Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Job 6:1-30

6  Job wee zaa, sị:   A sị nnọọ na a tụrụ nsogbu+ m dum n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, A sịkwa nnọọ na a ga-atụkwasị ahụhụ m n’ihe e ji atụ̀ ihe n’otu mgbe!   N’ihi na ọ dị arọ karịa ájá dị n’oké osimiri. Ọ bụ ya mere okwu m ji bụrụ okwu nzuzu.+   N’ihi na akụ́ nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile dị n’ime m,+ Nke mmụọ m na-aṅụ nsí ya;+ Oké ụjọ nke si n’ebe Chineke nọ ji m.+   Ịnyịnya ọhịa+ ọ̀ ga-eti mkpu mgbe ọ na-ata ahịhịa, Ka ehi ọ̀ ga-eti mkpu mgbe ọ na-ata nri ya?   À ga-eri ihe na-enweghị ụtọ n’etinyeghị ya nnu, Ka mmiri na-alọ alọ nke ahịhịa mashmalo ò nwere ụtọ ọ bụla?   Mkpụrụ obi m ajụla imetụ ihe ọ bụla aka. Ha dị ka ọrịa n’ihe oriri m.   A sị nnọọ na ihe m na-arịọ ga-eme, A sịkwa nnọọ na Chineke ga-emezu olileanya m!   Nakwa na Chineke ga-aga n’ihu gwepịa m, Na ọ ga-ewepụta aka ya bipụ m!+ 10  Ọbụna nke ahụ gaara akasi m obi; M ga-amali elu n’ihi ọṅụ+ n’ihe mgbu m, Ọ bụ ezie na ọ gaghị enwe ọmịiko, n’ihi na ezochighị m ihe Onye Nsọ+ kwuru.+ 11  Olee ike m nwere, nke na m ga na-echere?+ Gịnịkwa ga-abụ njedebe m, nke na m ga-eme ka mkpụrụ obi m nọgide na-adị ndụ? 12  Ike m ọ̀ bụ ike nkume? Ka è ji ọla kọpa mee ahụ́ m? 13  Ọ̀ bụ na enweghị m ike inyere onwe m aka, Ka à napụwokwa m ike ịrụ ọrụ bara uru? 14  Onye ọ bụla nke jụrụ igosi mmadụ ibe ya obiọma,*+ Ya onwe ya agakwaghị atụ egwu Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ 15  Ụmụnne m aghọwo aghụghọ,+ dị ka ngele, Dị ka ngele ndị na-ata ata. 16  Mkpụrụ mmiri emeela ka ha na-eji oji, N’elu ha ka snoo na-ezo onwe ya. 17  Mgbe oge ruru, mmiri anaghị adịkwa na ha,+ ha adịkwaghị eme mkpọtụ; Mgbe okpomọkụ bịara, ha na-ata.+ 18  Ụzọ ha si asọfe gbagọrọ agbagọ; Ha na-asọba n’ọzara wee taa. 19  Ìgwè ndị njem nke Tima+ elewo anya ịhụ ha, Ìgwè ndị Siba,+ ndị nọ na-eme njem, echerewo ha. 20  Ihere na-eme ha n’ihi na ha nweburu nchekwube; Ha abịarutewo ebe ahụ ma ha ahụghị ihe ha tụrụ anya ya.+ 21  Otú ahụkwa, o nweghị ihe unu bụ;+ Unu hụrụ ihe dị egwu, egwu wee jide unu.+ 22  Ọ̀ bụ n’ihi na m sịrị, ‘Nyenụ m ihe, Ma ọ bụ, ka unu si n’ihe unu nwere nye onyinye n’ihi m; 23  Napụtanụ m n’aka onye iro,+ Napụtakwanụ m n’aka ndị na-achị n’aka ike’?+ 24  Zienụ m ihe, mụ onwe m ga-agbakwa nkịtị;+ Meekwanụ ka m ghọta ihe ọ bụla m mehieworo.+ 25  Okwu ziri ezi adịghị egbu mgbu!+ Ma olee isi mba unu na-abara m?+ 26  Ihe unu bu n’obi ime ọ̀ bụ ịtụchasị okwu, Ebe ihe onye dara mbà n’obi na-ekwu+ bụ naanị ifufe ka ọ na-agwa?+ 27  Lezienụ ka unu ga-esi fee nza ọbụna maka nwa na-enweghị nna,+ Jirikwa enyi unu gbanwere ihe!+ 28  Ngwa, geenụ m ntị, Leenụ ma m̀ ga-agha ụgha+ n’ihu unu. 29  Biko, chegharịanụ echiche—ka ajọ omume ọ bụla ghara ibilite— Ee, chegharịanụ echiche—ezi omume m ka dịkwa.+ 30  Ajọ omume ọ̀ dị n’ire m, Ka ọ̀ bụ na adịghị m amata ihe bụ́ ahụhụ?

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Job 6:14*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”