Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 10:1-42

10  Mgbe ihe ndị a gasịrị, Onyenwe anyị họpụtara mmadụ iri asaa+ ọzọ ma zipụ ha abụọ abụọ+ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo nakwa n’ebe ọ bụla ya onwe ya ga-abịa.  O wee malite ịsị ha: “N’ezie, ihe ubi+ hiri nne, ma ndị ọrụ+ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ+ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ+ n’owuwe ihe ubi ya.  Gaanụ. Lee! Ana m ezipụ unu dị ka ụmụ atụrụ+ n’etiti anụ ọhịa wolf.  Unu ewerela obere akpa ego, ma ọ bụ obere akpa nri,+ ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ, unu amakụkwala+ onye ọ bụla mgbe unu na-ekele ya n’okporo ụzọ.  N’ebe ọ bụla unu banyere n’ụlọ, burunụ ụzọ sị, ‘Udo dịrị ụlọ a.’+  Ọ bụrụkwa na onye udo nọ n’ebe ahụ, udo unu ga-adịkwasị ya.+ Ma ọ bụrụ na ọ nọghị, udo unu ga-alaghachikwute unu.+  Ya mere, nọrọnụ n’ụlọ ahụ,+ na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ndị ha nyere unu,+ n’ihi na onye ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya.+ Unu esila n’otu ụlọ gafee n’ụlọ ọzọ.+  “N’ebe ọ bụla unu banyere n’obodo ha wee nabata unu, rienụ ihe ndị e chere unu n’ihu,  gwọọkwanụ+ ndị na-arịa ọrịa n’ime ya, na-asịkwanụ ha, ‘Alaeze+ Chineke adịwo unu nso.’ 10  Ma n’obodo ọ bụla unu banyere ma ha anabataghị+ unu, pụọnụ gaa n’okporo ámá ya ma sị, 11  ‘Ọbụna ájá nke si n’obodo unu rapara anyị n’ụkwụ ka anyị na-etichapụ ka ọ bụrụ ihe akaebe megide unu.+ Otú o sina dị, burunụ n’uche na alaeze Chineke adịwo nso.’ 12  Ana m agwa unu na ọ ga-adịrị Sọdọm+ mfe n’ụbọchị ahụ karịa obodo ahụ. 13  “Ahụhụ ga-adịrị gị, Korezin!+ Ahụhụ ga-adịrị gị, Betseida!+ n’ihi na a sị na ọ bụ na Taya na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ dị ike ndị a rụrụ n’ime unu, ha gaara echegharị ogologo oge gara aga, yiri ákwà iru uju nọdụ ọdụ ná ntụ.+ 14  N’ihi ya, ọ ga-adịrị Taya na Saịdọn mfe n’oge ikpe karịa unu.+ 15  Gị onwe gị kwa, Kapaniọm, à ga-ebuli gị elu ruo n’eluigwe?+ Ị ga-agbadaru Hedis!+ 16  “Onye na-ege unu ntị+ na-egekwa m ntị. Onye na-eleda unu anya na-eledakwa mụ onwe m anya. Ọzọkwa, onye na-eleda m anya na-eledakwa+ onye ahụ nke zitere m anya.” 17  Mmadụ iri asaa ahụ wee jiri ọṅụ lọta, na-asị: “Onyenwe anyị, e doro ọbụna ndị mmụọ ọjọọ+ n’okpuru anyị site n’ịkpọ aha gị.” 18  O wee sị ha: “Amalitewo m ịhụ Setan ka ọ dara+ dị ka àmụ̀mà nke si n’eluigwe. 19  Lee! Enyewo m unu ikike ịzọkwasị agwọ+ na akpị+ ụkwụ na ikike imeri ike niile nke onye iro,+ ọ dịghịkwa ihe ga-emerụ unu ahụ́ ma ọlị. 20  Otú o sina dị, unu aṅụrịla ọṅụ n’ihi nke a, na a na-eme ka mmụọ dị iche iche nọrọ n’okpuru unu, kama ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi na e dewo aha+ unu n’eluigwe.” 21  N’oge awa ahụ, o nwere oké ọṅụ+ n’ime mmụọ nsọ, wee sị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị maara ihe+ na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a nke ọma ma kpugheere ha ụmụ ọhụrụ. Ee, Nna, n’ihi na ime otú ahụ bụ ụzọ ị kwadoro. 22  Nna m enyefewo ihe niile n’aka m,+ ọ dịghịkwa onye maara onye Ọkpara ahụ bụ ma e wezụga Nna+ ya; ọ dịghịkwa onye maara onye Nna ahụ bụ ma e wezụga Ọkpara+ ya nakwa onye Ọkpara ya chọrọ ikpughere ya.” 23  O wee gwa ndị na-eso ụzọ ya mgbe naanị ya na ha nọ, sị: “Obi ụtọ na-adịrị anya nke na-ahụ ihe unu na-ahụ.+ 24  N’ihi na ana m asị unu, Ọtụtụ ndị amụma na ndị eze chọrọ ịhụ+ ihe ndị unu na-ahụ, ma ha ahụghị ha, ha chọkwara ịnụ ihe ndị unu na-anụ, ma ha anụghị ha.” 25  Ma, lee! otu nwoke nke maara Iwu+ biliri ọtọ, iji nwalee ya, wee sị: “Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?”+ 26  O wee sị ya: “Gịnị ka e dere n’Iwu?+ Gịnị ka ị gụtara?” 27  Ọ zara, sị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na ike gị dum na uche gị dum hụ Jehova Chineke gị n’anya,’+ hụkwa ‘onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’”+ 28  O wee sị ya: “Ị zara nke ọma; ‘na-eme nke a, ị ga-enwetakwa ndụ.’”+ 29  Ma, ebe nwoke ahụ chọrọ igosi na ya bụ onye ezi omume, ọ sịrị Jizọs: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?”+ 30  Jizọs zara, sị: “Otu nwoke si Jeruselem na-agbada Jeriko ma daba n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe, bụ́ ndị gbara ya ọtọ, kụọkwa ya ihe, wee pụọ, hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma. 31  Ma ọ dabara na otu onye nchụàjà nọ na-agbada n’okporo ụzọ ahụ, ma, mgbe ọ hụrụ ya, o si n’akụkụ nke ọzọ gafere.+ 32  N’otu aka ahụ, mgbe onye Livaị rutere ebe ahụ hụ ya, o si n’akụkụ nke ọzọ gafere.+ 33  Ma otu onye Sameria+ nke si n’ụzọ ahụ na-agafe rutere n’ebe ọ nọ na mberede, mgbe ọ hụrụ ya, o nwere ọmịiko. 34  Ya mere, ọ gakwuuru ya wee kechie ọnyá ya, wụkwasị ha mmanụ na mmanya.+ O wee kukwasị ya n’anụ ụlọ nke ya ma bute ya n’ụlọ ndị njem wee lekọta ya. 35  N’echi ya kwa, o wepụtara mkpụrụ ego dinarịọs abụọ, nye ya onye na-elekọta ụlọ ndị njem ahụ, sị ya, ‘Lekọtawa ya, m ga-akwụ gị ihe ọ bụla i mefuru n’elu nke a mgbe m ga-abịaghachi n’ebe a.’ 36  Ònye n’ime mmadụ atọ a yiri gị ka onye gosiri na ya bụ onye agbata obi+ nke nwoke ahụ dabara n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe?” 37  O wee sị: “Ọ bụ onye ahụ nke mesoro ya ihe n’obi ebere.”+ Jizọs wee sị ya: “Gawa, gị onwe gị, na-emekwa otú ahụ.”+ 38  Ma ka ha nọ na-aga, ọ banyere n’otu obodo nta. N’ebe a, otu nwaanyị aha ya bụ Mata+ nabatara ya n’ụlọ ya dị ka ọbịa. 39  Nwaanyị a nwekwara nwanne nwaanyị a na-akpọ Meri, bụ́ onye nọdụrụ ala n’akụkụ ụkwụ Onyenwe anyị+ ma na-ege ntị n’ihe ọ na-ekwu. 40  Ma ọtụtụ ihe Mata nọ na-eme dọpụrụ uche ya.+ Ya mere, ọ bịaruru nso wee sị: “Onyenwe anyị, ọ́ bụghịrị gị ihe ọ bụla na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ihe niile ka m mewe?+ Ya mere, gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41  Onyenwe anyị zara ya, sị: “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị,+ na-esogbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe.+ 42  Ma, ihe dị mkpa bụ ihe ole na ole+ ma ọ bụ naanị otu ihe. Ma Meri họọrọ òkè dị mma,+ a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji