Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Luk 1:1-80

1  Ebe ọtụtụ ndị gbalịworo ide ihe ndị mere eme+ bụ́ ndị anyị kwenyezuru,  dị nnọọ ka ndị ji anya ha hụ+ ihe ndị a site ná mmalite,+ ndị kwusakwara ozi ahụ,+ nyefere anyị ihe ndị a,  ekpebikwara m idetara gị ihe ndị a n’usoro n’usoro,+ gị Tiofilọs+ onye ukwu,+ n’ihi na esi m ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi,  ka i wee mara n’ụzọ zuru ezu na ihe niile e ji ọnụ kụziere gị bụ eziokwu.+  N’ụbọchị Herọd,+ bụ́ eze Judia, e nwere otu onye nchụàjà aha ya bụ Zekaraya nke nọ n’ìgwè nke Abaịja.+ O nwekwara nwunye onye bụ́ otu n’ime ụmụ Erọn.+ Aha ya bụ Elizabet.  Ha abụọ bụ ndị ezi omume+ n’ihu Chineke n’ihi na ha na-eje ije otú a na-apụghị ịta ha ụta,+ dị ka iwu+ na ntụziaka+ niile nke Jehova si dị.+  Ma ha enweghị nwa, n’ihi na Elizabet bụ nwaanyị aga,+ ha abụọ emewokwa agadi.  Ma ka ọ nọ na-arụ ọrụ dị ka onye nchụàjà n’ebe e kenyere ìgwè nke ya ọrụ+ n’ihu Chineke,  dị ka ndị nchụàjà na-eme, o ruuru ya isure ihe na-esi ísì ụtọ n’ọkụ+ mgbe ọ banyere n’ebe nsọ Jehova;+ 10  ìgwè mmadụ niile nọkwa na-ekpe ekpere n’èzí n’oge awa e ji esure ihe na-esi ísì ụtọ n’ọkụ.+ 11  Mmụọ ozi Jehova pụtara ìhè n’ihu ya wee guzoro n’akụkụ aka nri nke ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.+ 12  Ma ihe Zekaraya hụrụ malitere inye ya nsogbu, egwu wee jide ya.+ 13  Otú ọ dị, mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Zekaraya, atụla egwu, n’ihi na a nụwo arịrịọ ị na-arịọsi ike,+ nwunye gị bụ́ Elizabet ga-amụkwara gị nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.+ 14  Ị ga-enwekwa ọṅụ na oké obi ụtọ, ọtụtụ ndị ga-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihi ọmụmụ ya; 15  n’ihi na ọ ga-abụ onye ukwu n’ihu Jehova.+ Ma ọ gaghị aṅụ mmanya na ihe ọṅụṅụ ọ bụla na-egbu egbu ma ọlị,+ ọ ga-ejupụtakwa na mmụọ nsọ malite n’afọ nne ya;+ 16  ọ ga-eme ka ọtụtụ ụmụ Izrel chigharịkwuru Jehova+ bụ́ Chineke ha. 17  Ọ ga-ejikwa mmụọ na ike Ịlaịja+ butere ya ụzọ, iji mee ka obi+ nke ndị bụ́ nna chigharikwuru ụmụ ha, meekwa ka ndị na-enupụ isi nwee ezi amamihe nke ndị ezi omume, iji kwadebere Jehova+ otu ndị.”+ 18  Zekaraya wee gwa mmụọ ozi ahụ, sị: “Olee otú m ga-esi jide nke a n’aka? N’ihi na akawo m nká,+ nwunye m emewokwa agadi.” 19  Mmụọ ozi ahụ wee zaa ya, sị: “Abụ m Gebriel,+ onye na-eguzo n’ihu Chineke, e zitere m ka m gwa gị okwu+ ma zie gị ozi ọma banyere ihe ndị a. 20  Ma, lee! ị ga-ada ogbi,+ ị gaghịkwa enwe ike ikwu okwu ruo ụbọchị ihe ndị a ga-eme, n’ihi na i kweghị ihe m kwuru, bụ́ ndị a ga-emezu n’oge ha a kara aka.” 21  Ka nke a na-eme, mmadụ niile nọ na-echere Zekaraya,+ oge ọ na-egbu n’ebe nsọ ahụ malitekwara iju ha anya. 22  Ma mgbe ọ pụtara, o nweghị ike ịgwa ha okwu, ha wee ghọta na ọ ka hụchara ihe dị ebube+ n’ebe nsọ ahụ; o wee jiri aka na-agwa ha okwu, ma ọ ka dara ogbi. 23  Ma, mgbe ụbọchị nke ya maka ijere ọha mmadụ ozi zuru,+ ọ lawara n’ụlọ ya. 24  Ma mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, Elizabet nwunye ya tụụrụ ime;+ o wee nọrọ n’ụlọ n’apụtaghị apụta ruo ọnwa ise, sị: 25  “Nke a bụ ụzọ Jehova si meso m ihe n’ụbọchị ndị a o chere ihu n’ebe m nọ iji wepụ nkọcha ndị mmadụ na-akọcha m.”+ 26  N’ọnwa nke isii ya, Chineke zipụrụ mmụọ ozi Gebriel+ ka ọ gaa n’obodo Galili nke a na-akpọ Nazaret, 27  ka ọ gakwuru nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke e kwere nkwa na otu nwoke aha ya bụ Josef ga-alụ, bụ́ onye si n’ụlọ Devid; aha nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke+ bụ Meri.+ 28  Mgbe ọ gakwuuru ya, ọ sịrị ya: “Ndeewo,+ onye e meere amara dị ukwuu, Jehova+ nọnyeere gị.”+ 29  Ma okwu ahụ nyere ya nsogbu nke ukwuu, o wee malite ịtụle ụdị ekele nke a pụrụ ịbụ. 30  Ya mere, mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Atụla egwu, Meri, n’ihi na Chineke meere gị amara;+ 31  lee! ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke,+ ị ga-agụkwa ya Jizọs.+ 32  Onye a ga-abụ onye ukwu,+ a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu;+ Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze+ Devid bụ́ nna ya,+ 33  ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.”+ 34  Ma Meri sịrị mmụọ ozi ahụ: “Olee otú nke a ga-esi mee, ebe ọ bụ na mụ na nwoke ọ bụla enwetụbeghị mmekọahụ?”+ 35  Mmụọ ozi ahụ zara ya, sị: “Mmụọ nsọ+ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ,+ Ọkpara Chineke.+ 36  Ma, lee! Elizabet onye ikwu gị atụrụwokwa ime nwa nwoke n’agadi ya, bụ́ onye a sị na ọ bụ nwaanyị aga, nke a bụkwa ọnwa nke isii ya;+ 37  n’ihi na, n’ebe Chineke nọ, ọ dịghị okwu ọ bụla e kwupụtaworo nke ga-abụ ihe na-apụghị ime eme.”+ 38  Meri wee sị: “Lee! Abụ m nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova!+ Ka o mee dị ka i kwuru.” Mmụọ ozi ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ. 39  Ya mere, Meri biliri n’ụbọchị ndị a ma banye ngwa ngwa n’ógbè bụ́ ugwu ugwu, n’otu obodo Juda, 40  o wee banye n’ụlọ Zekaraya ma kelee Elizabet. 41  Ka Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya n’afọ maliri; Elizabet jupụtakwara na mmụọ nsọ, 42  o wee tie mkpu n’olu dara ụda, sị: “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ n’etiti ndị inyom, ihe a gọziri agọzi+ ka mkpụrụ nke afọ gị bụkwa! 43  Ya mere, olee otú o si bụrụ na m nwetara ihe ùgwù a, na nne nke Onyenwe m+ bịakwutere m? 44  N’ihi na, lee! ka m nụrụ ụda ekele gị, nwa nọ m n’afọ maliri n’obi ụtọ.+ 45  Obi ụtọ na-adịkwara nwaanyị nke kweere, n’ihi na a ga-emezucha+ ihe ndị ahụ a gwara ya site n’ebe Jehova nọ.”+ 46  Meri wee sị: “Mkpụrụ obi m na-eto Jehova,+ 47  mmụọ m apụghịkwa ịkwụsị inwe oké ọṅụ+ n’ebe Chineke bụ́ Onye Nzọpụta m nọ;+ 48  n’ihi na o lekwasịwo anya n’ọnọdụ dị ala nke ohu ya nwaanyị.+ N’ihi na, lee! site ugbu a gaa n’ihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye obi ụtọ;+ 49  n’ihi na Onye ahụ nke dị ike emeworo m oké ihe dị iche iche, aha ya dịkwa nsọ;+ 50  sitekwa n’ọgbọ ruo n’ọgbọ ebere ya na-adịkwasị ndị na-atụ egwu ya.+ 51  O jiriwo ogwe aka ya rụọ oké ọrụ,+ ọ chụsasịwo ndị dị mpako n’ihe ha bu n’obi.+ 52  Ọ kwatuwo ndị nwere ike+ n’ocheeze, buliekwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha elu;+ 53  o werewo ihe ọma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ,+ o mewokwa ka ndị nwere akụ̀ gbara aka laa.+ 54  Ọ gbataworo Izrel bụ́ ohu ya ọsọ enyemaka,+ iji cheta ebere+ 55  ọ ga-emere Ebreham na mkpụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi, dị nnọọ ka ọ gwara nna nna anyị hà.”+ 56  Meri wee nọnyere ya ruo ihe dị ka ọnwa atọ, wee laghachi n’ụlọ nke ya. 57  Oge ruru ka Elizabet mụọ nwa. O wee mụọ nwa nwoke. 58  Ndị agbata obi na ndị ikwu ya nụkwara na Jehova emeworo ya ebere ya dị ukwuu,+ ha wee soro ya na-aṅụrị ọṅụ.+ 59  N’ụbọchị nke asatọ, ha bịara ibi nwatakịrị ahụ úgwù,+ ha chọkwara ịgụ ya aha nna ya, bụ́ Zekaraya. 60  Ma nne ya sịrị: “Ee e! kama a ga-agụ ya Jọn.” 61  Mgbe o kwuru nke a, ha sịrị ya: “E nweghị onye ọ bụla n’etiti ndị ikwu gị nke a na-akpọ aha a.” 62  Ha wee jiri aka na-ajụ nna ya ihe ọ chọrọ ka a kpọọ ya. 63  O wee sị ka e nye ya mbadamba ihe, o wee dee, sị: “Jọn+ bụ aha ya.” O wee ju ha niile anya. 64  Ọnụ ya meghere+ ozugbo, a tọghekwara ire ya, o wee malite ikwu okwu, na-agọzi Chineke. 65  Egwu wee jide ndị niile bi n’agbata obi ha; a malitekwara ịkọsasị ihe ndị a niile n’ógbè Judia dum bụ́ ugwu ugwu, 66  ndị niile nụrụ ya wee buru ya n’obi,+ wee sị: “Gịnị n’ezie ka nwatakịrị a ga-abụ?” N’ihi na aka+ Jehova dịnyeere ya. 67  Zekaraya bụ́ nna ya jupụtara na mmụọ nsọ,+ o wee buo amụma,+ sị: 68  “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi,+ n’ihi na o lebaworo ndị ya+ anya wee napụta ha.+ 69  O mewokwa ka mpi+ nzọpụta biliere anyị n’ụlọ Devid bụ́ ohu ya, 70  dị nnọọ ka o si n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ nke oge ochie+ kwuo okwu 71  banyere ịzọpụta anyị n’aka ndị iro anyị nakwa n’aka ndị niile kpọrọ anyị asị;+ 72  iji meere anyị ebere nke o kwere nna nna anyị hà ná nkwa, iji cheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ,+ 73  bụ́ iyi ọ ṅụụrụ Ebreham bụ́ nna nna anyị,+ 74  iji nye anyị ihe ùgwù nke ijere ya ozi dị nsọ n’atụghị egwu,+ mgbe a napụtasịrị anyị n’aka ndị iro,+ 75  bụ́ ozi anyị ga-eje n’ihu ya ụbọchị anyị niile n’iguzosi ike n’ihe na ezi omume.+ 76  Ma gị onwe gị, nwatakịrị, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye Kasị Elu, n’ihi na ị ga-ebute ụzọ gaa n’ihu Jehova iji kwadebe ụzọ ya,+ 77  iji mee ka ndị ya mata banyere nzọpụta site ná mgbaghara nke mmehie ha,+ 78  n’ihi obi ọmịiko nke Chineke anyị. N’ihi ọmịiko a, anyị ga-ahụ ìhè nke ga-esi n’eluigwe+ nwuo dị ka mgbe chi bọrọ,+ 79  iji nye ndị nọ ọdụ n’ọchịchịrị nakwa n’onyinyo ọnwụ ìhè,+ iji duru ụkwụ anyị gaa n’ụzọ nke udo, gọziekwa anyị na ya.” 80  Nwatakịrị ahụ wee na-eto,+ na-agbasikwa ike n’ime mmụọ, ọ nọgidekwara n’ọzara ruo ụbọchị o gosiri Izrel onwe ya n’ihu ọha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji