Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jona 2:1-10

2  Jona wee nọrọ n’afọ azụ̀+ ahụ kpekuo Jehova bụ́ Chineke ya ekpere  wee sị: “N’ahụhụ ka m nọ kpọkuo Jehova,+ o wee za m.+ N’afọ Shiol ka m nọ tie mkpu maka enyemaka.+ Ị nụrụ olu m.+   Mgbe ị tụbara m n’ala ala mmiri, n’etiti ogbu oké osimiri,+ Oké osimiri wee kpuchie m. Oké mmali mmiri na ebili mmiri gị niile—n’elu m ka ha gafere.+   Ma mụ onwe m sịrị, ‘A chụpụwo m n’ihu gị!+ Olee otú m ga-esi ahụ ụlọ nsọ gị ọzọ?’+   Mmiri kpuchiri mkpụrụ obi m;+ ogbu mmiri kpuchikwara m. Ahịhịa tụhịrị m n’isi.   N’ala ala ugwu ka m gbadara. E ji ihe e ji atụchi elu ala tụchibido m ruo mgbe a na-akaghị aka. Ma ị napụtara ndụ m n’olulu, Jehova bụ́ Chineke m.+   Mgbe mkpụrụ obi m tụbọrọ,+ ọ bụ Jehova ka m chetara.+ Ekpere m wee ruo gị ntị, n’ime ụlọ nsọ gị.+   Ma ndị na-efe arụsị ụgha na-ahapụ onye na-egosi ha obiọma.*+   Ma mụ onwe m ga-eji olu ekele m chụọrọ gị àjà.+ M ga-emezu ihe m kwere ná nkwa.+ Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.”+ 10  Ka oge na-aga, Jehova nyere azụ̀ ahụ iwu, o wee gbọpụta Jona n’ala akọrọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Jo 2:8*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”