Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Joel 3:1-21

3  “N’ihi na lee, n’ụbọchị ndị ahụ nakwa n’oge ahụ,+ mgbe m ga-akpọghachite ndị Juda na ndị Jeruselem a dọọrọ n’agha,+  m ga-achịkọtakwa mba niile+ ma mee ka ha gbadata na ndagwurugwu Jehọshafat;+ m ga-ekpe ha ikpe n’ebe ahụ n’ihi ndị m nakwa n’ihi ihe nketa m bụ́ Izrel,+ bụ́ ndị ha chụsasịrị ná mba dị iche iche; ha kesakwara ala m.+  Ha nọ na-efe nza+ iji kee ndị m n’etiti onwe ha; ha na-eji nwa nwoke agbanweta akwụna,+ ha na-erekwa nwa nwaanyị iji zụrụ mmanya ka ha ṅụọ.  “Oleekwa ihe jikọrọ mụ na unu, Taya na Saịdọn+ na unu ógbè niile nke Filistia?+ Ọ̀ bụ mmeso a ka unu ji na-akwụ m ụgwọ? Ọ bụrụkwa otú a ka unu na-emeso m, m ga-akwụ unu ụgwọ mmeso unu ngwa ngwa, n’egbughị oge.+  N’ihi na unu eburuwo ọlaọcha m na ọlaedo m,+ unu ebubawo ihe ọma m a na-achọsi ike n’ụlọ nsọ unu;+  unu eresịwokwa+ ndị Gris+ ụmụ Juda na ụmụ Jeruselem, iji kpọpụ ha n’ókèala ha kpọga ha n’ebe dị anya;+  lee, aga m akpali ha ka ha si n’ebe unu refuru+ ha bịa, m ga-akwụ unu ụgwọ mmeso unu mesoro ha.+  M ga-eresịkwa ụmụ Juda+ ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom, ha ga-eresịkwa ha ndị Shiba,+ refuo ha ná mba dị anya;+ n’ihi na Jehova ekwuwo ya.  “Kpọsaanụ n’etiti mba dị iche iche,+ sị, ‘Jikerenụ agha!* Kpalienụ ndị dị ike!+ Ka ha bịa nso! Ka ha gbagote, ya bụ, ndị ikom niile na-aga agha!+ 10  Kpụgharịanụ mma ogè+ unu ka ha bụrụ mma agha, kpụgharịakwanụ mma unu ji akwa osisi ka ha bụrụ ube. Ka onye na-adịghị ike sị: “Abụ m nwoke dị ike.”+ 11  Bịanụ nyere ibe unu aka, unu mba niile ndị bi gburugburu,+ zukọtanụ.’”+ Jehova, biko, mee ka ndị gị bụ́ ndị dị ike gbadata n’ebe ahụ.+ 12  “Ka a kpalie mba dị iche iche, ka ha bịakwa na ndagwurugwu Jehọshafat;+ n’ihi na m ga-anọdụ ala n’ebe ahụ ikpe mba niile ndị bi gburugburu ikpe.+ 13  “Tinyenụ mma owuwe ihe ubi,+ n’ihi na ihe ubi achawo.+ Bịanụ, gbadatanụ, n’ihi na ebe nzọchapụta mmanya ejuwo.+ Olulu ịzọchapụta mmanya ejubigawo ókè; n’ihi na ihe ọjọọ ha adịwo ukwuu.+ 14  Ìgwè mmadụ, ìgwè mmadụ jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe,+ n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso na ndagwurugwu mkpebi ikpe.+ 15  Anyanwụ na ọnwa ga-agba ọchịchịrị, kpakpando ga-akwụsị inye ìhè ha.+ 16  Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ, ọ ga-emekwa ka olu ya+ si na Jeruselem kwuo okwu. Eluigwe na ụwa ga-emekwa mkpatụ;+ ma Jehova ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba,+ ọ ga-abụkwara ụmụ Izrel ebe e wusiri ike.+ 17  Unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova bụ́ Chineke unu,+ onye bi na Zayọn bụ́ ugwu nsọ m.+ Jeruselem ga-aghọ ebe dị nsọ;+ ndị ala ọzọ agaghịkwa esi n’ime ya gafere ọzọ.+ 18  “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na mmanya dị ụtọ+ ga-esi n’ugwu na-atapụsị, mmiri ara ehi ga na-eru n’ugwu nta, mmiri ga na-asọ n’ọwa mmiri niile nke Juda. Isi iyi ga-esi n’ụlọ Jehova na-asọpụta,+ ọ ga na-edekwa Ndagwurugwu Osisi Akeshịa+ mmiri. 19  Ijipt ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu;+ Idọm ga-aghọkwa ala ịkpa nke tọgbọrọ n’efu,+ n’ihi ihe ike ha mesoro ụmụ Juda, bụ́ ndị ha nọ n’ala ha wụfuo ọbara na-emeghị ihe ọjọọ.+ 20  Ma mmadụ ga-ebi na Juda ruo mgbe a na-akaghị aka.+ A ga-ebikwa na Jeruselem site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.+ 21  Ọbara ha nke m gụrụ dị ka nke mere ihe ọjọọ ka m ga-agụ dị ka nke na-emeghị ihe ọjọọ;+ Jehova ga-ebikwa na Zayọn.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Joe 3:9*  Ya bụ, “doonụ agha nsọ.”