Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mak 3:1-35

3  Ọ banyere ọzọ n’ụlọ nzukọ, otu nwoke nke otu aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọkwa n’ebe ahụ.+  Ya mere, ha legidesiri ya anya ike ka ha hụ ma ọ̀ ga-agwọ nwoke ahụ n’ụbọchị izu ike, ka ha wee bo ya ebubo.+  O wee gwa nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie bịa n’etiti.”  O wee sị ha: “Iwu ọ̀ kwadoro ime ihe ọma n’ụbọchị izu ike ka ọ̀ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta mkpụrụ obi ka ọ̀ bụ igbu mkpụrụ obi?”+ Ma ha gbachiri nkịtị.  Mgbe o lesịrị ha anya gburugburu n’iwe, o wutere ya nke ukwuu na ha bụ ndị ihe na-adịghị emetụ n’obi,+ o wee sị nwoke ahụ: “Gbatịa aka gị.” O wee gbatịa ya, e wee mee ka aka ya dị mma.+  Ndị Farisii wee pụọ n’èzí, ha na ndị òtù Herọd+ wee malite ịgbara ya izu ozugbo, ka ha wee gbuo ya.+  Ma Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gaa n’oké osimiri; oké ìgwè mmadụ ndị si Galili na Judia sokwaara ya.+  Mgbe oké ìgwè mmadụ ndị si ọbụna Jeruselem na Idumia nakwa n’ofe Jọdan nakwa gburugburu Taya+ na Saịdọn nụrụ banyere ọtụtụ ihe ndị ọ nọ na-eme, ha bịakwutere ya.  O wee gwa ndị na-eso ụzọ ya ka e debere ya otu obere ụgbọ mmiri ọ ga na-anọ mgbe niile ka ìgwè mmadụ ahụ wee ghara ịkpagide ya. 10  N’ihi na ọ gwọrọ ọtụtụ ndị, ndị niile nwere ajọ ọrịa dị iche iche nọ na-adakwasị ya ka ha bitụ ya aka.+ 11  Ọbụna mgbe ọ bụla ndị mmụọ na-adịghị ọcha+ hụrụ ya, ha na-ada n’ala n’ihu ya, tie mkpu, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke.”+ 12  Ma o nyesiri ha iwu ike ọtụtụ ugboro ka ha ghara ime ka a mata ya.+ 13  O wee rịgoro n’otu ugwu ma kpọọ ndị ọ chọrọ,+ ha wee gakwuru ya.+ 14  O wee họpụta mmadụ iri na abụọ, bụ́ ndị ọ kpọkwara “ndịozi,” ka ha na ya wee na-anọ, ka o wee zipụkwa ha ikwusa ozi ọma,+ 15  ka ha nweekwa ikike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ.+ 16  Mmadụ iri na abụọ ahụ ọ họpụtara bụ Saịmọn, onye ọ kpọkwara Pita,+ 17  na Jems nwa Zebedi na Jọn nwanne Jems+ (ọ gụkwara ha Boanajis, nke pụtara Ụmụ Égbè Eluigwe), 18  na Andru na Filip na Batọlọmiu na Matiu na Tọmọs na Jems nwa Alfiọs na Tadiọs na Saịmọn, onye na-anụ ọkụ n’obi, 19  nakwa Judas Iskarịọt, bụ́ onye mesịrị rara ya nye.+ O wee banye n’otu ụlọ. 20  Ìgwè mmadụ gbakọkwara ọzọ, nke mere na ha enweghị ike ọbụna iri nri.+ 21  Ma mgbe ndị ikwu ya+ nụrụ ya, ha pụrụ ka ha gaa jide ya, n’ihi na ha nọ na-ekwu, sị: “Isi emebiela ya.”+ 22  Ndị odeakwụkwọ, ndị si Jeruselem bịa, nọkwa na-asị: “O nwere Bielzebọb, o ji ike nke onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 23  Ya mere, mgbe ọ kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, ọ malitere iji ihe atụ na-agwa ha okwu, sị: “Olee otú Setan pụrụ isi chụpụ Setan? 24  Ọ bụrụ na alaeze ekewaa wee na-emegide onwe ya, alaeze ahụ apụghị iguzo;+ 25  ọ bụrụkwa na ụlọ ekewaa wee na-emegide onwe ya, ụlọ ahụ agaghị eguzoli.+ 26  Ọ bụrụkwa na Setan ebiliwo na-emegide onwe ya ma kewaa ekewa, ọ pụghị iguzo, kama mbibi ya eruwo.+ 27  N’eziokwu, ọ dịghị onye ọ bụla banyere n’ụlọ nwoke dị ike nke ga-enwe ike ibukọrọ ngwongwo ya+ ndị a pụrụ ibupụ ebupụ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ụzọ kee nwoke ahụ dị ike agbụ, mgbe ahụkwa, ọ ga-ebukọrọ ihe ndị dị n’ụlọ ya.+ 28  N’ezie, ana m asị unu na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ ihe niile, n’agbanyeghị mmehie niile ha mere na nkwulu niile ha kwuluru.+ 29  Otú ọ dị, onye ọ bụla nke na-ekwulu mmụọ nsọ, a gaghị agbaghara ya ruo mgbe ebighị ebi, kama ọ bụ onye ikpe mmehie mara ruo mgbe ebighị ebi.”+ 30  O kwuru ihe a n’ihi na ha nọ na-asị: “O nwere mmụọ na-adịghị ọcha.”+ 31  Nne ya na ụmụnne ya ndị ikom+ wee bịa, ka ha guzo n’èzí, ha ziri ozi ka a kpọọ ya.+ 32  Otú ọ dị, ìgwè mmadụ nọ ọdụ gburugburu ya, ha wee sị ya: “Lee! Nne gị na ụmụnne gị ndị ikom na-achọ gị. Ha nọ n’èzí.”+ 33  Ma ọ zara ha, sị: “Olee ndị bụ nne m na ụmụnne m ndị ikom?”+ 34  Mgbe o lere ndị ahụ nọ ya gburugburu anya, ọ sịrị: “Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị ikom!+ 35  Onye ọ bụla nke na-eme uche Chineke, ọ bụ ya bụ nwanne m nwoke na nwanne m nwaanyị na nne m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji