Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 21:1-38

21  Ma mgbe o leliri anya, ọ hụrụ ndị bara ọgaranya ka ha na-atụnye onyinye ha n’igbe a na-atụnye ego.+  O wee hụ otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye ka ọ tụnyere obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali ihe dị nnọọ nta n’ebe ahụ,+  o wee sị: “N’eziokwu, ana m asị unu, Ọ bụ ezie na nwaanyị a di ya nwụrụ dara ogbenye, ọ tụnyere ihe karịa ihe ha niile tụnyere.+  N’ihi na ndị a niile tụnyere onyinye site n’ọtụtụ ihe ha nwere, ma nwaanyị a tụnyere ihe niile o nwere o ji ebi ndụ, n’agbanyeghị na ọ nọ n’ụkọ.”+  E mesịa, ka ụfọdụ ndị nọ na-ekwu banyere ụlọ nsọ ahụ, otú e si jiri nkume dị mma na ihe ndị e nyere Chineke chọọ ya mma,+  ọ sịrị: “Ihe ndị a unu na-ahụ, ụbọchị ga-abịa mgbe a na-agaghị ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya n’ebe a n’akwatughị ya.”+  Ha wee jụọ ya, sị: “Onye Ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-eme n’ezie, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke mgbe ihe ndị a ga-eme?”+  O wee sị: “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu;+ n’ihi na ọtụtụ ndị ga-abịa n’aha m, sị, ‘Ọ bụ m bụ ya,’ sịkwa, ‘Oge ahụ a kara aka eruwo.’+ Unu esola ha.  Mgbe unu na-anụkwa mkpọtụ agha na nke ọgba aghara, unu atụla ụjọ.+ N’ihi na ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ mee, ma ọgwụgwụ agaghị abịa ozugbo ahụ.” 10  O wee gaa n’ihu ịsị ha: “Mba ga-ebuso mba ọzọ agha,+ alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha;+ 11  a ga-enwekwa oké ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe na ụkọ nri+ ga-adịkwa n’ebe dị iche iche; a ga-ahụkwa ihe ndị na-atụ egwu, nweekwa oké ihe ịrịba ama dị iche iche site n’eluigwe.+ 12  “Ma tupu ihe a niile emee, ndị mmadụ ga-ejide unu ma kpagbuo+ unu, kpụrụ unu gaa n’ụlọ nzukọ, tụbakwa unu n’ụlọ mkpọrọ, a ga-akpụgakwa unu n’ihu ndị eze na ndị gọvanọ n’ihi aha m.+ 13  Ọ ga-aghọrọ unu ohere iji gbaa àmà.+ 14  Ya mere, kpebienụ n’obi unu na unu agaghị ebu ụzọ mụgharịa otú unu ga-esi na-azara ọnụ unu,+ 15  n’ihi na m ga-eme ka unu nwee ọnụ na amamihe, nke ndị niile na-emegide unu na-agaghị enwe ike iguzogide ma ọ bụ ịgbagha.+ 16  Ndị mụrụ unu+ na ụmụnne na ndị ikwu na ndị enyi unu ga-ararakwa unu nye, ha ga-egbukwa ụfọdụ n’ime unu;+ 17  mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.+ 18  Ma otu mkpụrụ ntutu isi+ unu agaghịkwa ala n’iyi ma ọlị. 19  Unu ga-esite n’ịtachi obi nweta mkpụrụ obi unu.+ 20  “Mgbe unu hụkwara Jeruselem ka ụsụụ ndị agha ndị mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu,+ mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso.+ 21  Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya si na ya pụọ, ka ndị nọkwa n’obodo nta dị iche iche ghara ịbanye n’ime ya;+ 22  n’ihi na ndị a bụ ụbọchị ime ihe e kpere n’ikpe, ka ihe niile e dere wee mezuo.+ 23  Ahụhụ ga-adịrị ụmụ nwaanyị dị ime na ndị na-enye nwa ara n’ụbọchị ndị ahụ!+ N’ihi na oké ahụhụ ga-adị n’ala ahụ, ọnụma ga-abịakwasịkwa ndị a; 24  ha ga-adakwa site n’ihu mma agha, a ga-adọrọkwa ha n’agha laa ná mba niile;+ ndị mba ọzọ ga-azọ Jeruselem ụkwụ, ruo mgbe oge a kara aka+ nke ndị mba ọzọ ga-ezu. 25  “A ga-enwekwa ihe ịrịba ama dị iche iche n’anyanwụ+ na n’ọnwa nakwa na kpakpando, mba dị iche iche ga-anọkwa ná nhụjuanya n’elu ụwa, n’amaghị ihe ha ga-eme n’ihi mbigbọ nke oké osimiri+ na mmali+ ya, 26  ndị mmadụ ga-atụbọkwa n’ihi egwu+ nakwa n’ihi ihe ndị ha na-atu anya ga-abịakwasị elu ụwa mmadụ bi;+ n’ihi na a ga-eme ka ike nke eluigwe maa jijiji.+ 27  Mgbe ahụ, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ+ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii n’ike na ebube dị ukwuu.+ 28  Ma mgbe ihe ndị a niile malitere ime, guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na nnapụta unu na-eru nso.” 29  O wee nye ha otu ihe atụ, sị: “Leruonụ osisi fig na osisi ọzọ niile anya:+ 30  Mgbe ha mara ifuru, site n’ileru ya anya, unu na-amara na oge okpomọkụ dị nso.+ 31  Otú a kwa, unu onwe unu, mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na alaeze Chineke dị nso.+ 32  N’ezie, ana m asị unu, Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị ruo mgbe ihe niile mere.+ 33  Eluigwe na ụwa ga-agabiga,+ ma okwu m agaghị agabiga ma ọlị.+ 34  “Ma lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya+ na nchegbu+ nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya+ 35  dị ka ọnyà.+ N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi n’elu ụwa niile.+ 36  Ya mere, mụrụnụ anya,+ na-arịọsikwanụ arịrịọ ike+ mgbe niile ka unu wee nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”+ 37  N’ehihie, ọ na-ezi ihe n’ụlọ nsọ,+ ma n’abalị, ọ na-apụ gaa nọrọ n’ugwu a na-akpọ Ugwu Oliv.+ 38  Mmadụ niile+ na-abịakwutekwa ya n’ụlọ nsọ n’isi ụtụtụ ịnụrụ okwu ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji