Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 9:1-62

9  O wee kpọkọta mmadụ iri na abụọ ahụ wee mee ka ha nwee ike, nyekwa ha ikike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ niile na ịgwọ ọrịa dị iche iche.+  O wee zipụ ha ka ha gaa kwusaa alaeze Chineke ma gwọọ ọrịa,  o wee sị ha: “Unu ewerela ihe ọ bụla maka njem a, unu ejila mkpara ma ọ bụ obere akpa, ma ọ bụ achịcha ma ọ bụ ego ọlaọcha; unu achịkwala uwe ime abụọ.+  Kama n’ebe ọ bụla unu banyere n’ebe obibi, nọrọnụ n’ebe ahụ, sikwanụ n’ebe ahụ pụọ.+  N’ebe ọ bụla ndị mmadụ na-anabataghịkwa unu, mgbe unu si n’obodo ahụ na-apụ,+ tichapụnụ ájá dị n’ụkwụ unu ka ọ bụrụ àmà megide ha.”+  Ha wee gawa, gazuo ókèala ahụ malite n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ezisa ozi ọma, na-agwọkwa ọrịa n’ebe niile.+  Herọd onye na-achị ógbè ahụ wee nụ banyere ihe niile na-emenụ. Ọ nọkwa n’oké mgbagwoju anya n’ihi na ụfọdụ ndị na-ekwu na e siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Jọn.+  Ma ndị ọzọ na-ekwu na Ịlaịja apụtawo, ndị ọzọ na-ekwukwa na otu n’ime ndị amụma oge ochie ebilitewo.  Herọd sịrị: “Egbupụrụ m Jọn isi.+ Ònyezi bụ onye a m na-anụ ihe ndị dị otú a banyere ya?” N’ihi ya, ọ nọ na-achọ+ ịhụ ya. 10  Mgbe ndịozi ahụ lọtara, ha kọọrọ ya ihe ha mere.+ O wee kpọrọ ha pụọ ma gaa n’ebe ha ga-anọ naanị ha+ n’ime obodo a na-akpọ Betseida. 11  Ma mgbe ìgwè mmadụ ahụ matara, ha sooro ya. O wee jiri obiọma nabata ha ma malite ịgwa ha okwu banyere alaeze Chineke,+ ọ gwọkwara ndị nwere mkpa ọgwụgwọ.+ 12  Chi wee malite iji. Mmadụ iri na abụọ ahụ wee bịa sị ya: “Sị ìgwè mmadụ a lawa, ka ha gaa n’ime obodo nta dị iche iche na n’ime ime obodo ndị dị gburugburu nweta ebe ha ga-ehi ma chọta ihe oriri, n’ihi na n’ebe a, anyị nọ n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị.”+ 13  Ma ọ sịrị ha: “Nyenụ ha ihe ka ha rie.”+ Ha sịrị: “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ+ ka anyị nwere, ọ gwụla ma ànyị ga-aga n’onwe anyị zụta ihe oriri maka ndị a dum.”+ 14  N’eziokwu, ha dị ihe dị ka puku ndị ikom ise.+ Ma ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Meenụ ka ha nọdụ ala dị ka e si anọ na-eri nri, n’ìgwè n’ìgwè, ihe dị ka mmadụ iri ise mmadụ iri ise.”+ 15  Ha wee mee otú ahụ ma mee ka ha niile nọdụ ala iri ihe. 16  O wee were ogbe achịcha ise ahụ na azụ̀ abụọ ahụ lelie anya n’eluigwe, gọzie ha ma nyawaa ha, o wee malite inye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha nye ìgwè mmadụ ahụ.+ 17  Ha niile wee rie, rijuo afọ, a tụtụkọtakwara ihe ha rifọrọ, o wee ju nkata iri na abụọ.+ 18  E mesịa, mgbe naanị ya nọ na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya gbakọtara n’ebe ọ nọ, ọ jụkwara ha, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”+ 19  Ha zara, sị: “Jọn Onye Na-eme Baptizim; ma ndị ọzọ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa na-asị na otu n’ime ndị amụma oge ochie ebilitewo.”+ 20  O wee sị ha: “Ma, unu onwe unu, ònye ka unu na-asị na m bụ?” Pita zara, sị:+ “Kraịst+ nke Chineke.” 21  O wee dọọ ha aka ná ntị, nyekwa ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe a,+ 22  kama ọ sịrị ha: “Nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ, ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ajụkwa ya, a ga-egbukwa ya.+ N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.”+ 23  O wee gaa n’ihu ịgwa mmadụ niile, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya+ ma bulie osisi ịta ahụhụ ya kwa ụbọchị, nọgidekwa na-eso m.+ 24  N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta mkpụrụ obi ya ga-atụfu ya; ma onye ọ bụla nke tụfuru mkpụrụ obi ya n’ihi m ga-azọpụta ya.+ 25  N’ezie, olee uru ọ baara mmadụ ma ọ bụrụ na o rite ụwa dum n’uru ma onwe ya efunahụ ya ma ọ bụ ihe emebinahụ ya?+ 26  N’ihi na onye ọ bụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ihere onye ahụ ga-eme Nwa nke mmadụ mgbe ọ ga-abịa n’ebube ya nakwa nke Nna ya nakwa nke ndị mmụọ ozi dị nsọ.+ 27  Ma ana m agwa unu n’eziokwu, E nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo n’ebe a bụ́ ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha bu ụzọ hụ alaeze Chineke.”+ 28  N’eziokwu, ihe dị ka ụbọchị asatọ mgbe o kwusịrị okwu ndị a, ọ kpọọrọ Pita na Jọn na Jems rịgoro n’ugwu ka o kpee ekpere.+ 29  Ka ọ nọkwa na-ekpe ekpere, ọdịdị+ ihu ya gbanwere, uwe ya wee na-enwu gbaa.+ 30  Lee! ya na ndị ikom abụọ nọkwa na-akparịta ụka, ya bụ, Mozis na Ịlaịja.+ 31  Ndị a pụtara ìhè n’ebube ma malite ikwu okwu banyere ọlịla ya nke a kara aka na ọ ga-emezu na Jeruselem.+ 32  Ma ụra ji Pita na ndị ya na ha nọ; ma mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube ya,+ hụkwa ndị ikom abụọ ahụ ha na Jizọs guzo. 33  Mgbe ha si n’ebe ọ nọ na-apụ, Pita sịrị Jizọs: “Onye Ozizi, ọ dị mma na anyị nọ n’ebe a, ya mere, ka anyị maa ụlọikwuu atọ, otu maka gị, otu maka Mozis, otu maka Ịlaịja,” ma ọ maghị ihe ọ na-ekwu.+ 34  Ma ka ọ na-ekwu ihe ndị a, ígwé ojii gbachiri ma malite ikpuchi ha. Ka ha banyere n’ígwé ojii ahụ, egwu tụwara ha.+ 35  Otu olu+ wee si n’ígwé ojii ahụ kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara.+ Geenụ ya ntị.”+ 36  Mgbe olu ahụ kwuru okwu, ha hụrụ naanị Jizọs.+ Ma ha gbachiri nkịtị ghara ịkọrọ onye ọ bụla n’oge ahụ nke ọ bụla n’ime ihe ha hụrụ.+ 37  N’echi ya, mgbe ha rịdatara n’ugwu ahụ, oké ìgwè mmadụ zutere ya.+ 38  Ma, lee! otu nwoke si n’ìgwè mmadụ ahụ tie mkpu, sị: “Onye Ozizi, ana m arịọ gị ka i lee nwa m nwoke anya, n’ihi na ọ bụ naanị+ nwa m mụrụ,+ 39  ma, lee! otu mmụọ+ na-enye ya nsogbu, ọ na-etikwa mkpu na mberede, ọ na-emekwa ka ihe ọdụdọ na-adọ ya, ọ na-agbọ ụfụfụ n’ọnụ, ọ naghị ekwe ahapụ ya mgbe o merụsịrị ya ahụ́. 40  M wee rịọ ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike ịchụpụ ya.”+ 41  Jizọs zara, sị: “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe,+ nke gbagọkwara agbagọ, ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ, m wee na-edi ihe unu na-eme? Kpọta nwa gị ebe a.”+ 42  Ma ka ọ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kụrụ ya n’ala ma mee ka ihe ọdụdọ dọsie ya ike. Ma, Jizọs baara mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mba ma gwọọ nwa okoro ahụ wee kpọnye ya nna ya.+ 43  Otú ọ dị, ike dị ukwuu+ nke Chineke malitere iju ha niile anya. Ma ka ihe niile ọ na-eme nọ na-atụ ha niile n’anya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: 44  “Ka okwu ndị a baa unu ná ntị, n’ihi na a kawo ya aka na a gaje inyefe Nwa nke mmadụ n’aka ndị mmadụ.”+ 45  Ma ha aghọtaghị okwu a. N’eziokwu, e zochiiri ha ya ka ha wee ghara ịghọta ya, ha tụkwara egwu ịjụ ya ajụjụ banyere okwu a.+ 46  Ha wee malite ịrụ ụka banyere onye ga-abụ onye kasị ukwuu n’ime ha.+ 47  Ebe Jizọs maara ihe ha na-eche n’obi ha, ọ kpọọrọ otu nwatakịrị, mee ka o guzoro n’akụkụ ya,+ 48  wee sị ha: “Onye ọ bụla nke na-anabata nwatakịrị a n’aha m na-anabatakwa m, onye ọ bụlakwa nke na-anabata m na-anabatakwa onye ahụ nke zitere m.+ N’ihi na onye na-eme onwe ya dị ka onye ka nta+ n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.”+ 49  Jọn zara, sị: “Onye Ozizi, anyị hụrụ otu nwoke nke ji aha gị na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ,+ anyị gbalịkwara igbochi ya,+ n’ihi na ọ dịghị eso anyị.”+ 50  Ma Jizọs sịrị ya: “Unu anwala igbochi ya, n’ihi na onye na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.”+ 51  Mgbe ụbọchị a ga-akpọrọ ya gaa n’eluigwe ruwere nso,+ o kpebisiri ike ịga Jeruselem. 52  Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha buru ya ụzọ gawa. Ha wee gawa ma banye n’otu obodo nta nke ndị Sameria,+ ịga meere ya nkwadebe; 53  ma ha anabataghị ya, n’ihi na o kpebiri ịga Jeruselem.+ 54  Mgbe ndị na-eso ụzọ ya bụ́ Jems na Jọn+ hụrụ nke a, ha sịrị: “Onyenwe anyị, ị̀ chọrọ ka anyị gwa ọkụ+ ka o si n’eluigwe daa wee laa ha n’iyi?” 55  Ma ọ tụgharịrị baara ha mba. 56  Ya mere, ha gawara obodo nta dị iche. 57  Ma ka ha na-aga n’ụzọ, otu onye sịrị ya: “M ga-eso gị jee ebe ọ bụla ị ga-eje.”+ 58  Jizọs wee sị ya: “Nkịta ọhịa nwere ọgbà, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ bụla ọ ga-atọgbọ isi ya.”+ 59  O wee gwa onye ọzọ, sị: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” Nwoke ahụ wee sị: “Hapụ m ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”+ 60  Ma ọ sịrị ya: “Hapụ ndị nwụrụ anwụ+ ka ha lie ndị ha nwụrụ anwụ, ma gị onwe gị, gaa kwusaa alaeze Chineke n’ebe niile.”+ 61  Onye ọzọ sịkwara: “M ga-eso gị, Onyenwe anyị; ma hapụgodị m ka m sị ndị ezinụlọ m ka e mesịa.”+ 62  Jizọs sịrị ya: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke jidere aka n’ọ́gụ̀+ ma na-ele anya n’ihe ndị dị n’azụ+ nke kwesịrị nnọọ ekwesị maka alaeze Chineke.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji