Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 11:1-54

11  N’oge ọ nọ n’otu ebe na-ekpe ekpere, mgbe ọ kwụsịrị, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere,+ dị ka Jọn kụziiri ndị na-eso ụzọ ya.”+  O wee sị ha: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere,+ sịnụ, ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ.+ Ka alaeze gị bịa.+  Nye anyị nri+ anyị ga-eri taa dị ka ihe ga-ezuru anyị taa si dị.  Gbaghara anyị mmehie anyị,+ n’ihi na anyị onwe anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla nke mehiere anyị;*+ ekwela ka anyị daba n’ọnwụnwa.”*+  Ọ sịkwara ha: “Ònye n’ime unu ga-enwe enyi, ya agakwuru ya n’etiti abalị wee sị ya, ‘Enyi m, gbazinye m ogbe achịcha atọ,  n’ihi na otu enyi m ka si nnọọ na njem bịa n’ụlọ m, enweghịkwa m ihe m ga-enye ya’?  Onye ahụ esi n’ime ụlọ zaa, sị, ‘Kwụsị inye m nsogbu.+ Akpọchiela m ụzọ, mụ na ụmụntakịrị m edinarawokwa n’ihe ndina; apụghị m ibili nye gị ihe ọ bụla.’  Ana m asị unu, Ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọ bụla n’ihi na ọ bụ enyi ya, ma n’ihi na ọ nọgidesiri ike na-arịọ ya,+ ọ ga-ebili nye ya ihe ọ chọrọ.  N’ihi ya, ana m asị unu, Na-arịọnụ,+ a ga-enye unu; na-achọnụ,+ unu ga-achọta; na-akụnụ aka, a ga-emeghere unu. 10  N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-anata,+ onye ọ bụla nke na-achọkwa na-achọta, a ga-emeghekwara onye ọ bụla nke na-akụ aka. 11  N’ezie, olee nna ọ bụ n’ime unu nke nwa ya+ ga-arịọ azụ̀, ya enye ya agwọ kama inye ya azụ̀? 12  Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ rịọ ya àkwá, ya enye ya akpị? 13  Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye,+ ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ+ karị!” 14  E mesịa, ọ nọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ nke na-akpata ịda ogbi.+ Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ pụtasịrị, onye ogbi ahụ kwuru okwu. Ọ tụkwara ìgwè mmadụ ahụ n’anya. 15  Ma ụfọdụ n’ime ha sịrị: “Ọ bụ ike Bielzebọb bụ́ onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ ka o ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 16  Otú ọ dị, ndị ọzọ malitere ịchọ ka o mee ihe ịrịba ama+ nke si n’eluigwe, ka ha wee nwaa ya ọnwụnwa. 17  Ebe ọ maara ihe ha na-eche,+ ọ sịrị ha: “Alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya na-atọgbọrọ n’efu, ụlọ nke kewakwara wee na-emegide onwe ya na-ada.+ 18  Ya mere, ọ bụrụ na Setan ekewaa wee na-emegide onwe ya, olee otú alaeze ya ga-esi guzo?+ N’ihi na unu na-ekwu na m ji ike Bielzebọb na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ. 19  Ọ bụrụ na ọ bụ ike Bielzebọb ka m ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ ike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha?+ N’ihi nke a, ọ bụ ha ga-ekpe unu ikpe. 20  Ma ọ bụrụ na ọ bụ mkpịsị aka+ Chineke ka m ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, alaeze Chineke akwaala unu n’ezie.+ 21  Mgbe nwoke dị ike,+ nke chị ngwá agha, na-eche obí ya nche, ọ dịghị ihe na-eme ihe ndị o nwere. 22  Ma mgbe onye dị ike karịa ya+ wakporo ya wee merie ya,+ ọ na-eburu ngwá agha ya dum pụọ, bụ́ ndị ọ tụkwasịrị obi, ọ na-ekesakwa ihe ndị ọ napụrụ ya. 23  Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m, onye na-esoghịkwa m na-ekpokọta na-ekposa ekposa.+ 24  “Mgbe mmụọ na-adịghị ọcha si n’ime mmadụ pụta, ọ na-agabiga n’ebe mmiri na-adịghị na-achọ ebe izu ike, mgbe ọ na-adịghị nke ọ chọtara, ọ na-asị, ‘M ga-alaghachi n’ụlọ m si pụọ.’+ 25  Mgbe ọ bịarutekwara, ọ na-ahụ na a zachara ya nke ọma, chọọkwa ya mma. 26  Mgbe ahụ, ọ na-apụ gaa kpọrọ mmụọ asaa+ dị iche iche bụ́ ndị dị njọ karịa ya, mgbe ha banyere, ha na-ebiri n’ebe ahụ; ọnọdụ ikpeazụ nke onye ahụ na-adịkwa njọ karịa nke mbụ.”+ 27  Ma ka ọ nọ na-ekwu ihe ndị a, otu nwaanyị n’ime ìgwè mmadụ ahụ ji oké olu sị ya: “Obi ụtọ na-adịrị afọ+ buru gị na ara ị ṅụrụ!” 28  Ma ọ sịrị: “Ee e, kama nke ahụ, Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!”+ 29  Mgbe ìgwè mmadụ ahụ nọ na-ezukọta, ọ malitere ịsị: “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ; ọ na-achọ ihe ịrịba ama.+ Ma ọ dịghị ihe ịrịba ama a ga-enye ya ma ọ́ bụghị ihe ịrịba ama Jona.+ 30  N’ihi na dị nnọọ ka Jona+ bụụrụ ndị Ninive ihe ịrịba ama, n’otu ụzọ ahụ ka Nwa nke mmadụ ga-abụkwara ọgbọ a. 31  A ga-akpọlite eze nwaanyị+ ndịda n’oge ikpe, ya na ndị ọgbọ a, ọ ga-ama ha ikpe; n’ihi na o si na nsọtụ ụwa bịa ịnụrụ amamihe Sọlọmọn, ma, lee! onye ka Sọlọmọn+ nọ n’ebe a. 32  Ndị Ninive ga-ebili n’oge ikpe, ha na ọgbọ a, ha ga-amakwa ya ikpe; n’ihi na ha chegharịrị n’ihi ihe Jona kwusara;+ ma, lee! onye ka Jona+ nọ n’ebe a. 33  Mgbe mmadụ mụnyere oriọna, ọ na-adọba ya, ọ bụghị n’ebe zoro ezo ma ọ bụ n’okpuru nkata, kama n’elu ihe ndọba oriọna,+ ka ndị na-abata n’ụlọ wee hụ ìhè ya. 34  Oriọna nke ahụ́ gị bụ anya gị. Mgbe anya gị na-elegide otu ebe, ahụ́ gị dum na-enwu gbaa;+ ma mgbe anya gị dị njọ, ahụ́ gị na-agbakwa ọchịchịrị. 35  Ya mere, mụrụ anya. Ikekwe, ìhè nke dị n’ime gị bụ ọchịchịrị.+ 36  N’ihi ya, ọ bụrụ na ahụ́ gị dum nwere ìhè, n’enweghị ebe ọ bụla gbara ọchịchịrị, ahụ́ gị dum ga na-enwu gbaa+ dị ka mgbe ọkụ oriọna na-enye gị ìhè.” 37  Mgbe o kwuru ihe a, otu onye Farisii rịọrọ ya ka o soro ya rie nri ehihie.+ O wee banye ma nọdụ ala na-eri ihe na tebụl. 38  Ya mere, o juru onye Farisii ahụ anya mgbe ọ hụrụ na o bughị ụzọ saa aka+ tupu ya eriwe nri ehihie ahụ. 39  Ma Onyenwe anyị sịrị ya: “Unu ndị Farisii, unu na-eme ka azụ iko na azụ efere dị ọcha, ma n’ime+ unu, unu jupụtara n’ibukọrọ ihe n’ike na ajọ omume.+ 40  Ndị na-enweghị uche! Ọ́ bụghị onye ahụ nke mere azụ+ ya mekwara ime ya? 41  Ka o sina dị, werenụ ihe dị n’ime nye onyinye ebere,+ ma, lee! ihe niile ọzọ banyere unu ga-adị ọcha. 42  Ma ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, n’ihi na unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri+ nke mkpá akwụkwọ mint na mkpá akwụkwọ ruu na nke akwụkwọ nri ọ bụla ọzọ, ma ikpe ziri ezi na ịhụ Chineke n’anya ka unu na-eleghara anya! Unu ji ụgwọ ime ihe ndị a, ma unu agaghị ahapụ ime ihe ndị ọzọ ahụ.+ 43  Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii, n’ihi na ịnọ n’ihu oche ndị dị n’ụlọ nzukọ nakwa ekele a na-ekele n’ọma ahịa na-atọ unu ụtọ!+ 44  Ahụhụ ga-adịrị unu, n’ihi na unu yiri ili ncheta ndị na-apụtaghị ìhè, nke mere na ndị mmadụ na-eje ije n’elu ha n’amaghị ihe ọ bụ!”+ 45  Otu n’ime ndị ahụ maara Iwu+ wee zaa ya, sị: “Onye Ozizi, ị na-akparị anyị site n’ikwu ihe ndị a.” 46  O wee sị: “Ahụhụ ga-adịkwara unu ndị maara Iwu, n’ihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu siri ike obubu, ma unu onwe unu adịghị eji otu n’ime mkpịsị aka unu ebitụ ibu ndị ahụ!+ 47  “Ahụhụ ga-adịrị unu, n’ihi na unu na-ewu ili ncheta ndị amụma, ma, ọ bụ nna nna unu hà gburu ha!+ 48  N’ezie, unu maara ihe nna nna unu hà mere. N’agbanyeghị nke ahụ, unu na-ekwenyere+ ha, n’ihi na ha gburu+ ndị amụma ma unu na-ewu ili ha. 49  N’ihi nke a, amamihe+ Chineke na-asịkwa: ‘M ga-ezigara ha ndị amụma na ndịozi, ha ga-egbu ụfọdụ n’ime ha, kpagbuokwa ha, 50  ka e wee jụta ọbara nke ndị amụma+ niile a wụfuru malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa n’aka ọgbọ a,+ 51  malite n’ọbara Ebel+ ruo n’ọbara Zekaraya,+ bụ́ onye e gburu n’agbata ebe ịchụàjà na ụlọ ahụ.’+ Ee, ana m asị unu, a ga-ajụta ya n’aka ọgbọ a. 52  “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị maara Iwu, n’ihi na unu wepụrụ mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma;+ unu onwe unu abanyeghị, unu gbochikwara ndị chọrọ ịbanye!”+ 53  Ya mere, mgbe o si n’ebe ahụ pụọ, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii malitere ịdagidesi ya ike ma na-ajụ ya ọtụtụ ajụjụ banyere ihe ndị ọzọ, 54  chebiri+ ya, ka ha wee nweta+ ihe n’ọnụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Lu 11:4 * Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “onye ọ bụla nke ji anyị ụgwọ.”
Lu 11:4 * Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa.”