Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mak 2:1-28

2  Otú ọ dị, mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, ọ banyere ọzọ na Kapaniọm, a kọkwara akụkọ na ọ nọ n’ụlọ.+  N’ihi ya, ọtụtụ ndị gbakọrọ, ha dị ọtụtụ nke na ohere adịkwaghị, ọbụnadị n’akụkụ ọnụ ụzọ, o wee malite ịgwa ha okwu Chineke.+  Ndị mmadụ buteere ya otu onye nke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, nke mmadụ anọ bu.+  Ma ebe ha na-enweghị ike ibute ya n’ebe Jizọs nọ kpọmkwem n’ihi ìgwè mmadụ ahụ, ha kpupụrụ elu ụlọ ebe ọ nọ, mgbe ha gwupukwara oghere, ha budara ihe ndina ahụ nke onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ dina.+  Mgbe Jizọs hụrụ okwukwe ha,+ ọ sịrị onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ: “Nwa m, a gbagharawo gị mmehie gị.”+  Ma ụfọdụ ndị odeakwụkwọ nọ n’ebe ahụ, ha nọ ọdụ ma na-atụgharị n’obi ha,+ sị:  “Gịnị mere nwoke a ji na-ekwu okwu otú a? Ọ na-ekwulu Chineke. Ònye pụrụ ịgbaghara mmehie ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke?”+  Ma ozugbo Jizọs chọpụtara ná mmụọ ya na ọ bụ ihe dị otú ahụ ka ha na-atụgharị n’uche n’ime onwe ha, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-atụgharị ihe ndị a n’obi unu?+  Olee nke ka mfe, ọ̀ bụ ịsị onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharawo gị mmehie gị,’ ka ọ̀ bụ ịsị, ‘Bilie bulite ihe ndina gị gawa ije’?+ 10  Ma ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ+ nwere ikike ịgbaghara mmehie n’elu ụwa,”+—ọ gwara onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: 11  “Ana m asị gị, Bilie, buru ihe ndina gị, lawa n’ụlọ gị.”+ 12  O wee bilie, buru ihe ndina ya ozugbo ma si n’ihu ha niile pụọ,+ ha niile wee nwee oké ọṅụ, ha tokwara Chineke, sị: “Anyị ahụtụbeghị ụdị ya.”+ 13  Ọ gara ọzọ n’akụkụ oké osimiri; ìgwè mmadụ ahụ niile nọkwa na-abịakwute ya, o wee malite izi ha ihe. 14  Ma mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ Livaị+ nwa Alfiọs ka ọ nọ ọdụ n’ụlọ a na-anakọta ụtụ, o wee sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” O wee bilie soro ya.+ 15  Mgbe e mesịrị, Ọ nọdụrụ ala iri ihe na tebụl n’ụlọ ya, ọtụtụ ndị ọnaụtụ+ na ndị mmehie sokwa Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ ala na-eri ihe, n’ihi na ha dị ọtụtụ, ha wee malite iso ya.+ 16  Ma mgbe ndị odeakwụkwọ nke ndị Farisii hụrụ na o so ndị mmehie na ndị ọnaụtụ na-eri ihe, ha malitere ịsị ndị na-eso ụzọ ya: “Ọ̀ na-eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie eri ihe?”+ 17  Mgbe Jizọs nụrụ ya, ọ sịrị ha: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị na-arịa ọrịa. Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.”+ 18  Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii na-ebu ọnụ. Ya mere, ha bịara jụọ ya, sị: “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ?”+ 19  Jizọs wee sị ha: “Mgbe ha na nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ, ndị enyi nke nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ apụghị ibu ọnụ,+ ka hà pụrụ? Ọ bụrụhaala na ha na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ, ha apụghị ibu ọnụ.+ 20  Ma ụbọchị na-abịa mgbe a ga-akpọpụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ n’ebe ha nọ, mgbe ahụ, ha ga-ebu ọnụ n’ụbọchị ahụ.+ 21  Ọ dịghị onye na-adụnye ibé ákwà ọhụrụ n’uwe elu mere ochie; ọ bụrụ na e mee otú ahụ, ike dum nke ákwà ọhụrụ ahụ nwere na-eme ka nke ochie ahụ dọkaa, ọ na-adọwa wee ka njọ.+ 22  Ọ dịghịkwa onye na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya mere ochie; ọ bụrụ na o mee otú ahụ, mmanya ahụ na-agbawa karama akpụkpọ ahụ, mmanya ahụ na karama akpụkpọ ahụ na-alakwa n’iyi.+ Kama ndị mmadụ na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ mmanya ọhụrụ.”+ 23  O wee si n’ubi ọka wit na-agafe n’ụbọchị izu ike, ndị na-eso ụzọ ya malitekwara ịghọrọ+ ụyọkọ ọka wit.+ 24  Ndị Farisii wee sị ya: “Lee anya! Gịnị mere ha ji na-eme ihe iwu na-akwadoghị n’ụbọchị izu ike?”+ 25  Ma ọ sịrị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe Devid+ mere mgbe ọ na-enweghị ihe oriri, agụụ wee na-agụ ya, ya na ndị ikom so ya?+ 26  Ọ̀ bụ na ọ banyeghị n’ụlọ Chineke, dị ka e dere n’ihe ndekọ banyere Abayata+ bụ́ onyeisi nchụàjà, ma rie achịcha e chere n’ihu Chineke,+ bụ́ nke iwu na-akwadoghị+ ka onye ọ bụla rie ma e wezụga ndị nchụàjà, o nyekwara ndị ya na ha so?”+ 27  Ya mere, ọ gara n’ihu ịgwa ha, sị: “Ụbọchị izu ike malitere ịdị n’ihi mmadụ,+ ọ bụghị mmadụ malitere ịdị n’ihi ụbọchị izu ike;+ 28  n’ihi ya, Nwa nke mmadụ bụ Onyenwe ụbọchị izu ike.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji