Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mak 14:1-72

14  A ga-enwe ememme ngabiga+ na ememme+ achịcha na-ekoghị eko n’ụbọchị abụọ na-abịa abịa.+ Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na-achọkwa otú ha ga-esi were ụzọ akọ jide ya ma gbuo ya;+  n’ihi na ha kwuru ugboro ugboro, sị: “Ọ bụghị n’oge ememme a; ma eleghị anya, ndị mmadụ nwere ike ịkpata ọgba aghara.”+  Mgbe ọ nọ na Betani n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta,+ ka ọ nọ na-eri nri, otu nwaanyị ji mkpọ̀ alabasta mmanụ nke na-esi ísì ụtọ bịa. Ọ bụ ezigbo mmanụ nad nke dị oké ọnụ. Mgbe o mepere mkpọ̀ alabasta ahụ, ọ malitere ịwụkwasị ya n’isi Ya.+  Ya mere, ụfọdụ ndị ji iwe na-ekwu n’etiti onwe ha, sị: “Gịnị mere e ji laa mmanụ a na-esi ísì ụtọ n’iyi otú a?+  N’ihi na a gaara ere mmanụ a na-esi ísì ụtọ ihe karịrị narị mkpụrụ ego dinarịọs atọ, were ya nye ndị ogbenye!” Ha nọkwa na-ewesa nwaanyị ahụ iwe nke ukwuu.+  Ma Jizọs sịrị: “Hapụnụ ya. Gịnị mere unu ji na-enye ya nsogbu? O meere m ihe ọma.+  N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile,+ unu pụkwara imere ha ihe ọma mgbe niile mgbe ọ bụla unu chọrọ, ma mụ na unu anọghị mgbe niile.+  O mere ihe o nwere ike ime; o tere ahụ́ m mmanụ na-esi ísì ụtọ iji kwadebe m tupu oge eruo maka olili m.+  N’ezie, ana m asị unu, N’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụwa dum,+ a ga na-akọ ihe nwaanyị a mere ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta ya.”+ 10  Judas Iskarịọt, otu n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ, wee gakwuru ndị isi nchụàjà ka o wee rara ya nye n’aka ha.+ 11  Mgbe ha nụrụ ya, ha ṅụrịrị ọṅụ wee kwe nkwa inye ya ego ọlaọcha.+ Ya mere, ọ malitere ịchọ ụzọ dị mfe ọ ga-esi rara ya nye.+ 12  N’ụbọchị mbụ nke ememme achịcha na-ekoghị eko,+ mgbe ha na-achụ anụ e ji eme ememme ngabiga n’àjà dị ka omenala ha si dị, ndị na-eso ụzọ ya+ sịrị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị gaa kwadebe ka ị nọrọ rie nri ememme ngabiga?”+ 13  O wee zipụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha: “Gaanụ n’ime obodo, otu nwoke nke bu udu mmiri ga-ezute unu.+ Soronụ ya, 14  n’ebe ọ bụla ọ banyere, sịnụ onyeisi ezinụlọ ahụ, ‘Onye Ozizi sịrị: “Olee ọnụ ụlọ ndị ọbịa e debeere m, bụ́ ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m+ ga-anọ rie nri ememme ngabiga?”’+ 15  Ọ ga-egosi unu nnukwu ọnụ ụlọ dị n’elu, nke a kwadebere, doziekwa; kwadeberenụ anyị nri ememme ngabiga n’ebe ahụ.”+ 16  Ya mere, ndị na-eso ụzọ ya gawara, ha wee banye n’ime obodo wee hụ ya dị nnọọ ka ọ gwara ha; ha wee kwadebe maka ememme ngabiga ahụ.+ 17  Mgbe o ruru ná mgbede, ya na mmadụ iri na abụọ ahụ bịara.+ 18  Mgbe ha nọ na-eri ihe na tebụl, Jizọs sịrị: “N’ezie, ana m asị unu, Otu onye n’ime unu, onye mụ na ya na-erikọ nri,+ ga-arara m nye.”+ 19  Ha malitere inwe mwute, na-agwa ya n’otu n’otu, sị: “Ọ bụghị m, ka ọ̀ bụ m?”+ 20  Ọ sịrị ha: “Ọ bụ otu onye n’ime unu mmadụ iri na abụọ, onye mụ na ya ga-esurukọ achịcha n’otu efere.+ 21  N’ezie, Nwa nke mmadụ na-ahapụ, dị nnọọ ka e dere banyere ya, ma ahụhụ ga-adịrị onye a ga-esi n’aka ya rara Nwa nke mmadụ nye! Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”+ 22  Ka ha nọ na-eri ihe, o weere otu ogbe achịcha, gọzie ya, nyawaa ya, were ya nye ha, sị: “Naranụ ya, nke a pụtara ahụ́ m.”+ 23  O bukwaara otu iko, kelee Chineke, bunyekwa ha ya. Ha niile wee ṅụọ ya.+ 24  O wee sị ha: “Nke a pụtara ‘ọbara m+ nke ọgbụgba ndụ ahụ,’+ nke a ga-awụpụ+ n’ihi ọtụtụ mmadụ.+ 25  N’ezie, ana m asị unu, Agaghị m aṅụ mmanya si ná mkpụrụ vaịn ọzọ ruo ụbọchị ahụ m ga-aṅụ ya nke ọhụrụ n’alaeze Chineke.”+ 26  N’ikpeazụ, mgbe ha bụsịrị abụ otuto,+ ha pụrụ gaa n’Ugwu Oliv.+ 27  Jizọs wee sị ha: “Unu niile ga-asụ ngọngọ, n’ihi na e dere, sị, ‘M ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ,+ atụrụ ya ga-agbasasịkwa.’+ 28  Ma mgbe a kpọlitesịrị m, m ga-ebu unu ụzọ gaa Galili.”+ 29  Ma Pita sịrị ya: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile asụọ ngọngọ, agaghị m asụ ngọngọ.”+ 30  Jizọs wee sị ya: “N’ezie, ana m asị gị, Gị onwe gị, taa, ee, n’abalị a, tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ, gị onwe gị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ 31  Ma ọ malitere ikwusi ike, sị: “Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, agaghị m agọnahụ gị ma ọlị.” Ndị ọzọ niile malitekwara ikwu otu ihe ahụ.+ 32  Ha wee bịa n’ebe a na-akpọ Getsemeni, o wee gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nọdụnụ ala n’ebe a ka m gaa kpee ekpere.”+ 33  O wee kpọrọ Pita, Jems na Jọn.+ Ọ malitere inwe mwute, na-echegbukwa onwe ya nke ukwuu.+ 34  O wee sị ha: “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu,+ ọbụna ruo ọnwụ. Nọrọnụ n’ebe a, na-echenụ nche.”+ 35  Mgbe ọ gatụrụ n’ihu, ọ dara n’ala wee malite ikpe ekpere ka oge awa ahụ gabiga ya, ma ọ bụrụ na o kwere omume.+ 36  O wee gaa n’ihu ịsị: “Aba, Nna,+ ihe niile kwere omume n’ebe ị nọ; wepụ iko a n’ebe m nọ. Ma ọ bụghị ihe m chọrọ, kama ihe ị chọrọ.”+ 37  O wee bịa hụ ha ka ha na-ehi ụra, o wee gwa Pita, sị: “Saịmọn, ị̀ na-ehi ụra? Í nweghị ike ị ga-eji chee nche ruo otu awa?+ 38  Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere,+ ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa. N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”+ 39  O wee pụọ ọzọ ma kpee ekpere, kwuo otu okwu ahụ.+ 40  Ọ bịaghachikwara hụ ha ka ha na-ehi ụra, n’ihi na ụra dị ha n’anya, ya mere, ha amaghị ihe ha ga-aza ya.+ 41  O wee bịa nke ugboro atọ wee sị ha: “N’ụdị oge dị otú a ka unu na-ehi ụra, na-ezu ike! O zuwo! Oge awa ahụ eruwo!+ Lee! A na-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie.+ 42  Bilienụ, ka anyị pụọ.+ Lee! Onye ga-arara m nye abịaruwo nso.”+ 43  Ozugbo ahụ, mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, Judas, otu n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ, bịarutere, ya na ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na okpiri, ndị si n’ebe ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye nọ.+ 44  Onye ga-arara ya nye nyere ha ihe àmà ya na ha kwekọrịtara, sị: “Onye ọ bụla m susuru ọnụ, ọ bụ ya; jidenụ ya, leziekwanụ anya kpụrụ ya gawa.”+ 45  O wee bịaruo nso kpọmkwem n’ebe ọ nọ, sị: “Rabaị!” ma jiri nwayọọ susuo ya ọnụ.+ 46  Ya mere, ha kpaara ya aka wee jide ya.+ 47  Otú ọ dị, otu n’ime ndị guzo n’akụkụ mịịrị mma agha ya, gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà wee bepụ ya ntị.+ 48  Ma Jizọs sịrị ha: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ijide m dị ka à ga-asị na unu bịara ijide onye na-apụnara mmadụ ihe?+ 49  Mụ na unu na-anọ n’ụlọ nsọ kwa ụbọchị, m wee na-ezi ihe,+ ma unu ejideghị m. Otú o sina dị, ọ bụ ka Akwụkwọ Nsọ+ wee mezuo.”+ 50  Ha niile wee hapụ+ ya gbaa ọsọ.+ 51  Ma otu nwa okorobịa nke yi uwe linin mara mma, nke na-eyighị ihe ọzọ n’ahụ́, malitere iso ya n’azụ, ọ nọghịkwa ebe dị anya; ha nwakwara ijide ya,+ 52  ma ọ hapụrụ uwe linin ya wee gbara ahụ́ ọtọ gbalaga. 53  Ha duuru Jizọs gakwuru nnukwu onye nchụàjà, ndị isi nchụàjà na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ niile zukọkwara.+ 54  Ma Pita sooro ya, ọ nọkwa n’ebe dịtụ anya, o wee soro ya+ ruo na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà ahụ; o sokwa ndị na-eje ozi n’ụlọ nọrọ ọdụ na-anya ọkụ n’ihu otu ọkụ nke na-enwu nke ọma. 55  N’oge ahụ, ndị isi nchụàjà na Sanhedrin dum na-achọgharị ihe a ga-eji gbagide Jizọs akaebe ka ha wee gbuo ya,+ ma ọ dịghị nke ha na-ahụ.+ 56  N’ezie, ọtụtụ ndị nọ na-agbagide ya akaebe ụgha,+ ma akaebe ha ekwekọrịtaghị.+ 57  Ụfọdụ ndị na-ebilikwa ma na-agbagide ya akaebe ụgha, sị: 58  “Anyị nụrụ ka ọ na-asị, ‘M ga-akwatu ụlọ nsọ a nke e ji aka mee, n’ime ụbọchị atọ, m ga-ewu ọzọ nke a na-ejighị aka mee.”’+ 59  Ma akaebe ha ekwekọrịtaghịkwa n’ihe ndị a. 60  N’ikpeazụ, nnukwu onye nchụàjà ahụ biliri n’etiti ha wee jụọ Jizọs, sị: “Ó nweghị ihe ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu n’akaebe a ndị a na-agbagide gị?”+ 61  Ma ọ gbachiri nkịtị, ọ dịghịkwa ihe ọ zara ma ọlị.+ Nnukwu onye nchụàjà ahụ malitere ọzọ ịjụ ya, sị: “Ọ̀ bụ gị bụ Kraịst, Ọkpara nke Onye A Gọziri Agọzi?”+ 62  Jizọs wee sị: “Ọ bụ m; unu onwe unu ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ+ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri+ nke ike ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”+ 63  Nnukwu onye nchụàjà ahụ wee dọwaa uwe ime ya+ ma kwuo, sị: “Ọ̀ ka dị anyị mkpa ịchọ ndị akaebe?+ 64  Unu nụrụ nkwulu ahụ.+ Gịnị ka unu chọpụtara?” Ha niile mara ya ikpe na o kwesịrị ọnwụ. 65  Ụfọdụ wee malite ịgbụ ya ọnụ mmiri+ na ikpuchi ihu ya dum na isu ya ọkpọ na ịsị ya: “Buo amụma!” Ndị na-eje ozi n’ụlọikpe mara ya ụra n’ihu wee kpụrụ ya pụọ.+ 66  Mgbe Pita nọ n’ala na mbara èzí ahụ, otu n’ime ụmụ agbọghọ ndị na-ejere nnukwu onye nchụàjà ahụ ozi bịara,+ 67  mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o legidere ya anya wee sị: “Gị onwe gị kwa na onye Nazaret, bụ́ Jizọs a, na-anọ.”+ 68  Ma ọ gọrọ agọ, sị: “Amaghị m onye ọ bụ, aghọtaghịkwa m ihe ị na-ekwu,” o wee pụọ n’èzí gaa n’ime ọnụ ụlọ mbata.+ 69  Mgbe nwa agbọghọ ahụ na-eje ozi hụrụ ya n’ebe ahụ, ọ malitekwara ịsị ndị guzo n’akụkụ: “Onye a bụ otu n’ime ha.”+ 70  Ọ gọrọ agọ ọzọ. Mgbe nwa oge gasịrị, ndị guzo n’akụkụ malitere ịgwa Pita, sị: “N’ezie ị bụ otu n’ime ha, n’ihi na, n’eziokwu, ị bụ onye Galili.”+ 71  Ma o bidoro ịbụ onwe ya ọnụ na ịṅụ iyi,+ sị: “Amaghị m onye a unu na-ekwu banyere ya.”+ 72  Ozugbo ahụ, oké ọkpa kwara nke ugboro abụọ;+ Pita wee cheta okwu Jizọs gwara ya: “Tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ O jitelighị onwe ya, o wee malite ibe ákwá.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji