Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 8:1-22

8  Bildad onye si n’agbụrụ Shua+ wee zaa, sị:   “Ruo ole mgbe ka ị ga na-ekwu ihe ndị a,+ Mgbe okwu si gị n’ọnụ bụ naanị ifufe nke na-efesi ike?+   Chineke ọ̀ ga-agbagọ ikpe,+ Ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọ̀ ga-agbagọ ezi omume?+   Ọ bụrụ na ụmụ gị emehiewo ya, O wee hapụ ha ka ha taa ahụhụ nnupụisi ha,   Ọ bụrụ na gị onwe gị achọọ Chineke,+ Ọ bụrụkwa na ị rịọ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka o meere gị amara,   Ọ bụrụ na ị dị ọcha, na-emekwa ihe ziri ezi,+ Ọ gaara etetaworị n’ihi gị, Ọ gaara eweghachikwara gị ebe obibi ezi omume gị.   Ị gakwaara eji ntakịrị ihe malite, Ma ị gaara abụ nnọọ onye ukwu n’ikpeazụ.+   Biko, jụọ ajụjụ banyere ọgbọ gara aga,+ Chebakwara ihe ndị nna ha chọpụtara echiche.+   N’ihi na ọ bụ ụnyaahụ ka a mụrụ anyị,+ ọ dịghịkwa ihe anyị ma, N’ihi na ụbọchị ndụ anyị n’elu ụwa bụ onyinyo.+ 10  Ọ̀ bụ na ha agaghị akụziri gị ihe, kọọkwara gị, Ọ̀ bụkwa na ha agaghị ekwu ihe dị ha n’obi? 11  Ahịhịa papaịrọs+ ọ̀ ga-eto ogologo ma ọ́ bụghị n’ebe mmiri na-adọ? Ahịhịa amị ọ̀ ga-agba agba ma ọ bụrụ na mmiri adịghị? 12  Mgbe ọ na-amabeghị ifuru, mgbe a na-akajipụghị ya, Ọ ga-ebu ọbụna ahịhịa niile ọzọ ụzọ kpọọ nkụ.+ 13  Otú ahụ ka ụzọ ndị niile na-echefu Chineke dị,+ Olileanya nke onye si n’ezi ofufe dapụ ga-alakwa n’iyi,+ 14  Bụ́ onye e wepụrụ obi ike ya, Onye ntụkwasị obi ya bụkwa ọnyà ududo.+ 15  Ọ ga-adabere n’ụlọ ya, ma ọ gaghị adịgide; Ọ ga-ejide ya aka, ma ọ gaghị adịgide. 16  Mmiri na-eju ya n’ahụ́ n’ihu anyanwụ, Ome ya na-etokwa n’ubi ya.+ 17  N’ikpo nkume ka mgbọrọgwụ ya niile na-ahịkọta ọnụ, Ọ bụkwa ụlọ nkume ka ọ na-ahụ. 18  Ọ bụrụ na e fopụ ya n’ebe ọ nọ,+ Ọ ga-agọnahụ ya, sị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’+ 19  Lee! Ọ bụ otú a ka ụzọ ya ga-esi laa n’iyi;+ Ndị ọzọ ga-esikwa n’ájá pulite. 20  Lee! Chineke agaghị ajụ onye ọ bụla nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, Ọ gaghịkwa ejide aka ndị na-eme ihe ọjọọ, 21  Ruo mgbe o mere ka ọchị ju gị ọnụ, Meekwa ka egbugbere ọnụ gị jupụta ná mkpu ọṅụ. 22  Onye ọ bụla nke na-akpọ gị asị ga-eyiri ihere dị ka uwe,+ Ụlọikwuu ndị ajọ omume agaghị adịgide.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji