Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 7:1-21

7  “Ọ̀ bụ na mmadụ efu enweghị ọrụ a manyere+ ya ịrụ n’elu ụwa, Ọ̀ bụ na ụbọchị ya adịghịkwa ka ụbọchị onye ọrụ e goro ego?+   Dị ka ohu, ọ na-agụsi ya agụụ ike inwe ndò,+ Dịkwa ka onye ọrụ e goro ego, ọ na-echere ụgwọ ọrụ ya.+   Otú ahụ ka e si mee ka m nwee ọnwa+ ndị na-abaghị uru, Ha ekenyewokwa m abalị ndị jupụtara ná nsogbu.+   Mgbe m dinara ala, ekwuru m, sị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’+ Mgbe chi jiri, obi anaghị ezu m ike ma ọlị ruo n’isi ụtụtụ.   Ikpuru+ na ọkpụrụkpụ ájá+ ekpuchiwo ahụ́ m; Akpụkpọ ahụ́ m akpọwo nkụ wee na-agbarisị.+   Ụbọchị ndụ m na-agabiga ọsọ ọsọ+ karịa osisi nke onye na-ekwe ákwà, Ọ na-agwụkwa n’enweghị olileanya.+   Cheta na ndụ m bụ ifufe;+ Na anya m agaghị ahụ ihe ọma ọzọ.   Anya onye na-ahụ m agakwaghị ahụ m; Ị ga-eji anya na-achọ m, ma agaghị m anọ ya.+   Ígwé ojii na-ekusa wee ghara ịdị; Otú ahụ ka onye na-agbada na Shiol na-agaghị agbagote.+ 10  Ọ gaghị alaghachi ọzọ n’ụlọ ya, Ebe obibi ya agakwaghị amata onye ọ bụ.+ 11  Mụ onwe m kwa agaghị emechi ọnụ m. M ga-ekwu okwu n’ihi ahụhụ m na-ata; M ga-ekwu okwu banyere nchegbu m n’ihi ihe na-ewute mkpụrụ obi m!+ 12  Àbụ m oké osimiri ka m̀ bụ nnukwu anụ mmiri, Nke na ị ga na-eche m nche?+ 13  Mgbe m sịrị, ‘Ihe ndina m ga-akasi m obi, Ihe ndina m ga-enyere m aka buru nchegbu m,’ 14  I jiriwo nrọ menye m ụjọ, I jiriwokwa ọhụụ mee ka m tụwa ụjọ, 15  Mkpụrụ obi m wee họrọ mpịgbu, Họrọkwa ọnwụ+ kama ịhụ ọkpụkpụ m ndị a. 16  Ajụwo m ya;+ agaghị m adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Hapụ m, n’ihi na ụbọchị ndụ m bụ ume e kupụrụ ekupụ.+ 17  Gịnị ka mmadụ efu bụ+ nke na ị na-azụlite ya, Na ị na-etinye obi gị n’ebe ọ nọ, 18  Na ị na-elekọta ya kwa ụtụtụ, Na-anwale ya n’oge ọ bụla?+ 19  Gịnị mere na ị gaghị ewepụ anya gị n’ebe m nọ,+ Ma ọ bụkwanụ hapụ m ka m loo ọnụ mmiri? 20  Ọ bụrụ na mụ emehiewo, olee ihe m ga-emeli gị, gị Onye na-ahụ ụmụ mmadụ?+ Gịnị mere i ji lekwasị m anya, m wee ghọọrọ gị ibu arọ? 21  Gịnịkwa mere na ị gaghị agbaghara njehie m,+ Legharakwa mmejọ m anya? N’ihi na ugbu a, m gaara edina n’ájá;+ Ị ga-achọkwa m, ma agaghị m anọ ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji