Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 12:1-59

12  N’oge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara nke na ha nọ na-azọ ibe ha ụkwụ, ọ malitere okwu ya site n’ibu ụzọ gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Lezienụ anya maka ihe iko achịcha+ ndị Farisii, ya bụ, ihu abụọ.+  Ma ọ dịghị ihe ọ bụla e zochiri nke ọma nke a na-agaghị ekpughe, ọ dịghịkwa ihe nzuzo nke a na-agaghị amata.+  N’ihi ya, ihe ọ bụla unu kwuru n’ọchịchịrị, a ga-anụ ya n’ìhè, a ga-anọkwa n’elu ụlọ kwusaa ihe unu nọ n’ime ụlọ unu takwunyere mmadụ.+  Ana m asịkwa unu, ndị enyi m,+ Unu atụla egwu ndị na-egbu ahụ́, mgbe ha mesịrị nke a, ha enweghị ike ime ihe ọ bụla ọzọ.+  Ma aga m egosi unu onye unu ga-atụ egwu: Tụọnụ onye ahụ egwu,+ bụ́ onye nwere ikike ịtụba mmadụ na Gehena*+ ma o gbusịa ya. Ee, ana m asị unu, tụọnụ Onye a egwu.+  A na-ere nza ise mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali naanị ihe dị nta, ka ọ́ bụghị ya? Ma a dịghị echefu otu n’ime ha n’ihu Chineke.+  Ma a gụwo ọbụna ntutu isi+ niile unu ọnụ. Unu atụla egwu; unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.+  “Ya mere, ana m asị unu, Onye ọ bụla nke na-ekwupụta+ na mụ na ya dị n’otu n’ihu ndị mmadụ, Nwa nke mmadụ ga-ekwupụtakwa na ya na ya dị n’otu n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke.+  Ma onye na-agọnahụ+ m n’ihu ndị mmadụ ka a ga-agọnahụ n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke.+ 10  Onye ọ bụla nke na-ekwu okwu megide Nwa nke mmadụ, a ga-agbaghara ya; ma a gaghị agbaghara onye na-ekwulu mmụọ nsọ.+ 11  Ma mgbe ha kpọọrọ unu gaa n’ihu nzukọ ọha mmadụ na ndị ọrụ ọchịchị na ndị na-achị isi, unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi zara ọnụ unu ma ọ bụ ihe unu ga-asa ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu;+ 12  n’ihi na mmụọ nsọ+ ga-ezi unu n’oge awa ahụ kpọmkwem ihe ndị unu kwesịrị ikwu.”+ 13  Otu onye n’ime ìgwè mmadụ ahụ wee sị ya: “Onye Ozizi, gwa nwanne m nwoke ka mụ na ya kee ihe nketa anyị.” 14  Ọ sịrị ya: “Nwoke m, ònye mere m ọkàikpe+ ma ọ bụ onye na-ekere unu ihe?” 15  O wee sị ha: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla,+ n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.”+ 16  O wee nye ha otu ihe atụ, sị: “Ala nke otu onye bara ọgaranya mepụtara ihe nke ọma. 17  N’ihi ya, ọ malitere iche n’obi ya, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na mụ enweghị ebe ọ bụla m ga-achịkọta ihe ubi m?’ 18  Ya mere, ọ sịrị: ‘Ihe m ga-eme bụ:+ M ga-etidasị ụlọ nkwakọba ihe m ma wuo ndị ka ibu, n’ebe ahụ ka m ga-achịkọta mkpụrụ m niile na ezi ihe m niile;+ 19  m ga-asịkwa+ mkpụrụ obi m: “Mkpụrụ obi, i nwere ọtụtụ ezi ihe m kpakọbara maka ọtụtụ afọ; tụsara ahụ́, na-eri, na-aṅụ, mee onwe gị obi ụtọ.”’+ 20  Ma Chineke sịrị ya: ‘Onye na-enweghị uche, n’abalị a ka a na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị.+ Ònye ga-enwezi ihe ndị ị kwakọbara?’+ 21  Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”+ 22  O wee sị ndị na-eso ụzọ ya: “Ọ bụ ya mere m ji asị unu, Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi.+ 23  N’ihi na mkpụrụ obi dị oké ọnụ ahịa karịa nri, ahụ́ dịkwa oké ọnụ ahịa karịa ákwà. 24  Rịbanụ ama nke ọma na ugoloọma+ adịghị akụ mkpụrụ, ha adịghịkwa ewe ihe ubi, ha enweghịkwa ọba ma ọ bụ ụlọ nkwakọba ihe, ma Chineke na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa nnụnụ?”+ 25  Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit n’afọ ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?+ 26  Ya mere, ọ bụrụ na unu apụghị ime ihe a kasị nta, gịnị mere unu ji echegbu onwe unu+ banyere ihe ndị fọdụrụ? 27  Rịbanụ ama nke ọma otú okooko lili si eto,+ ha adịghị adọgbu onwe ha n’ọrụ, ha adịghịkwa atụ ogho; ma ana m asị unu, Ọbụna Sọlọmọn, n’ebube ya niile, eyighị uwe mara mma dị ka otu n’ime ha.+ 28  Ọ bụrụkwa na Chineke si otú a na-eyiwe ahịhịa ndụ dị n’ubi uwe, nke na-adị taa, ma echi, a tụba ya n’ekwú, lee ka ọ ga-esi yiwe unu uwe karị, unu ndị okwukwe nta!+ 29  Ya mere, kwụsịnụ ịnọ na-achọ ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ, kwụsịkwanụ ịnọ na-echegbu onwe unu;+ 30  n’ihi na ihe ndị a niile bụ ihe ndị mba ọzọ nke ụwa na-achụsosi ike, ma Nna unu maara na ihe ndị a dị unu mkpa.+ 31  Ka o sina dị, na-achọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a.+ 32  “Unu atụla egwu,+ ìgwè atụrụ nta,+ n’ihi na ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.+ 33  Reenụ+ ihe unu nwere ma were ya nye onyinye ebere.+ Meerenụ onwe unu obere akpa ego ndị na-adịghị aka aka, bụ́ akụ̀ nke na-adịghị agwụ agwụ n’eluigwe,+ ebe onye ohi na-adịghị eru nso, ebe nla na-adịghịkwa erichapụ. 34  N’ihi na ebe akụ̀ unu dị, n’ebe ahụ ka obi unu ga-adịkwa.+ 35  “Keenụ ájị̀ n’úkwù,+ ka oriọna+ unu na-enwukwa enwu, 36  unu onwe unu, dịrịnụ ka ndị na-echere nna ha ukwu+ mgbe o si ịlụ nwaanyị na-alọta,+ ka ọ ga-abụ na mgbe ọ lọtara kụọ aka,+ ha ga-emeghere ya ụzọ ozugbo. 37  Obi ụtọ na-adịrị ndị ohu ahụ bụ́ ndị nna ha ukwu lọtara wee hụ na ha na-eche nche!+ N’ezie, ana m asị unu, Ọ ga-eke onwe ya ihe okike+ ma mee ka ha nọdụ ala iri ihe na tebụl, ọ ga-abịarukwa nso wee jeere ha ozi.+ 38  Ọ bụrụkwa na ọ lọta n’oge nche nke abụọ,* ọ bụrụgodị na nke atọ, ma hụ ha otú ahụ, obi ụtọ na-adịrị ha!+ 39  Ma maranụ nke a, na a sị na onyeisi ezinụlọ maara awa onye ohi ga-abịa, ọ gaara anọ na-eche nche, ọ garaghị ekwe ka a waba n’ụlọ ya.+ 40  Unu onwe unu kwa, dịrịnụ njikere, n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị na ọ pụrụ ịbụ ka Nwa nke mmadụ na-abịa.”+ 41  Pita wee sị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị ka ị na-enye ihe atụ a ka ọ̀ bụ mmadụ niile?” 42  Onyenwe anyị wee sị: “Ònye n’ezie bụ onye ahụ na-elekọta ụlọ,+ onye kwesịrị ntụkwasị obi,+ nke nwere uche, onye nna ya ukwu ga-eme onye na-elekọta ìgwè ndị na-ejere ya ozi, ka ọ na-enye ha ihe oriri ga-ezuru ha n’oge kwesịrị ekwesị?+ 43  Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ, ma ọ bụrụ na nna ya ukwu erute hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ!+ 44  N’eziokwu ana m asị unu, Ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.+ 45  Ma ọ bụrụ na ohu ahụ ekwuo mgbe ọ bụla n’obi ya, sị: ‘Nna m ukwu na-egbu oge ịbịa,’+ wee malite iti ndị ikom na-eje ozi na ndị inyom na-eje ozi ihe, nakwa iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ na ịṅụbiga mmanya ókè,+ 46  nna ukwu nke ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya nakwa n’oge awa ọ na-amaghị,+ ọ ga-enyekwa ya oké ahụhụ ma kenye ya òkè n’ebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nọ.+ 47  Ma ohu ahụ nke ghọtara uche nna ya ukwu ma ghara ịdị njikere ma ọ bụ mee ihe kwekọrọ n’uche ya, a ga-apịa ya ọtụtụ ọnụ ụtarị.+ 48  Ma onye ahụ nke na-aghọtaghị+ wee mee ihe kwesịrị ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ole na ole.+ N’ezie, onye ọ bụla e nyere ihe dị ukwuu, a ga-achọ ihe dị ukwuu+ n’aka ya; onye ndị mmadụ nyekwara ihe dị ukwuu ilekọta, ha ga-achọ ihe ka ukwuu n’aka ya.+ 49  “Abịara m ịmụnye ọkụ+ n’elu ụwa, gịnị ọzọkwa ka m ga-achọ ma ọ bụrụ na a mụnyewo ya? 50  N’ezie, enwere m baptizim nke a gaje ime m, leekwa ka o si ewute m ruo mgbe a ga-emecha ya!+ 51  Ùnu chere na m bịara iweta udo n’elu ụwa? N’ezie, ana m asị unu, ee e, kama ọ bụ nkewa.+ 52  N’ihi na site n’ugbu a gaa n’ihu, a ga-enwe mmadụ ise kewara ekewa n’otu ụlọ, mmadụ atọ megide mmadụ abụọ nakwa mmadụ abụọ megide mmadụ atọ.+ 53  Ha ga-ekewa, nna megide nwa ya nwoke na nwa nwoke megide nna ya, nne megide nwa ya nwaanyị na nwa nwaanyị megide nne ya, nne di megide nwunye nwa ya na nwunye nwa megide nne di ya.”+ 54  O wee gaakwa n’ihu ịgwa ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Mgbe unu hụrụ ígwé ojii ka ọ na-ebili n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ, unu na-ekwu ozugbo ahụ, sị, ‘Oké ifufe mmiri na-abịa,’ ọ na-emekwa otú ahụ.+ 55  Mgbe unu hụrụ na ifufe nke si n’ebe ndịda na-efe, unu na-asị, ‘Oké okpomọkụ ga-adị,’ o wee dị. 56  Ndị ihu abụọ, unu maara otú e si enyocha otú ụwa dị na ihu ígwé, ma olee otú o si bụrụ na unu amaghị otú e si enyocha oge a?+ 57  Gịnị mere na unu adịghị ekpebi n’onwe unu ihe ziri ezi?+ 58  Dị ka ihe atụ, mgbe gị na onye na-emegide gị n’okwu ikpe na-agakwuru onye na-achị achị, mewe ihe ozugbo, mgbe unu ka nọ n’ụzọ, iji dozie esemokwu gị na ya, ka o wee ghara ịkpụga gị n’ihu ọkàikpe, ọkàikpe enyefeekwa gị n’aka onye ọrụ nche ụlọikpe, onye ọrụ nche ụlọikpe atụbakwa gị n’ụlọ mkpọrọ.+ 59  Ana m asị gị, Ị gaghị esi n’ebe ahụ pụta n’ezie ruo mgbe ị kwụrụ obere mkpụrụ ego ikpeazụ nke ga-azụtali naanị ihe dị nnọọ nta.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Lu 12:5 * Lee Ihe Odide Ntụkwasị nke 2.
Lu 12:38*  Lee ihe e dere n’ala ala peeji na Mak 13:35.