mma bụ ndị na-ege ntị n’okwu ahụ, na-anabatakwa ya nke ọma ma na-amị mkpụrụ okpukpu iri atọ nakwa iri isii nakwa otu narị.”+ 21  O wee gaa n’ihu ịgwa ha, sị: “A dịghị ebute oriọna ka e wee dọba ya n’okpuru nkata ma ọ bụ n’okpuru ihe ndina, ka à na-eme otú ahụ? A na-ebute ya ka a dọba ya n’elu ihe ndọba oriọna, ọ́ bụghị ya?+ 22  N’ihi na ọ dịghị ihe e zoro ezo ma ọ́ bụghị ka e wee kpughee ya; ọ dịghị ihe e zochiri nke ọma ma ọ́ bụghị ka o wee pụta ìhè.+ 23  Onye ọ bụla nwere ntị ige ntị, ya gee ntị.”+ 24  Ọ gwakwara ha, sị: “Geenụ ntị n’ihe unu na-anụ.+ Ihe unu ji atụ̀ ihe ka a ga-eji tụọrọ unu,+ ee, a ga-atụkwasịkwara unu ihe.+ 25  N’ihi na onye nwere ka a ga-enyekwu; ma onye na-enweghị, a ga-anapụ ya ọbụna ihe o nwere.”+ 26  Ọ gakwara n’ihu ịsị: “N’ụzọ dị otú a, alaeze Chineke dị nnọọ ka mgbe mmadụ ghara mkpụrụ n’ala,+ 27  o wee hie ụra n’abalị ma bilie mgbe chi bọrọ, mkpụrụ ndị ahụ wee pulite ma too ogologo, otú o si mee, ọ maghị.+ 28  Ala ahụ ji nwayọọ nwayọọ mịa mkpụrụ n’onwe ya, akwụkwọ ya bu ụzọ pụta, e mesịa, oko ya pụtara, n’ikpeazụ, mkpụrụ kara aka si n’oko ya ahụ pụta. 29  Ma ozugbo mkpụrụ ahụ kara, o ji mma e ji ewe ihe ubi were ya, n’ihi na oge owuwe ihe ubi eruwo.” 30  O wee gaa n’ihu ịsị: “Olee ihe anyị ga-eji alaeze Chineke tụnyere, ma ọ bụ, olee ihe atụ anyị ga-eji kọwaa ya?+ 31  Ọ dị ka mkpụrụ osisi mọstad, nke bụ́ mkpụrụ kasị nta n’ime mkpụrụ niile dị n’ụwa n’oge a kụrụ ya n’ala+ 32  ma mgbe a kụrụ ya, ọ na-etolite ma dị ukwuu karịa mkpụrụ akụ́kụ́ niile ọzọ, ọ na-epupụtakwa alaka ndị buru ibu,+ nke mere na ụmụ nnụnụ nke eluigwe+ na-enwe ike ịchọta ebe ha ga-ebi n’okpuru ndò ya.”+ 33  Ya mere, ọ na-eji ọtụtụ ihe atụ+ ndị dị otú ahụ agwa ha okwu Chineke, ruo n’ókè ha nwere ike ige ntị. 34  N’ezie, ọ dịghị agwa ha okwu ma ọ bụrụ na o jighị ihe atụ, ma mgbe naanị ha nọ, ọ na-akọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe niile.+ 35  N’ụbọchị ahụkwa, mgbe o ruru ná mgbede, ọ sịrị ha: “Ka anyị gafee n’ikpere mmiri nke ọzọ.”+ 36  Ya mere, mgbe ha gwasịrị ìgwè mmadụ ahụ ka ha laa, ha ji ụgbọ ahụ ọ nọ kwọrọ ya, e nwekwara ụgbọ ndị ọzọ so ya.+ 37  Oké ifufe malitere ife, ebili mmiri nọkwa na-etikwasị ụgbọ ahụ ma na-abanye n’ime ya, nke mere na ọ fọrọ nke nta ka mmiri ju n’ụgbọ ahụ.+ 38  Ma ọ nọ n’azụ ụgbọ ahụ, jiri ohiri isi na-ehi ụra. Ha wee kpọtee ya, sị ya: “Onye Ozizi, ọ́ dịghị emetụ gị n’obi na anyị na-aga ịla n’iyi?”+ 39  O wee bilie baara ifufe ahụ mba, sịkwa oké osimiri ahụ: “Shịị! Daa jụụ!”+ Ifufe ahụ wee kwụsị, ebe niile wee daa jụụ.+ 40  O wee sị ha: “Gịnị mere obi ji na-amapụ unu? Ọ̀ bụ na unu enwebeghị okwukwe ọ bụla?” 41  Ma oké egwu tụrụ ha, ha na-agwakwa ibe ha, sị: “Ònye n’ezie ka onye a bụ, n’ihi na ọbụna ifufe na oké osimiri na-erubere ya isi?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji