Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 16:1-31

16  O wee gaa n’ihu ịgwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Otu nwoke bara ọgaranya, o nwekwara onye na-elekọtara ya ụlọ.+ E bokwara onye a ebubo n’ihu nna ya ukwu na ọ na-emefusị akụ̀ ya.+  Ya mere, ọ kpọrọ ya, sị ya, ‘Gịnị bụ ihe a m na-anụ banyere gị? Weta akwụkwọ ị na-edekọ otú i si arụ ọrụ nlekọta gị,+ n’ihi na ị gakwaghị elekọta ụlọ m.’  Onye ahụ na-elekọta ụlọ wee gwa onwe ya, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na nna m ukwu+ ga-anapụ m ọrụ ilekọtara ya ụlọ? Ike adịghị m igwu ala, ihere na-eme m ịrịọ arịrịọ.  Ehee! Ama m ihe m ga-eme, ka ọ ga-abụ, mgbe a chụpụrụ m n’ọrụ ilekọta ụlọ, ndị mmadụ ga-anabata m n’ebe obibi ha.’+  Ọ kpọrọ nke ọ bụla n’ime ndị ji nna ya ukwu ụgwọ, o wee sị onye nke mbụ, ‘Gịnị ka i ji nna m ukwu n’ụgwọ?’  Ọ sịrị, ‘Otu narị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat nke mmanụ oliv.’ O wee sị ya, ‘Were akwụkwọ e dere ihe unu kwekọrịtara ma nọdụ ala dee iri ise ọsọ ọsọ.’  Ọ jụkwara onye ọzọ, sị, ‘Gị onwe gị, gịnị ka i ji n’ụgwọ?’ Ọ sịrị, ‘Otu narị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kọọ nke ọka wit.’ O wee sị ya, ‘Were akwụkwọ e dere ihe unu kwekọrịtara ma dee iri asatọ.’  Nna ukwu nke onye ahụ na-elekọta ụlọ jara ya mma, ọ bụ ezie na ọ bụ onye ajọ omume, n’ihi na o ji ezi amamihe mee ihe;+ n’ihi na ụmụ nke usoro ihe a maara ihe n’ụzọ bara uru karịa ụmụ nke ìhè n’otú ha si emeso ndị ọgbọ ha ihe.+  “Ana m asịkwa unu, Jirinụ akụ̀ ajọ omume+ metara onwe unu ndị enyi,+ ka ọ ga-abụ, mgbe akụ̀ dị otú ahụ na-adịkwaghị, ha ewee nabata unu n’ebe obibi ebighị ebi.+ 10  Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kasị nta kwesịkwara ntụkwasị obi n’oké ihe, onye bụ́ onye ajọ omume n’ihe kasị nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.+ 11  Ya mere, ọ bụrụ na unu ekwesịghị ntụkwasị obi n’akụ̀ ajọ omume, ònye ga-enyefe ezi akụ̀ n’aka unu?+ 12  Ọ bụrụkwa na unu ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihe onye ọzọ,+ ònye ga-enye unu ihe e debeere unu? 13  Ọ dịghị odibo nke pụrụ ịbụ ohu nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”+ 14  Ma ndị Farisii, bụ́ ndị hụrụ ego n’anya, nọ na-ege ntị n’ihe ndị a niile, ha wee malite ịkwa ya emo.+ 15  N’ihi ya, ọ sịrị ha: “Unu bụ ndị na-akpọ onwe unu ndị ezi omume n’ihu ụmụ mmadụ,+ ma Chineke maara obi unu;+ n’ihi na ihe dị elu n’etiti ụmụ mmadụ bụ ihe arụ n’anya Chineke.+ 16  “Iwu ahụ na ihe ndị amụma kụziri dị ruo n’oge Jọn.+ Site n’oge ahụ gaa n’ihu, a na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke, ụdị mmadụ niile na-agbalịsi ike ịbanye n’ime ya.+ 17  N’ezie, ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịgabiga+ karịa otu akụkụ+ mkpụrụ akwụkwọ nke dị n’Iwu ahụ ịghara imezu.+ 18  “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm ma lụọ nwaanyị ọzọ na-akwa iko, onye lụkwara nwaanyị di ya gbara alụkwaghịm na-akwa iko.+ 19  “Ma otu nwoke+ bara ọgaranya. Ọ na-ejikwa ákwà na-acha odo odo na ákwà linin achọ onwe ya mma, na-emekwa onwe ya obi ụtọ n’ụzọ okomoko site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.+ 20  Ma e nwere onye arịrịọ aha ya bụ Lazarọs nke a na-ebute n’ọnụ ụzọ ámá ya. Ọnyá jukwara ya n’ahụ́. 21  Ọ na-agụkwa ya agụụ iri ihe si na tebụl ọgaranya ahụ na-adapụ. Ee, nkịta na-abịakwa aracha ọnyá ya. 22  Ma ka oge na-aga, onye arịrịọ ahụ nwụrụ,+ ndị mmụọ ozi wee buru ya gaa n’ebe ọ dabeere n’obi+ Ebreham.+ “Ọgaranya ahụ nwụkwara,+ e wee lie ya. 23  Ọ nọ n’ime Hedis lelie anya. Ọ nọkwa ná mmekpa ahụ́.+ O wee hụ Ebreham n’ebe dị anya, hụkwa Lazarọs ka ọ dabeere n’obi ya. 24  Ya mere, ọ kpọrọ òkù, sị, ‘Nna m Ebreham,+ meere m ebere ma zie Lazarọs ka o detụ ọnụ ọnụ mkpịsị aka ya ná mmiri ma mee ka ire m jụọ oyi,+ n’ihi na anọ m ná nhụjuanya n’ọkụ a nke na-enwusi ike.’+ 25  Ma Ebreham sịrị, ‘Nwa m, cheta na ị natazuru ihe ọma gị n’oge ị nọ ndụ, ma Lazarọs natara ihe ọjọọ. Otú ọ dị, ugbu a, a na-akasi ya obi n’ebe a ma ị nọ ná nhụjuanya.+ 26  E wezụgakwa ihe ndị a niile, e mewo ka oké olulu+ dị n’agbata anyị na unu,+ ka ndị chọrọ isi n’ebe a gakwuru unu ghara inwe ike ịgafe, ndị mmadụ agaghịkwa esi n’ebe ahụ gafeta n’ebe anyị nọ.’+ 27  O wee sị, ‘Ọ bụrụ otú ahụ, ana m arịọ gị, nna m, ka i ziga ya n’ụlọ nna m, 28  n’ihi na enwere m ụmụnne ndị ikom ise, ka o wee gbaara ha àmà nke ọma, ka ha onwe ha gharakwa ịbata n’ebe mmekpa ahụ́ nke a.’ 29  Ma Ebreham sịrị, ‘Ha nwere akwụkwọ Mozis+ na Akwụkwọ Ndị Amụma;+ ha gee ha ntị.’+ 30  O wee sị, ‘Ee e, n’ezie, nna m Ebreham, kama ọ bụrụ na mmadụ esi ná ndị nwụrụ anwụ gakwuru ha, ha ga-echegharị.’ 31  Ma ọ sịrị ya, ‘Ọ bụrụ na ha egeghị Mozis+ na Akwụkwọ Ndị Amụma ntị, a gaghịkwa eme ka ha kweta ma ọ bụrụ na mmadụ esi ná ndị nwụrụ anwụ bilie.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji