Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mak 13:1-37

13  Mgbe o si n’ụlọ nsọ ahụ na-apụ, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Onye Ozizi, ị̀ hụkwara ụdị nkume ndị a na ụdị ụlọ ndị a?”+  Otú ọ dị, Jizọs sịrị ya: “Ị̀ hụrụ nnukwu ụlọ ndị a?+ A gaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya+ ma ọlị n’ebe a n’akwatughị ya.”+  Mgbe ọ nọ ọdụ n’Ugwu Oliv, chee ụlọ nsọ ahụ ihu, Pita+ na Jems na Jọn na Andru malitere ịjụ ya mgbe naanị ha nọ,+ sị:  “Gwa anyị, Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọgwụgwụ ihe ndị a niile?”+  Ya mere, Jizọs malitere ịsị ha: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu.+  Ọtụtụ ndị ga-abịa n’aha m, sị, ‘Ọ bụ m bụ ya,’ ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ.+  Mgbe unu na-anụkwa mkpọtụ agha na akụkọ agha, unu atụla ụjọ; ihe ndị a aghaghị ime, ma ọgwụgwụ erubeghị.+  “N’ihi na mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha,+ a ga-enwe ala ọma jijiji+ n’ebe dị iche iche, a ga-enwe ụkọ nri.+ Ihe ndị a bụ mmalite ihe ụfụ nke nhụjuanya.+  “Ma unu onwe unu, lezienụ anya; ndị mmadụ ga-akpụrụ unu gaa n’ụlọikpe obodo,+ a ga-etikwa unu ihe n’ụlọ nzukọ,+ a ga-emekwa ka unu guzoro n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka ọ bụrụ àmà nye ha.+ 10  A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa+ ozi ọma+ ahụ ná mba niile. 11  Ma mgbe ha du unu na-aga ka ha nyefee unu, unu ebula ụzọ na-echegbu onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu;+ kama ihe ọ bụla e nyere unu n’oge awa ahụ, kwuonụ ya, n’ihi na ọ bụghị unu na-ekwu, kama ọ bụ mmụọ nsọ na-ekwu.+ 12  Nwanne ga-enyefekwa nwanne ya n’aka ọnwụ, nna ga-enyefekwa nwa,+ ụmụ ga-ebilikwa megide nne na nna ha ma mee ka e gbuo ha;+ 13  mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.+ Ma, ọ bụ onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ+ ka a ga-azọpụta.+ 14  “Otú ọ dị, mgbe unu hụrụ ihe arụ+ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu+ ka o guzo n’ebe ọ na-ekwesịghị iguzo (onye na-agụ, ya jiri nghọta mee ihe).+ Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.+ 15  Ka onye nọ n’elu ụlọ ghara ịrịdata, ya abanyekwala n’ụlọ ya ka o were ihe ọ bụla;+ 16  onye nọ n’ubi, ya alaghachikwala n’ihe ndị ọ hapụrụ ka ọ chịrị uwe elu ya.+ 17  Ahụhụ ga-adịrị ụmụ nwaanyị dị ime na ndị na-enye nwa ara n’ụbọchị ndị ahụ!+ 18  Na-ekpenụ ekpere ka ọ ghara ime n’oge oyi;+ 19  n’ihi na ụbọchị ndị ahụ ga-abụ ụbọchị mkpagbu+ nke a na-enwebeghị ụdị ya kemgbe ihe ndị Chineke kere malitere ịdị ruo mgbe ahụ, a gaghị enwekwa ya ọzọ.+ 20  N’eziokwu, ọ bụrụ na Jehova emeghị+ ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta anụ ahụ́ ọ bụla. Ma n’ihi ndị a họọrọ,+ ya bụ, ndị ọ họọrọ,+ o mewo ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi.+ 21  “Mgbe ahụkwa, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, ‘Lee! Kraịst nọ n’ebe a,’ ‘Lee! Ọ nọ n’ebe ahụ,’+ unu ekwela.+ 22  N’ihi na Kraịst ụgha na ndị amụma ụgha ga-ebili+ ma mee ihe ịrịba ama na ihe ijuanya+ dị iche iche iji duhie ndị a họọrọ, ma ọ bụrụ na o kwere omume.+ 23  Ya mere, lezienụ anya;+ agwawo m unu ihe niile tupu oge eruo.+ 24  “Ma n’ụbọchị ndị ahụ, mgbe mkpagbu ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghịkwa enye ìhè ya, 25  kpakpando ga-esikwa n’eluigwe na-adapụsị, a ga-emekwa ka ike ndị dị n’eluigwe maa jijiji.+ 26  Mgbe ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ+ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii n’ike na ebube dị ukwuu.+ 27  Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi, ha ga-esikwa n’akụkụ anọ nke ụwa* chịkọta ndị ọ họọrọ,+ site na nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ eluigwe.+ 28  “Sinụ n’osisi fig mụta ihe atụ a: Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro ma pupụtawa akwụkwọ, unu na-amara na oge okpomọkụ dị nso.+ 29  N’otu aka ahụkwa, mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na ọ nọ nso n’ọnụ ụzọ.+ 30  N’ezie, ana m asị unu na ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe ndị a niile mere.+ 31  Eluigwe+ na ụwa ga-agabiga, ma okwu m+ agaghị agabiga.+ 32  “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama naanị Nna m maara.+ 33  Na-elenụ anya, mụrụnụ anya,+ n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ.+ 34  Ọ dị ka nwoke jewere mba ọzọ,+ nke hapụrụ ụlọ ya ma nye ndị ohu ya ikike. O nyere onye nke ọ bụla ọrụ ọ ga-arụ, nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ na-eche nche. 35  Ya mere, na-echenụ nche,+ n’ihi na unu amaghị mgbe nna nwe ụlọ ga-abịa, ma ọ̀ bụ n’uhuruchi ka ọ̀ bụ n’etiti abalị ka ọ̀ bụ mgbe oké ọkpa ji akwa ka ọ̀ bụ n’isi ụtụtụ;*+ 36  ka o wee ghara ịhụ unu ka unu na-ehi ụra mgbe ọ lọtara na mberede.+ 37  Ma ihe m na-agwa unu ka m na-agwa mmadụ niile, Na-echenụ nche.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Mk 13:27*  Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “ifufe anọ.”
Mk 13:35*  ‘Uhuruchi’ bụ oge nche nke mbụ dị ka ndị Grik na ndị Rom si kebie abalị. Ọ na-amalite mgbe anyanwụ dara ruo n’elekere itoolu nke abalị. ‘Etiti abalị’ bụ oge nche nke abụọ, dị ka ndị Grik na ndị Rom si kebie abalị. Ọ na-amalite n’ihe dị ka n’elekere itoolu nke abalị ruo n’etiti abalị. ‘Mgbe oké ọkpa ji akwa’ bụ oge nche nke atọ dị ka ndị Grik na ndị Rom si kebie abalị. Ọ na-amalite n’etiti abalị ruo ihe dị ka n’elekere atọ nke abalị. ‘Isi ụtụtụ’ bụ oge nche nke anọ dị ka ndị Grik na ndị Rom si kebie abalị. Ọ na-amalite n’ihe dị ka n’elekere atọ nke abalị ruo mgbe anyanwụ wara.