Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Mak 11:1-33

11  Mgbe ha na-abịaru Jeruselem nso, na-erute Betfeji na Betani+ n’Ugwu Oliv, o zipụrụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya+  wee sị ha: “Banyenụ n’obodo nta a unu na-ahụ, ozugbo unu banyere n’ime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya ibu e liwere eliwe, nke mmadụ ọ bụla na-anọkwasịtụbeghị; tọpụnụ ya, kpụtakwanụ ya.+  Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla asị unu, ‘Gịnị mere unu ji na-eme nke a?’ sịnụ ya, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụtaghachikwa ya ozugbo n’ebe a.’”+  Ha wee gawa wee hụ nwa ịnyịnya ibu ahụ ka e liwere ya n’ọnụ ụzọ, n’èzí n’okporo ámá dị n’akụkụ, ha wee tọpụ ya.+  Ma ụfọdụ ndị guzo n’ebe ahụ malitere ịsị ha: “Gịnị mere unu ji na-atọpụ nwa ịnyịnya ibu ahụ?”+  Ha gwara ha nnọọ ihe Jizọs kwuru; ha wee hapụ ha ka ha gawa.+  Ha wee kpụtara Jizọs nwa ịnyịnya ibu+ ahụ, ha wee wụkwasị uwe elu ha n’elu ya, o wee nọkwasị n’elu ya.+  Ọtụtụ ndị gbasakwara uwe elu+ ha n’okporo ụzọ, ma ndị ọzọ si n’ọhịa+ gbute alaka osisi.+  Ndị na-aga n’ihu na ndị na-abịa n’azụ nọ na-eti mkpu, sị: “Biko, zọpụta ya!+ Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova bụ!+ 10  Ihe a gọziri agọzi ka alaeze na-abịa abịa nke nna anyị Devid+ bụ! Biko, zọpụta ya, n’ebe kasị elu!” 11  O wee banye na Jeruselem, banye n’ụlọ nsọ; o wee legharịa anya lee ihe niile, ebe ọ bụ na chi ejiwela, ya na mmadụ iri na abụọ ahụ pụrụ gawa Betani.+ 12  N’echi ya, mgbe ha si Betani pụta, agụụ gụwara ya.+ 13  Ọ nọ n’ebe dị anya hụ otu osisi fig nke nwere akwụkwọ, o wee gaa ile ma ọ̀ dị ihe ọ ga-ahụ n’elu ya ma eleghị anya. Ma mgbe o ruru na ya, ọ dịghị ihe ọ hụrụ ma e wezụga akwụkwọ, n’ihi na oge ahụ abụghị oge mkpụrụ fig ji amị.+ 14  Ya mere, ọ sịrị ya: “Amịla mkpụrụ onye ọ bụla ga-eri ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.”+ Ndị na-eso ụzọ ya nọkwa na-ege ntị. 15  Ha wee bịarute Jeruselem. N’ebe ahụ, ọ banyere n’ụlọ nsọ wee malite ịchụpụ ndị na-ere ma na-azụ ahịa n’ime ụlọ nsọ ahụ, o wee kpuo tebụl nke ndị na-agbanwe ego na oche nke ndị na-ere nduru ihu;+ 16  o kweghịkwa ka onye ọ bụla buru arịa gafere n’ụlọ nsọ ahụ, 17  kama ọ nọ na-ezi ihe, sị: “Ọ̀ bụ na e deghị, sị, ‘A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere+ dịịrị mba niile’?+ Ma unu emewo ya ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.”+ 18  Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ nụkwara ya, ha wee malite ịchọ otú ha ga-esi gbuo ya;+ n’ihi na ha na-atụ ya egwu, n’ihi na otú o si ezi ihe nọ na-eju ìgwè mmadụ ahụ dum anya.+ 19  Mgbe o ruru uhuruchi, ha na-esi n’obodo ahụ apụ. 20  Ma mgbe ha na-agafe n’isi ụtụtụ, ha hụrụ na osisi fig ahụ akpọnwụwo malite na mgbọrọgwụ ya.+ 21  Ya mere, Pita chetara ya wee sị ya: “Rabaị, lee! osisi fig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụwo.”+ 22  Jizọs zara ha, sị: “Nweenụ okwukwe n’ebe Chineke nọ. 23  N’ezie, ana m asị unu na onye ọ bụla nke sịrị ugwu a, ‘Ka e bulie gị tụba gị n’oké osimiri,’ ọ bụrụkwa na o nweghị obi abụọ n’ime obi ya, kama nwee okwukwe na ihe o kwuru ga-eme, ọ ga-emere ya otú ahụ.+ 24  Ọ bụ ya mere m ji na-asị unu, Ihe niile nke unu na-ekpe n’ekpere ma na-arịọ n’arịrịọ, nweenụ okwukwe na unu anatachaworị ha, unu ga-enwetakwa ha.+ 25  Mgbe unu guzokwa na-ekpe ekpere, gbagharanụ+ onye ọ bụla ihe ọ bụla o mere unu; ka Nna unu nọ n’eluigwe wee gbagharakwa unu njehie unu.”+ 26*  —— 27  Ha wee bịa Jeruselem ọzọ. Ka ọ na-ejekwa ije n’ime ụlọ nsọ, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye bịakwutere ya+ 28  wee malite ịsị ya: “Olee ikike i ji eme ihe ndị a? ma ọ bụ ònye nyere gị ikike a ime ihe ndị a?”+ 29  Jizọs sịrị ha: “Aga m ajụ unu otu ajụjụ. Zaanụ m ya, m ga-agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.+ 30  Baptizim+ Jọn mere, ò si n’eluigwe ka ò si n’aka mmadụ? Zaanụ m ya.”+ 31  Ya mere, ha malitere ikwu n’etiti onwe ha, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’eluigwe,’ ọ ga-asị, ‘Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere unu ekwereghị ya?’+ 32  Ma ànyị ga-anwa anwa sị, ‘O si n’aka mmadụ’?”—Ha na-atụ ìgwè mmadụ ahụ egwu, n’ihi na ndị a niile weere ya na Jọn bụ onye amụma n’ezie.+ 33  Otú ọ dị, ha zara Jizọs, sị: “Anyị amaghị.” Jizọs wee sị ha: “M gaghịkwa agwa unu ikike m ji eme ihe ndị a.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Mk 11:26*  Lee ihe e dere n’ala ala peeji na Mt 17:21.