Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 14:1-35

14  N’otu oge, mgbe ọ banyere n’ụlọ otu n’ime ndị na-achị achị bụ́ onye Farisii n’ụbọchị izu ike ịga rie nri,+ ha nọ na-ele ya anya.+  Ma, lee! otu nwoke nke na-arịa ọrịa ahụ́ mmiri nọ n’ihu ya.  Ya mere, Jizọs jụrụ ndị ahụ maara Iwu na ndị Farisii, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ịgwọ ọrịa n’ụbọchị izu ike ka ọ̀ bụ na ọ kwadoghị?”+  Ma ha gbachiri nkịtị. N’ihi ya, o seere nwoke ahụ n’aka, gwọọ ya ma sị ya lawa.  O wee sị ha: “Ònye n’ime unu ga-ahapụ ịdọpụta nwa ya nwoke ma ọ bụ ehi ya ozugbo ma ọ bụrụ na ọ daba n’olulu mmiri+ n’ụbọchị izu ike?”+  Ha enweghịkwa ike ịsa ya okwu n’ihe ndị a.+  Mgbe ọ hụrụ otú ndị a kpọrọ òkù si na-ahọrọ ebe kasị elu, ọ gara n’ihu inye ha otu ihe atụ, sị:+  “Mgbe mmadụ kpọrọ gị òkù ịbịa oriri alụmdi na nwunye, anọdụla n’ebe kasị elu.+ Ma eleghị anya, ọ kpọrọ onye a na-akwanyere ùgwù karịa gị òkù n’oge ahụ,  onye ahụ nke kpọrọ gị na ya òkù ga-abịa sị gị, ‘Ka onye a nọrọ n’ebe ahụ.’ Mgbe ahụ, ị ga-eji ihere bilie gaa nọrọ n’ebe kasị ala.+ 10  Kama mgbe a kpọrọ gị òkù, gaa nọdụ n’ebe kasị ala,+ ka ọ ga-abụ na mgbe onye ahụ kpọrọ gị òkù bịara, ọ ga-asị gị, ‘Enyi m, gbagoo n’ebe ka elu.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwe nsọpụrụ n’anya ndị ọbịa ibe gị niile.+ 11  N’ihi na onye na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”+ 12  O wee gwa nwoke ahụ nke kpọrọ ya òkù, sị: “Mgbe ị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa rie nri ehihie ma ọ bụ nri anyasị, akpọla ndị enyi gị ma ọ bụ ụmụnne gị ma ọ bụ ndị ikwu gị ma ọ bụ ndị agbata obi gị bara ọgaranya. Ma eleghị anya, ha nwekwara ike ịkpọ gị òkù n’oge ọzọ, ọ ga-abụkwa ịkwụ gị ụgwọ. 13  Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị nwere nkwarụ, ndị ngwọrọ, ndị ìsì;+ 14  ị ga-enwekwa obi ụtọ, n’ihi na ha enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ gị ụgwọ. N’ihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ná mbilite n’ọnwụ+ nke ndị ezi omume.” 15  Mgbe otu n’ime ndị ọbịa ibe ya nụrụ ihe ndị a, ọ sịrị ya: “Obi ụtọ na-adịrị onye ga-eri ihe n’alaeze Chineke.”+ 16  Jizọs sịrị ya: “Otu nwoke nọ na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa maka nnukwu nri anyasị, ọ kpọkwara ọtụtụ ndị òkù.+ 17  O wee zipụ ohu ya n’oge awa a ga-eri nri anyasị ahụ ka ọ gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ òkù, sị, ‘Bịanụ,+ n’ihi na a kwadowo ihe niile.’ 18  Ma ha niile malitere ịrịọ ka a hapụ ha.+ Onye mbụ sịrị ya, ‘Azụrụ m ubi, m ga-agarịrị hụ ya; ana m arịọ gị, Ka a gụpụ m.’+ 19  Onye ọzọ sịkwara, ‘Azụrụ m ehi iri e jikọrọ abụọ abụọ, ana m agakwa ileru ha anya; ana m arịọ gị, Ka a gụpụ m.’+ 20  Onye ọzọ sịkwara, ‘M ka lụrụ nwaanyị,+ n’ihi ya, apụghị m ịbịa.’ 21  Ya mere, ohu ahụ bịara kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị a. Mgbe ahụ, onyeisi ezinụlọ ahụ were iwe wee sị ohu ya, ‘Gaa ọsọ ọsọ n’okporo ámá na n’ụzọ ámá obodo, kpọbata ndị ogbenye na ndị nwere nkwarụ na ndị ìsì na ndị ngwọrọ n’ebe a.’+ 22  Mgbe oge gatụrụ, ohu ahụ sịrị, ‘Nna anyị ukwu, e mewo ihe i nyere n’iwu, ma a ka nwere ohere.’ 23  Nna ya ukwu wee gwa ohu ahụ, sị, ‘Gaa n’okporo ụzọ+ na n’ebe ndị a gbara ogige, rụgide ha ka ha bata, ka ụlọ m wee ju eju.+ 24  N’ihi na ana m asị unu, Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị ahụ a kpọrọ òkù nke ga-edetụ nri anyasị m ire.’”+ 25  Ma oké ìgwè mmadụ so ya na-eme njem, o wee tụgharịa sị ha: 26  “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute m ma ọ kpọghị nna ya na nne ya na nwunye ya na ụmụ ya na ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom asị, ee, kpọọkwa ọbụna mkpụrụ obi ya asị,+ ọ pụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.+ 27  Onye ọ bụla nke na-adịghị eburu osisi ịta ahụhụ ya ma na-eso m apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.+ 28  Dị ka ihe atụ, ọ̀ dị onye n’ime unu nke chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu,+ ka o wee hụ ma ò nwere ihe ga-ezu iji wuchaa ya? 29  Ma ọ́ bụghị ya, o nwere ike ịtọ ntọala ya ma ọ gaghị enwe ike iwucha ya, ndị niile na-ahụ ya pụrụ ịmalite ịkwa ya emo, 30  na-asị, ‘Onye a malitere iwu ụlọ ma o nweghị ike iwucha ya.’ 31  Ma ọ bụ, olee eze nke na-aga ibuso eze ọzọ agha, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbaa izu ma ò nwere ike iji puku ndị agha iri lụso onye ji puku ndị agha iri abụọ na-abịa imegide ya ọgụ?+ 32  N’ezie, ọ bụrụ na ọ pụghị ime otú ahụ, mgbe onye ahụ ka nọ n’ebe dị anya, ọ na-ezipụ ìgwè ndị nnọchiteanya wee rịọ ya ka ya na ya mee udo.+ 33  N’ụzọ dị otú ahụ, n’ezie, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime unu nke na-ahapụghị ihe niile o nwere+ nke pụrụ ịbụ onye na-eso ụzọ m. 34  “N’ezie, nnu dị mma. Ma ọ bụrụ na nnu adịkwaghị atọ ụtọ, gịnị ka a ga-eji mee ka ọ dị ụtọ?+ 35  Ọ dịghị mma ka e tinye ya n’ala ma ọ bụkwanụ ka e were ya mere nri ala. Ndị mmadụ na-awụfu ya n’èzí. Onye nwere ntị ige ntị, ya gee ntị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji