Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 7:1-50

7  Mgbe o kwusịrị okwu ya niile ná ntị ìgwè mmadụ ahụ, ọ banyere Kapaniọm.+  Otu onyeisi ndị agha nwere ohu nke ahụ́ na-enye nsogbu, bụ́ onye ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. Ọ nọkwa n’ọnụ ọnwụ.+  Mgbe ọ nụrụ banyere Jizọs, o ziri ndị okenye ndị Juu ka ha gakwuru ya wee rịọ ya ka ọ bịa mee ka ahụ́ dị ohu ya mma.  Ndị ahụ bịakwutere Jizọs wee malite ịrịọsi ya arịrịọ ike, sị: “O ruru eru ka i meere ya ihe a,  n’ihi na ọ hụrụ mba anyị n’anya,+ ọ bụkwa ya wuuru anyị ụlọ nzukọ.”  Ya mere, Jizọs sooro ha gawa. Ma mgbe ọ bịarutewere ụlọ ahụ nso, onyeisi ndị agha ahụ ezipụwo ndị enyi ya ka ha gwa ya, sị: “Nna anyị ukwu, enyela onwe gị nsogbu, n’ihi na ekwesịghị m ka ị bata n’ụlọ m.+  N’ihi nke ahụ, echeghị m na m ruru eru ịbịakwute gị. Kama kwuo okwu, ka a gwọọ onye na-ejere m ozi.  N’ihi na mụ onwe m kwa nọ n’okpuru ikike mmadụ, m nwekwara ndị agha nọ n’okpuru m, m na-asị onye nke a, ‘Gawa!’ ya agawa, m na-asịkwa onye nke ọzọ, ‘Bịa!’ ya abịa, m na-asịkwa ohu m, ‘Mee nke a!’ ya emee ya.”+  Ma mgbe Jizọs nụrụ ihe ndị a, ihe banyere nwoke a tụrụ ya n’anya, o wee tụgharịa chee ìgwè mmadụ na-eso ya n’azụ ihu wee sị: “Ana m asị unu, Ahụbeghị m okwukwe dị ukwuu otú a ọbụna n’Izrel.”+ 10  Mgbe ndị ahụ e zipụrụ lọghachiri n’ụlọ ahụ, ha hụrụ na ahụ́ adịla ohu ahụ mma.+ 11  Ozugbo nke a gasịrị, ọ gawara obodo a na-akpọ Nen, ndị na-eso ụzọ ya na oké ìgwè mmadụ sokwa ya na-eme njem. 12  Ka o rutere nso n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, lee! e nwere onye nwụrụ anwụ+ a na-ebupụ, bụ́ nwa nwoke nne ya mụrụ naanị ya.+ E wezụga nke ahụ, ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ. Ìgwè mmadụ dị ukwuu ndị si n’obodo ahụ sokwa ya. 13  Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o nwere ọmịiko+ n’ebe ọ nọ, o wee sị ya: “Kwụsị ịkwa ákwá.”+ 14  O wee garuo nso ma bitụ ihe ahụ e ji ebu ozu aka, ndị bu ya wee guzoro n’otu ebe, o wee sị: “Nwa okorobịa, ana m asị gị, Bilie!”+ 15  Onye ahụ nwụrụ anwụ wee bilie nọrọ ọdụ ma malite ikwu okwu, o wee kpọnye ya nne ya.+ 16  Egwu+ wee jide ha niile, ha malitekwara inye Chineke otuto, na-asị: “E mewo ka onye amụma dị ukwuu+ bilie n’etiti anyị,” na-asịkwa, “Chineke echewo ihu ya n’ebe ndị ya nọ.”+ 17  Akụkọ a banyere ya wee gbasaa ruo Judia dum na ógbè niile gbara ya gburugburu. 18  Ma ndị na-eso ụzọ Jọn kọọrọ ya banyere ihe ndị a niile.+ 19  Ya mere, Jọn kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ma zie ha ka ha gakwuru Onyenwe anyị, sị ya: “Ọ̀ bụ gị bụ Onye ahụ nke Na-abịa, ka ànyị ga-atụwa anya onye ọzọ?”+ 20  Mgbe ndị ikom ahụ bịakwutere ya, ha sịrị: “Jọn Onye Na-eme Baptizim ziri anyị ka anyị bịakwute gị, sị, ‘Ọ̀ bụ gị bụ Onye ahụ nke Na-abịa, ka ànyị ga-atụwa anya onye ọzọ?’” 21  N’oge awa ahụ, ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa+ na ajọ ọrịa dị iche iche na mmụọ ọjọọ, mekwaara ọtụtụ ndị ìsì amara ka ha hụwa ụzọ, 22  O wee zaa mmadụ abụọ ahụ, sị: “Gaanụ+ kọọrọ Jọn ihe unu hụrụ na ihe unu nụrụ: ndị ìsì+ na-ahụ ụzọ, ndị ngwọrọ na-eje ije, a na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe, a na-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ, a na-ezikwa+ ndị ogbenye ozi ọma.+ 23  Obi ụtọ na-adịkwara onye ahụ nke na-asụghị ngọngọ n’ihi m.”+ 24  Mgbe ndị ozi Jọn lawara, ọ malitere ịgwa ìgwè mmadụ ahụ banyere Jọn, sị: “Gịnị ka unu gara n’ala ịkpa ịhụ? Ọ̀ bụ ahịhịa amị nke ifufe na-ebugharị?+ 25  Gịnịzi ka unu gara ịhụ? Ọ̀ bụ onye yi uwe elu dị yọrịị?+ N’ezie, ndị yi uwe mara mma ma na-ebi ndụ okomoko nọ n’ụlọ ndị eze.+ 26  Gịnịkwanụ ka unu gara ịhụ? Ọ̀ bụ onye amụma?+ Ee, ana m asị unu, ọ bụ onye karịrị nnọọ onye amụma.+ 27  Onye a bụ onye ahụ e dere banyere ya, sị, ‘Lee! M na-ezipụ onye ozi m n’ihu gị,+ bụ́ onye ga-akwadebe ụzọ gị tupu gị abịa.’+ 28  Ana m asị unu, N’etiti ndị ụmụ nwaanyị mụrụ, ọ dịghị onye ọ bụla ka Jọn ukwuu;+ ma onye ka nta n’alaeze Chineke ka ya ukwuu.”+ 29  (Mgbe mmadụ niile na ndị ọnaụtụ nụrụ ya, ha kwuru na Chineke bụ onye ezi omume,+ ebe ọ bụ na e mere ha baptizim ahụ Jọn na-eme.+ 30  Ma ndị Farisii na ndị maara Iwu ahụ ledara ndụmọdụ+ Chineke nyere ha anya, ebe ọ bụ na o meghị ha baptizim.) 31  “Ya mere, ole ndị ka m ga-eji ndị ọgbọ a tụnyere, ole ndị ka ha yikwara?+ 32  Ha yiri ụmụntakịrị nọ ọdụ n’ọma ahịa na-etiku ibe ha, bụ́ ndị na-asịkwa, ‘Anyị gbuuru unu ọjà, ma unu agbaghị egwú; anyị tiri mkpu arịrị, ma unu akwaghị ákwá.’+ 33  N’otu aka ahụ, Jọn Onye Na-eme Baptizim bịara, ọ naghị eri achịcha, ọ naghịkwa aṅụ mmanya, ma unu na-asị, ‘Mmụọ ọjọọ ji ya.’+ 34  Nwa nke mmadụ bịara na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu na-asị, ‘Lee! Ọ bụ onye na-eri oké nri, nke na-aṅụkwa oké mmanya, enyi ndị ọnaụtụ na ndị mmehie!’+ 35  Ka o sina dị, a na-egosi na amamihe+ ziri ezi site n’ụmụ ya niile.”+ 36  Ma otu onye n’ime ndị Farisii nọ na-arịọ ya ka o soro ya rie nri. N’ihi ya, ọ banyere n’ụlọ+ onye Farisii ahụ wee nọdụ na-eri ihe na tebụl. 37  Ma, lee! otu nwaanyị nke a maara n’obodo ahụ na ọ bụ onye mmehie matara na ọ nọ na-eri ihe n’ụlọ onye Farisii ahụ, o wee weta mkpọ̀ alabasta+ mmanụ nke na-esi ísì ụtọ, 38  ọ nọdụrụ n’azụ, n’akụkụ ụkwụ ya, na-akwa ákwá ma malite iji anya mmiri ya na-ede ụkwụ ya, o jikwa ntutu isi ya na-ehicha ha. O jikwa nwayọọ susuo ụkwụ ya ọnụ ma tee ha mmanụ ahụ na-esi ísì ụtọ. 39  Mgbe onye Farisii ahụ nke kpọrọ ya òkù hụrụ nke a, o chere, sị: “A sị na nwoke a bụ onye amụma,+ ọ gaara ama onye na-ebitụ ya aka, marakwa ụdị nwaanyị ọ bụ, na ọ bụ onye mmehie.”+ 40  Ma Jizọs zara ya, sị: “Saịmọn, enwere m ihe m ga-agwa gị.” O wee sị: “Onye Ozizi, kwuwe!” 41  “Mmadụ abụọ ji otu onye na-agbazinye mmadụ ego ụgwọ; otu onye ji ụgwọ narị mkpụrụ ego dinarịọs ise,+ ma onye nke ọzọ ji iri ise. 42  Mgbe ha na-enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ ụgwọ ha ji, ọ gbaghaara+ ha abụọ kpamkpam. Ònye n’ime ha ga-ahụ ya n’anya karị?” 43  Saịmọn zara, sị: “Echere m na ọ bụ onye ahụ ọ gbaghaara ego ka ukwuu kpamkpam.” O wee sị ya: “Ị zatara ya.” 44  O wee tụgharịa lee nwaanyị ahụ anya, sị Saịmọn: “Ị̀ hụrụ nwaanyị a? Abatara m n’ụlọ gị; i nyeghị m mmiri+ ka m saa ụkwụ. Ma nwaanyị a ji anya mmiri ya dee ụkwụ m, jirikwa ntutu isi ya hichaa ha. 45  I susughị m ọnụ;+ ma malite n’oge awa m batara nwaanyị a ahapụghị iji nwayọọ susuo ụkwụ m ọnụ. 46  I teghị isi m mmanụ;+ ma nwaanyị a tere ụkwụ m mmanụ na-esi ísì ụtọ. 47  N’ihi nke a, ana m asị gị, a gbagharawo ya mmehie ya n’agbanyeghị na ha dị ọtụtụ,+ n’ihi na o gosiri ịhụnanya dị ukwuu; ma onye a gbaghaara ihe dị nta, na-egosi ịhụnanya dị nta.” 48  O wee sị nwaanyị ahụ: “A gbagharawo gị mmehie gị.”+ 49  Ndị ha na ya nọ na-eri ihe na tebụl wee malite iche, sị: “Ònye bụ onye a nke na-agbaghara mmehie?”+ 50  Ma ọ sịrị nwaanyị ahụ: “Okwukwe gị azọpụtawo gị;+ lawa n’udo.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji