Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 22:1-71

22  Ma ememme achịcha na-ekoghị eko, nke a na-akpọ Ememme Ngabiga,+ na-eru nso.  Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na-achọkwa ụzọ kasị mma ha ga-esi gbuo ya,+ n’ihi na ha na-atụ ìgwè mmadụ ahụ egwu.+  Ma Setan banyere n’ime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, onye a gụnyekọrọ n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ;+  o wee gaa soro ndị isi nchụàjà na ndị isi ndị nche ụlọ nsọ kwurịta ụzọ kasị mma ọ ga-esi rara ya nye n’aka ha.+  Ha wee ṅụrịa ọṅụ ma kweta inye ya ego ọlaọcha.+  O wee kwere. Ọ malitekwara ịchọ ohere dị mma ọ ga-eji rara ya nye n’aka ha mgbe ìgwè mmadụ na-anọghị ya.+  Ụbọchị ememme achịcha na-ekoghị eko wee ruo, bụ́ ụbọchị a na-aghaghị ịchụ anụ e ji eme ememme ngabiga n’àjà;+  o wee zipụ Pita na Jọn, sị: “Gaanụ kwadebere anyị nri ememme ngabiga+ ka anyị rie.”  Ha wee sị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị kwadebe ya?” 10  O wee sị ha:+ “Lee! Mgbe unu banyere n’ime obodo, otu nwoke nke bu udu mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya baa n’ime ụlọ nke ọ ga-abanye.+ 11  Sịnụ onye nwe ụlọ ahụ, ‘Onye Ozizi sịrị gị: “Olee ọnụ ụlọ ndị ọbịa bụ́ ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie nri ememme ngabiga?”+ 12  Nwoke ahụ ga-egosikwa unu nnukwu ọnụ ụlọ dị n’elu nke e doziri edozi. Kwadebenụ ya n’ebe ahụ.”+ 13  Ya mere, ha pụrụ wee hụ ya dị nnọọ ka ọ gwara ha, ha wee kwadebe nri ememme ngabiga ahụ.+ 14  E mesịa, mgbe oge awa ahụ ruru, ọ nọdụrụ ala iri ihe na tebụl, ndịozi ya sokwa ya nọdụ.+ 15  O wee sị ha: “Ọ gụsịwo m agụụ ike iso unu rie nri ememme ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ; 16  n’ihi na ana m asị unu, M gaghị eri ya ọzọ ruo mgbe e mezuworo ya n’alaeze Chineke.”+ 17  Ka ọ naara iko,+ o kelere Chineke, sị: “Naranụ nke a ma bugharịa ya n’etiti onwe unu; 18  n’ihi na ana m asị unu, Site ugbu a gaa n’ihu, m gaghị aṅụ ihe si n’osisi vaịn ọzọ ruo mgbe alaeze Chineke ga-abịa.”+ 19  O wee were otu ogbe achịcha,+ kelee Chineke, nyawaa ya, ma were ya nye ha, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m+ nke a gaje inye n’ihi unu.+ Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”+ 20  O bukwaara iko+ ahụ n’otu ụzọ ahụ mgbe ha risịrị nri anyasị, sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ+ ahụ nke dabeere n’ọbara m,+ bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi unu.+ 21  “Ma, lee! aka onye na-arara m nye+ dị n’ebe m nọ na tebụl.+ 22  N’ihi na Nwa nke mmadụ na-ahapụ dị ka ihe a kara aka si dị;+ otú o sina dị, ahụhụ ga-adịrị onye a ga-esi n’aka ya rara ya nye!”+ 23  Ya mere, ha malitere ikwurịta n’etiti onwe ha onye ọ bụ n’ime ha nke na-aga ime nke a.+ 24  Otú ọ dị, esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ bilitekwara n’etiti ha banyere onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu.+ 25  Ma ọ sịrị ha: “Ndị eze nke ndị mba ọzọ na-eme ka à ga-asị na ọ bụ ha nwe ha, a na-akpọkwa ndị na-achị ha Ndị Ome Mma.+ 26  Ma unu onwe unu agaghị adị otú ahụ.+ Kama ka onye kasị ukwuu n’etiti unu dịrị ka onye kasị bụrụ nwata,+ ka onye bụ́ onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi.+ 27  N’ihi na olee onye ka ukwuu, ọ̀ bụ onye nọ na-eri ihe na tebụl ka ọ̀ bụ onye na-eje ozi? Ọ́ bụghị onye nọ na-eri ihe na tebụl? Ma anọ m n’etiti unu dị ka onye na-eje ozi.+ 28  “Otú ọ dị, ọ bụ unu rapaara m n’ahụ́+ n’ọnwụnwa+ m dị iche iche; 29  mụ na unu na-agbakwa ndụ maka alaeze,+ dị nnọọ ka mụ na Nna m gbara ndụ,+ 30  ka unu wee rie+ ma ṅụọ na tebụl m n’alaeze m,+ nọdụkwa ala n’ocheeze+ ikpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe. 31  “Saịmọn, Saịmọn, lee! Setan+ achọsiwo ike ka a yọchaa unu dị ka ọka wit.+ 32  Ma arịọsiwo m arịrịọ ike+ maka gị ka okwukwe gị wee ghara ịda mbà; gị onwe gị kwa, ozugbo ị laghachiri, mee ka ụmụnna gị dị ike.”+ 33  O wee sị ya: “Onyenwe anyị, adị m njikere iso gị baa n’ụlọ mkpọrọ, sorokwa gị nwụọ.”+ 34  Ma ọ sịrị: “Ana m asị gị, Pita, Oké ọkpa agaghị akwa taa ruo mgbe ị gọrọ agọ ugboro atọ na ị maghị onye m bụ.”+ 35  Ọ sịkwara ha: “Mgbe m zipụrụ+ unu, unu ewee gawa n’ejighị obere akpa ego na obere akpa nri na akpụkpọ ụkwụ, ọ dịghị ihe kọrọ unu, ka ọ̀ dị?” Ha wee sị: “Ee e!” 36  O wee sị ha: “Ma ugbu a, ka onye nwere obere akpa ego were ya, ka onye nwere obere akpa nri were ya; ka onye na-enweghịkwa mma agha ree uwe elu ya zụrụ otu. 37  N’ihi na ana m asị unu na ihe a e dere aghaghị imezu n’ebe m nọ, ya bụ, ‘A gụnyere ya ná ndị na-emebi iwu.’+ N’ihi na ihe e dere banyere m na-emezu.”+ 38  Ha wee sị: “Onyenwe anyị, lee! anyị ji mma agha abụọ.” O wee sị ha: “O zuola.” 39  Ka ọ pụrụ, ọ gawara n’Ugwu Oliv dị ka ọ na-emekarị; ndị na-eso ụzọ ya sokwaara ya.+ 40  Mgbe ọ garuru n’ebe ahụ, ọ sịrị ha: “Nọgidenụ na-ekpe ekpere, ka unu wee ghara ịba n’ọnwụnwa.”+ 41  Ya onwe ya wee si n’ebe ha nọ pụọ gatụ ntakịrị wee gbuo ikpere n’ala malite ikpe ekpere, 42  sị: “Nna, ọ bụrụ na ị chọọ, wepụ iko a n’ebe m nọ. Ka o sina dị, ka uche gị mee,+ ọ bụghị nke m.”+ 43  Otu mmụọ ozi nke si n’eluigwe pụtara ìhè n’ihu ya wee mee ka ọ dị ike.+ 44  Ma mgbe obi na-erukwaghi ya ala, ọ nọ na-ekpesi ekpere ike karị,+ ọsụsọ ya dịkwa ka ọbara nke na-atapụsị n’ala.+ 45  O wee si ebe ahụ ọ nọ na-ekpe ekpere bilie, gakwuru ndị na-eso ụzọ ya ma hụ ha ka na-ero ụra n’ihi iru uju;+ 46  o wee sị ha: “Gịnị mere unu ji ehi ụra? Bilienụ, na-ekpekwanụ ekpere, ka unu wee ghara ịbanye n’ọnwụnwa.”+ 47  Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, lee! ìgwè mmadụ bịara, nwoke ahụ a na-akpọ Judas, bụ́ otu n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ, nọkwa na-aga n’ihu ha;+ o wee bịaruo Jizọs nso ka o susuo ya ọnụ.+ 48  Ma Jizọs sịrị ya: “Judas, ì ji isusu ọnụ na-arara Nwa nke mmadụ nye?”+ 49  Mgbe ndị nọ ya gburugburu hụrụ ihe na-aga ime, ha sịrị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị gbuo ha mma agha?”+ 50  Ọbụna otu onye n’ime ha gburu ohu nnukwu onye nchụàjà mma wee bepụ ya ntị aka nri ya.+ 51  Ma Jizọs zara, sị: “O zuworo unu.” O wee bitụ ntị ahụ aka, gwọọ ya.+ 52  Jizọs wee gwa ndị isi nchụàjà na ndị isi ndị nche ụlọ nsọ na ndị okenye chọ ya bịa ebe ahụ, sị: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa dị ka à ga-asị na unu bịara ijide onye na-apụnara mmadụ ihe?+ 53  Mgbe mụ na unu na-anọ n’ụlọ nsọ+ kwa ụbọchị, unu agbatịghị aka unu imegide m.+ Ma nke a bụ oge awa+ unu nakwa ikike+ nke ọchịchịrị.”+ 54  Ha wee jide ya wee kpụpụ+ ya ma kpọbata ya n’ụlọ nnukwu onye nchụàjà;+ ma Pita na-eso ha n’ebe dị anya.+ 55  Mgbe ha kwanyere ọkụ na mbara èzí nke obí eze wee nọdụ ala, Pita nọkwa ọdụ n’etiti ha.+ 56  Ma otu nwa agbọghọ na-eje ozi hụrụ ya ka ọ nọ ọdụ n’akụkụ ọkụ ahụ nke na-enwu nke ọma, wee leruo ya anya, sị: “Ya na nwoke a kwa na-anọ.”+ 57  Ma ọ gọrọ agọ,+ sị: “Nwaanyị, amaghị m onye ọ bụ.”+ 58  Mgbe obere oge gasịkwara, onye ọzọ nke hụrụ ya sịrị: “Gị onwe gị kwa bụ otu n’ime ha.” Ma Pita sịrị: “Nwoke m, abụghị m.”+ 59  Mgbe ihe dị ka otu awa gafere, otu nwoke ọzọ malitere ikwusi ike, sị: “N’ezie, ya na nwoke a kwa na-anọ; n’ihi na, n’eziokwu, ọ bụ onye Galili!”+ 60  Ma Pita sịrị: “Nwoke m, amaghị m ihe ị na-ekwu.” N’otu ntabi anya, ka ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, oké ọkpa kwara.+ 61  Onyenwe anyị wee tụgharịa legide Pita anya, Pita wee cheta okwu Onyenwe anyị kwuru mgbe ọ sịrị ya: “Tupu oké ọkpa akwaa taa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ 62  O wee pụọ n’èzí kwaa ákwá nke ukwuu.+ 63  Ndị ikom ndị ji ya eji wee malite iji ya eme ihe ọchị,+ na-eti+ ya ihe;+ 64  mgbe ha kpuchiri ya ihu, ha jụrụ ya, sị: “Buo amụma. Ọ̀ bụ onye tiri gị ihe?”+ 65  Ha wee na-ekwu ọtụtụ ihe ndị ọzọ iji kwuluo ya.+ 66  E mesịa, mgbe chi bọrọ, ìgwè ndị okenye ndị Juu, ma ndị isi nchụàjà ma ndị odeakwụkwọ, zukọtara,+ ha wee kpụrụ ya banye n’ụlọ nzukọ Sanhedrin ha, sị:+ 67  “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst,+ gwa anyị.” Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụrụgodị na mụ agwa unu, unu agaghị ekwere ma ọlị.+ 68  Ọ bụrụkwa na mụ ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza ya ma ọlị.+ 69  Otú ọ dị, site ugbu a gaa n’ihu, Nwa nke mmadụ+ ga-anọdụ ala n’aka nri dị ike+ nke Chineke.”+ 70  Ha niile wee sị: “Ị̀ na-ekwu na ị bụ Ọkpara Chineke?” O wee sị ha: “Unu onwe unu na-ekwu+ na m bụ.” 71  Ha wee sị: “Gịnị mere àmà ọzọ ji dị anyị mkpa?+ N’ihi na anyị onwe anyị anụwo ya site n’ọnụ ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji