Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 6:1-49

6  Ma o si n’ubi ọka wit na-agafe n’ụbọchị izu ike, ndị na-eso ụzọ ya nọkwa na-aghọrọ+ ụyọkọ ọka wit, na-agbachasị, na-ata.+  Ụfọdụ n’ime ndị Farisii wee sị ha: “Gịnị mere unu ji na-eme ihe iwu na-akwadoghị+ n’ụbọchị izu ike?”+  Ma Jizọs zara ha, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe Devid+ mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị ikom so ya?+  Ọ̀ bụ na ọ banyeghị n’ụlọ Chineke ma nara achịcha e chere n’ihu Chineke+ rie, nyetụkwa ndị ikom so ya, bụ́ nke iwu na-akwadoghị ka onye ọ bụla rie ma e wezụga naanị ndị nchụàjà?”+  O wee gaa n’ihu ịsị ha: “Nwa nke mmadụ bụ Onyenwe ụbọchị izu ike.”+  N’ụbọchị izu ike+ ọzọ, ọ banyere n’ụlọ nzukọ ma malite izi ihe. E nwekwara otu nwoke nọ n’ebe ahụ bụ́ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ.+  Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii legidesiri ya anya+ ike ka ha hụ ma ọ̀ ga-agwọ ọrịa n’ụbọchị izu ike, ka ha wee hụ ma ò nwere ụzọ ha ga-esi bo ya ebubo.+  Otú ọ dị, ọ maara ihe ha na-atụgharị n’uche,+ ma ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie guzoro n’etiti.” O wee bilie guzoro ọtọ.+  Jizọs wee sị ha: “Ana m ajụ unu, Iwu ọ̀ kwadoro ime ihe ọma n’ụbọchị izu ike+ ka ọ̀ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta mkpụrụ obi ka ọ̀ bụ ibibi mkpụrụ obi?”+ 10  Mgbe o lesịrị ha niile anya gburugburu, ọ sịrị nwoke ahụ: “Gbatịa aka gị.” O wee gbatịa aka ya, o wee mee ka aka ya dị mma.+ 11  Ma oké ọnụma juru ha obi, ha wee malite ikwurịta n’etiti onwe ha ihe ha nwere ike ime Jizọs.+ 12  Ka ụbọchị ndị a na-aga, ọ pụrụ gaa n’ugwu ka o kpee ekpere,+ o wee nọgide n’abalị ahụ dum na-ekpeku Chineke ekpere.+ 13  Ma mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya, o wee họrọ mmadụ iri na abụọ n’ime ha, bụ́ ndị ọ kpọkwara “ndịozi”:+ 14  Saịmọn, bụ́ onye ọ gụkwara Pita,+ na Andru nwanne ya, na Jems na Jọn,+ na Filip+ na Batọlọmiu, 15  na Matiu na Tọmọs,+ na Jems nwa Alfiọs, na Saịmọn onye a na-akpọ “onye na-anụ ọkụ n’obi,”+ 16  na Judas nwa Jems, na Judas Iskarịọt, onye mesịrị rara ya nye.+ 17  Ya na ha wee gbadata, o wee guzoro n’ebe dị larịị, oké ìgwè ndị na-eso ụzọ ya nọkwa ya, ha na oké ìgwè mmadụ+ ndị si Judia na Jeruselem dum na obodo dị n’ụsọ osimiri Taya na Saịdọn, bụ́ ndị bịara ka ha nụrụ okwu ya nakwa ka a gwọọ ha ọrịa ha.+ 18  A gwọrọ ọbụna ndị ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-enye nsogbu. 19  Ìgwè mmadụ ahụ dum nọkwa na-achọ ibitụ ya aka,+ n’ihi na ike si n’ahụ́ ya na-apụ+ wee na-agwọ ha niile. 20  O wee welie anya ya lee ndị na-eso ụzọ ya ma malite ịsị:+ “Obi ụtọ na-adịrị unu ndị ogbenye,+ n’ihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21  “Obi ụtọ na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ+ ugbu a, n’ihi na afọ ga-eju unu.+ “Obi ụtọ na-adịrị unu ndị na-akwa ákwá ugbu a, n’ihi na unu ga-achị ọchị.+ 22  “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ọ bụla ndị mmadụ kpọrọ unu asị,+ na mgbe ọ bụla ha chụpụrụ unu,+ kọchaa unu ma mebie aha unu wee kwuo na unu bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, n’ihi Nwa nke mmadụ. 23  Ṅụrịanụ ọṅụ n’ụbọchị ahụ, maliekwanụ elu, n’ihi na, lee! ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe, n’ihi na ọ bụ ihe ndị ahụ ka ndị nna nna ha mere ndị amụma.+ 24  “Ma ahụhụ ga-adịrị unu ndị bara ọgaranya,+ n’ihi na unu enwetazuwo ngụgụ obi unu.+ 25  “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị afọ juru ugbu a, n’ihi na unu ga-anọ agụụ.+ “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị na-achị ọchị ugbu a, n’ihi na unu ga-eru uju ma kwaa ákwá.+ 26  “Ahụhụ ga-adịrị unu mgbe mmadụ niile na-ekwu okwu ọma banyere unu, n’ihi na ụdị ihe ndị a ka ndị nna nna ha mere ndị amụma ụgha.+ 27  “Ma ana m asị unu ndị na-ege ntị, Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya,+ na-emerenụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma,+ 28  na-agọzinụ ndị na-abụ unu ọnụ, na-ekpenụ ekpere maka ndị na-akparị unu.+ 29  Onye mara gị ụra n’otu ntì,+ tụgharịara ya ntì nke ọzọ; onye naara gị uwe elu gị,+ ajụla inye ya ọbụna uwe ime gị. 30  Onye ọ bụla nke na-arịọ gị ihe, nye ya ihe,+ agwakwala onye na-anapụ gị ihe gị ka o nyeghachi gị ihe ndị ahụ. 31  “Ọzọ, otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ.+ 32  “Ọ bụrụkwa na ọ bụ ndị hụrụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, olee uru ọ baara unu? N’ihi na ọbụna ndị mmehie bụ ndị hụrụ ha n’anya ka ha na-ahụ n’anya.+ 33  Ọ bụrụkwa na ọ bụ ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, olee uru ọ baara unu n’ezie? Ọbụna ndị mmehie na-eme otu ihe ahụ.+ 34  Ọ bụrụkwa na ọ bụ ndị unu nwere olileanya ịnata ihe ka unu na-agbazinye ihe n’anaghị ọmụrụ nwa,+ olee uru ọ baara unu? Ọbụna ndị mmehie na-agbazinye ndị mmehie ihe n’anaghị ha ọmụrụ nwa ka ha wee nwetaghachi ihe há otú ahụ.+ 35  Kama nke ahụ, na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-emekwanụ ihe ọma, na-agbazinyekwa ihe+ n’anaghị ọmụrụ nwa, n’enweghị olileanya inweta ihe ọ bụla; ụgwọ ọrụ unu ga-adịkwa ukwuu, unu ga-abụkwa ụmụ nke Onye Kasị Elu,+ n’ihi na o nwere obiọma+ n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị ọjọọ nọ. 36  Na-emenụ ebere, dị nnọọ ka Nna unu na-eme ebere.+ 37  “Kwụsịkwanụ ikpe ikpe, a gaghịkwa ekpe unu ikpe ma ọlị;+ kwụsịkwanụ ịma ikpe, a gaghịkwa ama unu ikpe ma ọlị. Na-atọhapụnụ ndị mmadụ, a ga-atọhapụkwa unu.+ 38  Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.+ Ha ga-awụnyekwa n’apata ụkwụ unu ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, nke a bịara aka, yọkọta ọnụ, nke jubigakwara ókè. N’ihi na ihe unu ji atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.”+ 39  O wee nye ha otu ihe atụ, sị: “Onye ìsì apụghị idu onye ìsì, ka ọ̀ pụrụ? Ha abụọ ga-adaba n’ime olulu, ka ọ̀ bụ na ha agaghị adaba?+ 40  Nwa akwụkwọ adịghị aka onye nkụzi ya, ma onye ọ bụla a kụziiri ihe n’ụzọ zuru okè ga-adị ka onye nkụzi ya.+ 41  Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma ị chọpụtaghị ntụhie nke dị n’anya nke gị?+ 42  Olee otú ị pụrụ isi gwa nwanna gị, sị, ‘Nwanna m, chere ka m wepụ irighiri ahịhịa nke dị n’anya gị,’ ma gị onwe gị adịghị ele ntụhie nke dị n’anya nke gị?+ Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ntụhie ahụ dị n’anya nke gị,+ mgbe ahụ ka ị ga-ahụ nke ọma otú ị ga-esi wepụ irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị.+ 43  “N’ihi na ọ dịghị osisi ọma nke na-amị mkpụrụ rere ure; ọzọ, ọ dịghị osisi ọ bụla rere ure nke na-amị mkpụrụ ọma.+ 44  N’ihi na a na-amara osisi ọ bụla site ná mkpụrụ ya.+ Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ adịghị aghọta mkpụrụ fig n’ogwu, ha adịghịkwa egbute mkpụrụ vaịn n’osisi ogwu.+ 45  Ezi mmadụ na-esi n’ezi akụ̀ nke obi ya ewepụta ihe ọma,+ ma ajọ mmadụ na-esi n’ajọ akụ̀ ya ewepụta ihe ọjọọ; n’ihi na ọ bụ ihe jupụtara ya n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.+ 46  “Gịnịzi mere unu ji akpọ m ‘Onyenwe anyị! Onyenwe anyị!’ ma unu adịghị eme ihe ndị m na-ekwu?+ 47  Onye ọ bụla nke na-abịakwute m ma na-anụ okwu m, na-emekwa ha, m ga-egosi unu onye o yiri.+ 48  O yiri mmadụ nke na-ewu ụlọ, bụ́ onye gwuru ala gwumie ya egwumi, tọọkwa ntọala n’elu oké nkume. Ya mere, mgbe e nwere idei mmiri,+ osimiri asọkwasịkwa ụlọ ahụ, ma o sirughị ike ime ka ọ maa jijiji, n’ihi na e wuru ya nke ọma.+ 49  N’aka nke ọzọ, onye na-anụ ma ọ dịghị eme ya eme+ yiri mmadụ nke wuru ụlọ n’elu ala n’atọghị ntọala. Osimiri sọkwasịrị ya, o wee dakpọọ ozugbo, ụlọ ahụ bibikwara+ nke ukwuu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji